Ndị omekome awakpola ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ebonyi, gbuo mmadụ atọ

Mmadụ atọ anwụọla, ebe mmadụ abụọ merụrụ ahụ mgbe ndị omekome wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii Unueke, dị n'okpuruọchịchị Ezza Nọtụ n'Ebonyi steeti.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. A nwuchiela ndị gbara oringo maka ịda iwu coronavirus na Legọs

    Ndị dara iwu coronavirus

    Ebe foto si, LAS Police

    Ndị uweojii Legọs Steetị anwuchiela mmadụ iri asaa na otu ebe ha na-agba oringi n'ụlọ ọrịngi maka ịda iwu na-achị coronavirus.

    Uweojii sị na a nwuchiri ndị a n'ọtụtụ ụlọ oringo dị na Lekki nakwa Surulere nke Legọs ma sị na a ga-akpọpụ ha n'ụlọikpe.

    Ọnụ na-ekwuru uweojii na Legọs bụ Olumuyiwa Adejobi gwara BBC na ndị a dara iwu ọgbakọ igwe mmadụ, mmepe ụlọ oringo nakwa iwu onye apụla n'ezi n'ime abalị nke gọọmentị tinyere na steetị ahụ.

    Ndị dara iwu na-achị coronavirus

    Ebe foto si, LAS Police

    Ha gara n'ihu kwuo na ha ga-agbasi mbọ ike na anwuchi ọtụtụ ndị na-ada iwu na-achị coronavirus.

    Nke a na-abịa dịka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a na-arị elu na Naịjirịa ugbua.

    N'ụbọchị Mọnde, mmadụ otu puku na narị abụọ na anọ butere coronavirus bụ ọnụọgụgụ kachasị n'otu ụbọchị kamgbe ọrịa a malitere.

  2. Nkeji Coronavirus

    Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa.

  3. Nkeji BBC Igbo

    Gere akụkọ ihe ndị mere n'ụwa a chịkọtara n'otu nkeji.

  4. Anyị ebulighị ọnụ ọkụ latrik- NERC

    Ngalaba na-ahụ maka ịhazi ọkụ latrik na Naijiria bụ 'Nigerian Electricity Regulatory Commission'( NERC) na Bekee aghọọla na o nweghị mgbe ha ji welie ọnụ ahịa ndị mmadọụ na-akwụ maka ọkụ latik.

    Agụgọ ha na-abịa dịka ụfọdụ ụlọntakụkọ kwuru na ụlọrụ na-enye ọkụ latrik chọrọ iji pasent 50 bulie ọnụ ego a na-akwụ maka ọkụ latrik.

    Mana Nerc kwetara na ha buliri ego a na-akwụ maka otu kiowat ọkụ kwa awa site na Naira abụọ gaa naira anọ nke pụtara iji pasent 100 were bulie ihe a na-akwụbu.

    Nerc kwuru na mbuli ahụ bụ n'ihi ọnụahịa(inflation) nakwa ego ole a na-azụ naira gbaliri.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2

    End of X post, 2

    Skip X post, 3

    End of X post, 3

  5. Boris Johnson amachiela ngagharị n'Ingland

    Onyeisiala mba Briten bụ Boris Johnson nọrọ n'ozi ọ gbasara nye ụmụ afọ ala ahụ na onye ọbụla ga-anọ n'ụlọ ruo etiti ọnwa Febụwarị dịka mba ahụ malitere mkpochi obodo ọhụrụ n'ihi coronavirus..

    Johnson kwuru na ọ bụ naanị ndị e nyere ikike nwere ike ịpụtu ama.

    Ụlọakwụkwọ niile nakwa koleji ga-emechi malite taa bụ Tuzde dịka gọọmenti na-agba mbọ ibelata ọnụọgụgụ ndị bu coronavirus na ndị ahụ adịghị nọ n'ụlọọgwụ.

    Boris Johnson

    Ebe foto si, Getty Images

  6. Peter Okoye ebutela coronavirus

    Paul Okoye

    Ebe foto si, Paul Okoye/Instagram

    Otu n'ime ndị ejima P-square na-eti egwu bụ Paul Okoye ebutela ọrịa coronavirus.

    Pau onye a ma dịka KingRudy bụ ya iji aka ya gba ama nke a n'a soshal midia dịka o kwuru na ya n'ihe na-eme, ma dọọkwa ndị mmadụ aka na ntị ka ha mụụ anya ka azụ.

    Oge BBC Igbo kpọrọ ya ka anyị na ya kelee, o kwuru na ya ya agaghị emeli ya.

    Cheta na nwanne ya bụ Peter buteburu ọrịa coronavirus na agba nke mbụ ya n'afọ 2020.

  7. NERC enyela ikike ka ebulie ụgwọ ọkụ latrik

    Igwe ọkụ latrik

    Ebe foto si, Getty Images

    Ngalaba na-elekọta ọkụ latrik na Naịjirịa enyela ikike ka etinyeso ego n'ụgwọ ọkụ latrik na Naịjirịa.

    Ha kwuru na ha nyochara ụfọdụ ihe tupu ha emee mkpebi itinyeso ya bụ ego.

    Ha kọwakwara na ọnụ mmanụ agbịdị nakwa ọnụ dọlla n'ada n'ahịa so n'ihe mere ka ya bụ ụgwọ rịa elu

  8. Akụkọ ndị dị mkpa n'ehihie a

  9. Ọkara ndị butere ọrịa covid-19 n'ụbọchị Monde si na Legọs

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Mmadụ otu puku na narị abụọ na anọ ọhụrụ ka a chọtara ọrịa coronavirus n'ahụ ha na Naijiria, dịka ngalaba NCDC na-ahụ maka mgbochi ọrịa si kwuo.

    Mmadụ narị isii na iri ise na anọ n'ime ha si Legọs, ebe narị abụọ si Abuja.

    N'otu aka ahụ, gọọmentị Legọs steeti enyela iwu ka ụlọakwụkwọ niile dị na steeti ahụ mepee site n'ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Jenụwarị a.

    Kọmishọna agụmakwụkwọ steeti ahụ bụ Folashade Adefisayo kwuputere nke a dịkaọ na-ekwu na ụlọakwụkwọ ndị a ga-esorịrị usoro mgbochi covid-19 niile gọọmentị wepụtara.

    Cheta na gọọmentị ahụ kwuburu na ndị ọrụ niile ga-enweike ịmalite ọrụ n'ụbọchị iri na asatọ n'ọnwa a kwa.