Twitter, Facebook na Instagram egbochiela Trump ịgbasa ozi n'akara ya
N'ihe atụghị anya, ụlọ ọrụ soshal midia atọ bụ Twitter, Facebook na Instagram agbachiela akara Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump dịka ha sị na oji ya agba ozi na-ebute ọgbaghara.
Ọ bụ Twitter bu zọ gbachie akara Trump's n'ụbọchị Wenesde dịka ha mere ka a gharịikenwu ozi atọ o dere.
Ka o mere awa ole ma ol, Facebook gbachiri akara Trump ruo awa 24.
Twitter sị na akara @realDonaldTrump ga-anọ na mgbachi ma sịkwa na a ga-ewepụ ihe a Trump dere butere ya bụ mmachi.
Ha sịkwa na mmachi ahụ ga-anọ ruo awa 12.
Ha sịkwa na ya bụrụ na Trump gara n'ihu dewe ụdịrị ihe a ọ na-ede ha nwere ike chụpụ ya kpam kkpam.
Facebook n'onwe ha sịrrị na Trump enweghi ike ide ihe ọbụla n'oge ahụ akara nọ na mmachị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Dịka nke a na-eme, onye omeiwu Joe Manchin sị na ekwesiri ịmachị Trump ruo abalị 14.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Adam Mosseri, bụ onyeisis Instagram dekwara na Twitter na ha amachiela akara Trump ruo awa 24.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3