Ndị omekome awakpola ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ebonyi, gbuo mmadụ atọ

Mmadụ atọ anwụọla, ebe mmadụ abụọ merụrụ ahụ mgbe ndị omekome wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii Unueke, dị n'okpuruọchịchị Ezza Nọtụ n'Ebonyi steeti.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. Twitter, Facebook na Instagram egbochiela Trump ịgbasa ozi n'akara ya

    N'ihe atụghị anya, ụlọ ọrụ soshal midia atọ bụ Twitter, Facebook na Instagram agbachiela akara Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump dịka ha sị na oji ya agba ozi na-ebute ọgbaghara.

    Ọ bụ Twitter bu zọ gbachie akara Trump's n'ụbọchị Wenesde dịka ha mere ka a gharịikenwu ozi atọ o dere.

    Ka o mere awa ole ma ol, Facebook gbachiri akara Trump ruo awa 24.

    Twitter sị na akara @realDonaldTrump ga-anọ na mgbachi ma sịkwa na a ga-ewepụ ihe a Trump dere butere ya bụ mmachi.

    Ha sịkwa na mmachi ahụ ga-anọ ruo awa 12.

    Ha sịkwa na ya bụrụ na Trump gara n'ihu dewe ụdịrị ihe a ọ na-ede ha nwere ike chụpụ ya kpam kkpam.

    Facebook n'onwe ha sịrrị na Trump enweghi ike ide ihe ọbụla n'oge ahụ akara nọ na mmachị.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Dịka nke a na-eme, onye omeiwu Joe Manchin sị na ekwesiri ịmachị Trump ruo abalị 14.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Adam Mosseri, bụ onyeisis Instagram dekwara na Twitter na ha amachiela akara Trump ruo awa 24.

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

  2. WHO sị na ụdịrị covid-19 a hụrụ na Sawụt Afrịka anaghị anyị ọgwụ mgbochi nje ahụ

    Nnyocha coronavirus

    Ebe foto si, Getty Images

    Ngalaba Ahụike mba ụwa Bekee kpọrọ "World Health Organization" (WHO) sị na enweghi ihe ọbụla gosiri na nje covid-19 a hụru na Sawụt Afrịka bụ jke ọgwụ mgbochị anaghị egbochi.

    Maira Van Kerkhove bụ onye na-ahụ maka tecknụzu na WHO na onweghi ihe dị iche n'etu ụdị covid-19 a siri arịa mmadụ.

    Ọ sịkwa na ọ naghi egbu karịa nke a mabu maka ya, mana ọsịka na ọ na-efesa ndị mmadụ karịa.

    Ọ sị; "Anyị enweghị akaebe ọbụla na ọgwụ mgbochi a anaghi arụ ọrụ mgbochi nje a. Nke a bụ ozi ọma. Ihe a bụ ihe anyị ma ugbua, dịka nnyocha na-aga n'ihu."

  3. Naịjirịa enweela ọnụọgụgụ ndị kachasị bute coronavirus n'otu ụbọchị

    Ọnụọgụgụ nke ngalaba NCDC wepụtara na-egosi na Naịjirịa enweela ọnụọgụgụ kachasị bute ọrịa coronavirus n'otu ụbọchị.

    Nke a bụ nke a kachasị gụkọọ kemgbe ọrịa ahụ bu ụzọ bata n'ala ahụ n'ọnwa Febụwarị afọ 2020.

    Dịka ọ dị kemgbe, Legọs steeti bụ ebe ọ kachasị amụba ebe isi obodo Naịjirịa bụ Abuja bụ ebe ọzọ.

    Cheta na Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwoolu dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha debe iwu niile gbasara mgbochi ọrịa a dịka ịkwọ aka, ikpuchi ihu nakwa ịnye onwe gị efe n'ebe ndị ọzọ nọ.

    O rịọrọ ka e debe iwu ndị a iji mee ka aghara ịmechi obodo ma machie ngagharị ọzọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Mmadụ anọ anwụọla dịka ndị na-akwado Donald Trump wakporo Ụlọ Omeiwu Amerịka

    Capitol

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị uweojii na Washington DC sị na mmadụ anọ nwụrụ oge a na-wakpọ ụlọ omeiwu Capito di n'obodo ahụ.

    Ha si na gụnyere nwaanyị ndị uweojii gbara egbe, mmadụ atọ ọzọ nwụrụ n'ebe ahụ.

    Ka ọ ọkwụ ugbua, anwụchiela mmadụ 52 ebe ahụ - ha sị na mmadụ 47 n'ime ha bụ maka ịda iwu etinyere ka ndị mmadụ ghara ịgagharị site elekere isii nke ehihie ruo elekere isii nke ụtụtụ.

  5. Igbo deeme nu!

    Unu abọọla chi?

    Akụko dị ọkụ ka o si dị ọkụ ka anyị na-ewetara gị taa.

    Jisike soro anyị

  6. Ntuliaka ọkwa Onyeisi Ohaneze ga-adị dịka e si hiwe ya- Ohaneze

    Nnia Nwodo

    Otu Ohaneze Ndigbo ekwuola na ụlọikpe enyela ha ikike ịga n'ihu na ntuliaka maka ọkwa onyeisi otu ahụ ga-eme n'abalị iri nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021.

    Okwu a na-abịa dịka otu onye bụbụ odeakwụkwọ Ọhaneze bụ Uche Okwukwu gbara onyeisi otu ahụ bụ Nnia Nwodo akwụkwọ n'ụlọikpe dị n'Owere iji nata ikike ịkwụsị ya bụ ntuliaka.

    Onye ndụmọdụ mgbasaozi onyeisi Ohaneze bụ Emeka Attamah bụ onye gbara ama na mkparịtaụka yana BBC igbo nwere n'ekwentị rụtụrụ aka na Okwukwu bụ onye gbara ya bụ akwụkwọ bụ onye a chụrụ n'otu Ohaneze n'ihi agwa adịghị mma ọ kpara .

  7. Buhari ekelela Christian Chukwu dịka ọ gbara afọ 70

    Christian Chukwu

    Ebe foto si, NFF

    Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ezigarala onye bụbu onye nchịkọta otu egwu Boolu Rangers bụ Christian Chukwu ozi ekele dịka ọ gbara afọ iri asaa.

    Buhari si na ya na-esonyere ndị egwuregwu na-amasị na ndị enyi na ikwu na ibe anwụrịrị nwa afọ ahụ bụ kaptịn ndị egwu bọọlu Naijiria butere iko mmeri n'asọmpi Afrịcan Nations Cup n'afọ 1980.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  8. Nkeji Corona

    Akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa:

  9. Nkeji BBC Igbo

    Akụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla.

  10. Man United na Man City ga-achịpụ ya n'iko Carabao

    Man United na Man City

    Ebe foto si, Getty Images

    Manchester United na ogbo ha bụ Manchester City ga-ezute n’alaị Wenezde a, iji mata ndị ga-esonye Tottenham n’asọmpi egbe buru ọ laa nke iko Carabao.

    Cheta na Tottenham ji ọkpụ goolu abụọ merie Brentford n'abalị Tuzde.

    Oge otu abụọ a zutere onwe ha n'asọmpi a n'afọ gara aga, Man City meriri United, mana ka ọ dị ugbua ọtụtụ ndị Man City ka na-agbake n'ọrịa coronavirus.

  11. Electricity Tariff: Otu TUC agwala gọọmentị etiti ka ha kpachapụ anya

    Ọkụ Latrik

    Ebe foto si, AFP

    Otu Trade Union Congress adọọla gọọmentị etiti aka na ntị ka ha weghachi ọnụahịa ọkụ latrik etu ọ dịbu mbụ ma ọbụghị ya, ha ga-agba abụbụ ọrụ kpụ ọkụ n’ọnụ.

    Onyeisi otu a bụ Qadri Olaleye kwuru na mbuli ọnụahịa ọkụ latrik n’oge dị otu a gosiri na afọ tara gọọmentị etiti mmiri.

    Olaleye kwuru sị: "Aghụghọ nakwa umengwụ dị na gọọmentị a akarịka; ha emezubeghị kama otu mkpụrụ n'ime nkwa niile ha kwere."

    "Gịnị kpatara gọọmentị ga-eji gaa n'ihu itinye ego n'ọnụahịa ọkụ latrik, n'agbanyeghị na akpachabeghị maka nke mbụ ha tinyere?"

    "Nke a bụ iji gosi etu afọ si taa ha mmiri."

  12. Mourinho ọ ga-amabute iko mbụ ya na Tottenham?

    Jose Mourinho

    Ebe foto si, Getty Images

    Tottenham etozuola maka asọmpi nke egbe buru ọ laa nke iko Carabao, dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ merie Brentford n'abalị Tuzde.

    Nke a bụ nke mbụ Jose Mourinho na-eru n'agba nke ikpeazụ nke asọmpi ọbụla kamgbe o sonyere ndị Tottenham.

    Ọtụụ na-ekwu na Mourinho ga-ebuli iko Carabao nke afọ a, mana ọgaghị adịchara ya mfe.

    Tottenham ha ga-ezute Manchester United maọbụ Manchester City n’abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Eprel.

  13. Onye na-ere azụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, A na-eche na ọ bụ n'ahịa dị n'obodo Wuhan ka nje Covid malitere ịgbasa

    Mba Chaịna amachiela mmadụ abụọ ndị otu 'World Health Organisation' (WHO) ịbata n’obodo ha n’ihi enweghi ezigbo akwụkwọ Visa.

    Mmadụ abụọ ahụ bụ ndi e zigara ka ha nyochaa n’ezie ebe ọrịa coronavirus si malite.

    Cheta na a chọpụtara nje coronavirus na mba Chaịna ebe ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ n'ahịa ebe a na-ere anụ dị icheiche ka ya bụ nje si baa mmadụ n'ahụ, tupu ọ malite ifesa.

    Mana ọtụtụ ekwuola na nke a abụghị eziokwu.

    Ndị ọzọ na-ebo ebubo na ọ bụ n'ụlọ nnyocha 'lab' ka ndị sayensị kpacha anya wepụta nje ahụ.

    Nke a mere WHO ji kwuo na ha ga-eziga ndị nnyocha nke ha ka ha gaa mata ebe mmiri si baa n'opi ụgbọgụrụ.

    Mba Chaịna nyekwara nkwado ka ndị nnyocha WHO ahụ bịa, mana akụkọ na-ekwu na ọ bụ maka enweghị ezigbo akwụkwọ 'visa' ka e ji machie ha.

    Onyeisi WHO bụ Tedros Gebreyhesus kwuru na ọ gbara ya gharịị ihe kpatara e ji gbochie ndị ọrụ ya ịba Chaịna, mana o nwere olileanya na ihe niile ga-adị mma n'oge adịghị anya.

  14. Ọ bụ ndị 'politician' na-akpata enweghị nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ - Dave Umahi

    Dave Umahi

    Ebe foto si, Favebook/Dave Umahi

    Nkọwa foto, Dave Umahi

    Onyeisi ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ bụ Dave Umahi ekwuola na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọjọọ na-awụnyere ndị omekome aja n’ukwu ka ha na-ebute ọgbaaghara na enweghị nchekwa na Naịjirịa.

    Umahi kwuru nke a n’ọgbakọ ya na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ji ịntaneetị nwee n’ụbọchị Tuzde, ma dọọ ndị ọjọọ ahụ aka na ntị ka ha wepụ aka enwe n’ofe.

    O kwuru sị: "Anyị bụ ndị gọvanọ na-enwe mwute gbasara oke ogbugbu na ịtọrọ mmadụ nke ọ bụ ndị be anyị ji aka anyị eme, ma na-egbukwa ndị be anyị na ndị ọrụ nchekwa."

    "Ya bụ ihe akala njọ ugbua dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ọjọọ bịakwa tinye aka na ya."

    "Ndị ọjọọ a bụ ndị na-achọ ime ihe ọbụla iji nweta ọchịchị etinyerela ndị omekome aka iji weta ọgbaaghara na enweghị ezi nchekwa n'obodo anyị."

    Umahi nyere ọmụmaatụ maka otu nwoke onye ọchị ehi nka hapụrụ Ebonyi steeti laghachi obodo ya, mana ndị mmadụ wetara onyonyo nwoke ahụ na-ekwu na ọ bụ ndị Igbo chụpụrụ ya."

    O kwuru na ụdị ihe a nwere ike ime ka a malite ịwakpo ndị Igbo bi n'akụkụ Naịjirịa dị icheiche.

  15. Dr. Dre ekelela ndị zitere ya ozi ọma n'oge ọrịa ya

    Andre Romelle Young

    Ebe foto si, Reuters

    Onye nrụpụta egwu a ma ama bụ Andre Young maọbụ Dr. Dre ekeleela ndị niile ziteere ya ozi ọma mgbe ọ nọ n'ụlọọgwụ.

    Cheta na akụkọ kwuru na ọ gara ụlọogwụ dịka ndị dọkịta chọpụtara n'ọbara n'agba n'ime ụbụrụ ya.

    Dịka ọ dị ugbua, ọ gbakeela mana ha na-ekwu na achọrọ ịleta ya ọfụma tupu a hapụ ya.

    O kelekwara ndị ụlọọgwụ Cedar Sinai ebe ọ na-anata ọgwụgwọ

    Skip Instagram post
    Hapụ Instagram ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of Instagram post

  16. Mmadụ 1,354 ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa

    Ọnụọgụgụ Coronavirus

    Ebe foto si, NCDC

    Ọnụọgụgụ ndị a chọpụtara nje coronavirus n'ahụ ha na Naịjirịa n'ụbọchị Tuzde bụ otu puku, narị atọ na iri ise na anọ.

    Nke a bụ dịka ngalaba 'National Centre for Disease Control' si gụpụta.

    Na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, Enugu nwere mmadụ iri abụọ (20), Ebonyi nwere iri na atọ (13), ebe Anambra nwere mmadụ itoolu.

    Lee ya bụ okwe si gbaa:

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  17. Ị bọọla chi?

    Anyị ji n'aka na unu pụtara ụtụtụ a ọfụma.

    Soro anyị maka akụkọ ndị dị mkpa si n'ogbe unu apụta.

  18. Unu emeela n'isonyere anyị

    Ka ọ dị zie nụ echi.

  19. Ozu ndị coronavirus gburu ejupụtala n'ụlọ ozu na Saut Afrika

    Ụlọ ozu ndị dị na mba Saụt Afrịka ejuwala n’ihi ozu ndị nwụrụ n' ọrịa coronavirus a na-ebubata. Onyeisi otu jikọtara ndị na-eli ozu na mba ahụ bụ Muzi Hlengwa sị na ha ahụtụbeghi ụdị nke a na mbụ.

  20. Ụlọikpe ejichiela Sowore n'ụlọmkpọrọ Kuje

    Omoyele Sowore

    Ebe foto si, Omoyele Sowore/Twitter

    Ụlọikpe Majie nọ n'Abuja enyela iwu ka e jichie Omoleye Sowore, onye nwe ụlọntakụkọ Sahara Reporters n'ụlọmkpọrọ Kuje Prison taa dịka a kpụpụtara ya n'ụlọikpe.

    Ndị uweojii nwụchiri Sowore n'abalị 31 nke ọnwa Disemba afọ 2020.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post