Unu asaala chi?
Taa bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Jenụwarị, anyị na-ewetere unu akụkọ si ụwa niile.
Yagazie.
Mmadụ atọ anwụọla, ebe mmadụ abụọ merụrụ ahụ mgbe ndị omekome wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii Unueke, dị n'okpuruọchịchị Ezza Nọtụ n'Ebonyi steeti.
Chioma Obianinwa
Taa bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Jenụwarị, anyị na-ewetere unu akụkọ si ụwa niile.
Yagazie.

Ebe foto si, AFP
Gọọmentị mba Congo atọhapụla mmadụ iri abụọ na anọ bụ ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi ebubo na aka ha dị n’ogbugbu aka chịburu mba ahụ bụ Laurent Kabila n’afọ 2001.
Ụfọdụ mmadụ na-atamu ntamu maka nke a, mana Onyeisiala Congo bụ Felix Tshisekedi kwuru na ya agbagharala ha.
N'aka nke ọzọ ọtụtụ ṅụrịrị ọṅụ dịka ndị ahụ si n'ụlọ mkpọrọ pụta n'ụbọchị Fraịde. Otu n'ime ha bụ Eddy Kapend, onye ji ọkwa onye isi ndịagha n'oge Laurent Kabila na-achị.
Kapend so na ndị e boro ebubo igbu Kabila mana o kwuru na aka ya dị ọcha.
Mmadụ iri atọ na ise ka e tinyere na mkpọrọ n'ihi ogbugbu Onyeisiala Laurent Kabila, mana mmadụ iri na otu nwụrụ na mkpọrọ ebe iri abụọ na anọ ndị ọzọ ka a tọhapụrụ.

Ebe foto si, Getty Images
Mba Briten amachiela mba Afrịka dị iri na otu ka ha ghara ịbata obodo ha site ugbua ruo izuụka.
N'ozị ha wepụtara na websaịt ha, gọọmentị ha kwuru na ha mere mkpebi a iji gbochie mfesasị ọrịa coronavirus nke ọgbara ọhụrụ si mba Saụt Afrịka pụta.
Naịjirịa esoghi na mba ndị a machiri maka na ọ bụ mba ndị nọ na mpaghara Ndịda nke Afrịka nke gụnyere; Namibia, Zimbabwe, Botswana, Eswatini, Zambia, Malawi, Lesotho, Mozambique na Angola, tinyekwara Seychelles na Mauritius.
Mba Briten sị na ihe akaebe gosiri na ọ dị mkpa ịkwụsị ụdị njem isi mba ndị a ma kwuo na a ga-amachi ndị si maọbụ fefere mba ndị a ịbata Ịngland kamgbe ụbọchị iri gara.

Ebe foto si, NUC
Ngalaba na-elekọta ụlọakwụkwọ Mahadum na Naịjirịa bụ ‘National Universities Commission’ enyela ikike ka amalite nkuzi na ọmụmụ akwụkwọ na mahadum niile na Naịjirịa n’ụbọchị Mọnde, abalị iri na asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021.
Cheta na mahadum niile dị na Naịjirịa mechiburu emechi kamgbe ọnwa Maachị afọ 2020 n’ihi ọrịa coronavirus nakwa abụbụọrụ ndị nkuzi mahadum.
Osote onyeisi NUC bụ Chris Maiyaki nyere ntuziaka a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Fraịde n'aha onyeisi ngalaba ahụ bụ Ọkammụta Abubakar Rasheed.
Mana ndịọrụ mahadu nọ n'ọkwa nke iri na abụọ (Grade Level 12) ga-esi n'ụlọ na-arụ ọrụ nke ha dịka gọọmentị etiti si nye ntuziaka.
Maiyaki dọrọ ndị isi mahadum niile aka na ntị ka ha hụ na a na-edowe iwu niile e tinyere iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus.
O kwukwara na ngwangwa akwụkwọ malitere, onweghị ihe ga-eme ka mahadum ọbụla chabie usoro agụmakwụkwọ nke NUC kwadoro nke a kpọrọ 'Benchmark Minimum Academic Standards' na bekee.

Ebe foto si, Bayo Omoboriowo
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na Osote ya bụ Yemi Osinbajo ga-eso na ndị izizi agbara ọgwụ mgbochi covid-19 na Naịjirịa
Ọ bụ onyeisi ngalaba Nigeria Primary Health Care Development Authority bụ Faisal Shuaib sị na ọ bụ ọgwụ mgbochi nke Pfizer BioNTech ga ha ga-anata
A na-ele anya na ọ bụ na ngwụcha ọna Jenụwarị ka ọgwụ mgbochi a ga-abata Naịjirịa.
Ọ bọ ọgwụ 100,000 ga-ebu ụzọ bata.
Otu gọọmentị hibere ibuso covid-19 agha ekwuola na ọ bụ ndị ọrụ ahụike ka a ga-ebuzo gbaa ọgwụ a.
A na-ele anya na ịgba Onyeisiala Buhari na Osote ya ọgwụ ka enye aka belata ndị mmadụ ịtụ ịnata ya ụjọọ.
MAAZỊ Shuaib si na ngalaba na-ahụ maka ọgwụ na nri bụ nke Bekee kpọrọ "National Agency for Food and Drug Administration" (NAFDAC) enyochaala ọgwụ mgbochi a ma sị na ọ bụ ihe tozuru iji ruọ ọrụ eji rụpụta ya.
Ntuliaka nke otu Ohanaeze Ndigbo na-akwado ịme n'Owerre n'ụbọchị ụka ebutela ọtụtụ esemokwu na ọgbaghara.
Nke mbụ bụ na onyeisioche otu Ohanaeze Ndịgbo General Assembly bụ Basil Onyeacholam kwuru na ọ ga-eji ndị uweojii nwụchi onye ọbụla pụtara ịzọ ọkwa na steeti ọbụla ha nọ .
Nkọwa ya bụ na ịzọ ọkwa ọchịchị otu ahụ dara iwu n'ihi na ọ bụ naanị otu ya bụ otu a ma ama na-anọchị anya ndị Igbo.
O kwukwara na oge eruola ndị okenye dịka Ọkankuzi George Obiozor ga-eji zuo ike ma nye efe ka ndị ntorobịa bịa were oche ọchịchị.
N'otu aka ahụ, Ikedi Ohakim chịburu Imo steeti na-ekwu na ọ ga-akpụpụ Uche Okwukwu ụlọikpe maọbụrụ na o megidee iwu nke ụlọikpe tinyere maka ya ịhibe ntuliaka nke aka ịche n'ebe nke Ohanaeze ndigbo dị.

Ebe foto si, Reuters
Ichutu n'ọkwa bụ ihe zutere Onyeisiala Donald Trump nke Amerịka dịka ndị otu ya wakporo ụlọ Capitol dị n'obodo Washington dịka a na-ebinye aka na mmiri Joe Biden meriri ya.
Ọgbaghara dara na mwakpo ahụ butere ọnwụ mmadụ anọ gụnyere otu nwaanyị ndi ọrụ nchekwa gbara egbe.
Akụkọ sịkwa na otu onye uweojii nwụrụ mana ndị uweojii sịrị na ọ bụghị eziokwu. Ha sịkwa na otu onye otu ha merụrụ ahu nọ n'ọnọdụ ọnwu na ndụ.
Onyeisi ndị Omeiwu Nta bụ Nancy Pelosi na onyeisi ndị Demokrat na Sinet bụ Chuck Schumer akpọọla oku ka Osote Onyeisiala Mike Pence jiri ikike o nwere n'iwu Amerịka wepu Trump n'ọkwa.
Atụmatụ iwu Amerịka a kpọrọ mgbanwe nke 25 nyere ndị na-arụrụ onyeisiala mba ahu ọrụ iwepu ya ma ya bụrụ na ọ gaghị arunwu ọrụ ya ka o siri kwesi.
Mana otu onye ndụmọdụ Pence siri na ọ gaghị eme etu ahụ makana ọ nabataghi ya.
Nnọọnụ na peeji anyị taa.
Unu a ma na ọrịa coronavirus amalitela ịkpa mkpa mkpa ọzọ?
Biko debenu iwu gọọmentị hibere maka mgbochi mfesa ọrịa a.

Ebe foto si, Getty Image
Ụlọọrụ Facebook anapụla onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ohere iji ọbaozi ahụ agbasa ozi ụbọchị Tọzde.
Onyeisi Facebook bụ Mark Zuckerberg kwuru na ọ ga-eney nnukwu nsogbu ịhapụ Trump ka ọ ga n'ihu nwere akọrọngwa ha eme ihe masịri ya rue oge e nyefechara ọcịchị n'aka onye ọzọ.
Facebook napụrụ ya ikike iji Facebook maọbụ Instagram gbasaa ozi.
Twitter nọburu n'ụbọchị Wenezde napụ Trump ikike iji Twitter mee ihe ọbụla dịka ndị na-akwado Trumop wakporo ụlọomeiwu Ukwu mba Amerịka ikpossa ntuliaka iji binye aka n'onye meriri na ntuliaka onyeisiala ha mere n'ọnwa Novemba afọ 2020.

Ebe foto si, Getty Images
Ide ego aha ya bụ Elon Musk abụrụla ọgaranya kacha ibe ya n'ụwa niile.
A na-eche na ego Elon Musk nwere ugbua agafeela ijeri dọla otu narị na iri asatọ na ise.
Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ ụgbọala Tesla, nke Elon Musk bụ onye nwe ya, tinyere nnukwu ego n'ọgbọ ahịa 'stock exchange nke mba Amerịka n'ụbọchị Tọzde.

Ebe foto si, Twitter
Musk kụchapụrụ Jeff Bezos onye nwe ụlọọrụ Amazon iji rigoro n'ọkwa nke mbụ
Jef Bezos anọọla n'ọkwa onye nke mbụ kamgbe afọ 2017.
Tesla, bụ ụlọọrụ na-arụpụta ụgbọala na-eji ọkụ latrik arụ ọrụ, agbaliela nke ukwu n'ime afọ 2029 na 2020 nke mere na ọnụahịa ya akarịala ọnụ ahị ụlọọrụ ụgbọala ndị ọzọ dịka Toyota, Volkswagen, Hyundai, GM na Ford ma e tikọta ha ọnụ.

Ebe foto si, AFP
Gọọmentị Etiti enyela ikike ka eweghachị ọnụahịa latrik etu ọ dịbụ mbụ ruo ngwụcha ọnwa Jenụwarị afọ 2021.
Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ latrik bụ Saleh Maman kwuru na nke a bụ iji nye ohere maka mkparịtaụka nke na-aga n’ihu ugbua n’etiti gọọmentị na ndị ọrụ.
Maman kọwakwara na ọ bụchaghị eziokwu na gọọmenti ji pasenti iri ise bulie ọnụego ọkụ latrik.
O kwuru sị: "Nke bụ eziokwu bụ na gọọmentị na-akwụ ọkara ụgwọ ọkụ latrik maka ndị nọ n'otu E na D, nakwa ndị ogbenye na ndị ihe na-esiri ike."
"Ndị dị otu a enweghị mgbanwe ọbụla n'ụgwọ ọkụ ha na-akwụ kamgbe ụwa."
"Gọọmentị wepụkwara obere ego n'ụgwọ ọkụ ndị nọ n'otu A, B na C n'ọnwa Ọkụtoba afọ 2020."
"Ihe ndị a bụ iji mee ka ihe isi ike nke ọrịa coronavirus kpatara belatatụ n'ahụ ndị mmadụ."
Maman gara n'ihu kwuo na mkparịtaụka ka na-aga n'ihu n'etiti gọọmentị na ndị ọrụ iji hụ etu a ga-esi mee ka ọ dabara ma ndị mmadụ nkịtị ma ụlọọrụ ndị na-emepụta ọkụ latrik.

Ndị ọchịchị mba Kenya achụọla ndị Dọkịta ruru narị ise na iri na anọ n’ọrụ dịka ha siri ọnwụ n’abụbụọrụ ha gbara.
Iwe ndị dọkịta a bụ maka ntakịrị ụgwọọnwa a na-akwụ ha, ya na enweghị ezigbo akụrụngwa nchekwa onwe maka coronavirus.
Ndị dọkịta iri asatọ na isii ka a chụrụ n'ọrụ na mpaghara Mombasa n'ụbọchị Wenezde.
Ndị dọkịta ahụ na-ekwu na ha agaghị alaghachi n'ọrụ ma ọ bụrụ na gọọmentị enyeghị ha ezi akụrụngwa iji chekwaa onwa ha.
Ọtụtụ ndị dọkịta na ndịọrụ ahụike ndị ọzọ anwụọla n'ihi ọrịa coronavirus na mba Kenya.

Ebe foto si, Atiku Abubakar
Osote onyeisiala Naịjirịa n’oge gara aga bụ Atiku Abubakar agbaala ọgwụ mgbochi coronavirus.
Ọnụ na-ekwuru Atiku bụ Paul Ibe gwara BBC na ọ bụ n’obodo Dubai ka ọ gbara ya bụ ọgwụ n’ụbọchị Wenezde.
Ọ kpọkwara oku ka ndị mmadụ ghara ịtụ egwu ịgba ya bụ ọgwụmgbochi.
Ụgbọala bu mmanụ ụgbọala gbara asọgharịala nnwuru ọkụ na Toyota dị nso n' Oshodi, Legọs n'ụbọchị Tọzde.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mana ka ọ dị ugbua, ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ emenyụọla ya bụ ọkụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, Reuters
Ndị ndu mbaụwa akatọọla nwakpo ndị na-akwado Onyeisiala Trump wakporo Ụlọomeiwmu mba Amerịca kposa ntuliaka a na-eme iji binye aka n'akwụkwọ na ọ bụ Joe Biden bụ onye meriri na ntuliaka onyeisiala mba ahụ.
Praim Minista mba Briten bụ Boris Johnson kwurụ na ọ bụ "ihe ihere bụ ihe mere n'Ụlọomeiwu Ukwu mba Amerịka. Mba Amerịka bụ ala a ma maka ọchịchị onyekwuoucheya n'ụwa niile. Ọ dị mkpa ugbua na e nwere nnyefe ọhịchị n'udo."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'ozi ọgbasara, Emmanuel Macron kwuru na ihe ndị ahụ ji tigbuo-zogbuo banye ụlọomeiwu mba Amerịka mere bụ ịgba nkwenye "otu onye, otu vootu" mgba okpuru.
Macron gara n'ihu kwuo sị,"Ihe mere taa na Washington abụghị agwa Amerịka. Anyị kwenyere n'ike Amerịka. Anyị kwenyere n'ọchịchị onyekwuouche ya Amerịka."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
N'otu aka ahụ, onyeisiala Mba Jamani bụ Angela Merkel kwuru na ihe onyonyo na foto "m hụrụ maka ihe mere gbasuru m iwe ma mekwa ka obi gbaa m njọ."
O kwuru na ọ dị mwute na kemgbe ọnwa Novemba na Donald Trump ekwetabeghị na e meriri ya na ntuliaka.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ọgbaghara dara n'Ụlọ Omeiwu na mba Ghana dịka ha na-eme ntuliaka iji họpụta onye ga-achi ha.
Ọ bụ Onye Ọmeiwu Carlos Ahenkorah buru akwụkwọ vootu gba ọsọ dịka onye patị ọzọ meriri.
Ọ bụ onye patị na-anọghi na ọchịchị bụ National Democratic Congress (NDC) bụ Alban Bagbin meriri ntuliaka ahụ ji bụrụ onyeisi ndị omeiwu mba Gana.
Maazị Ahenkorah bụ onye otu pati New Patriotic Party (NPP).
Aaron Mike Oquaye bu onye zọrọ oche ahụ n'okpuru pati NPP ma daa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ngalaba na-ahụ maka nchekwa okporo ụzọ na Legọs steeti bụ nke Bekee kpọrọ Lagos State Transport Management Authority (Lastma) si na otu gwọmgwọrọ bu mmanụ agbịdị na-agba ọkụ na mpaghara Apakun ugbua.
Ha sị na ha gbachiela ụzọ ahụ ma sị ka ndị mmadụ si ụzọ ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Twitter amachiela Trump isi ozi n'akara ya.
Ọ bụ onye ọrụ ya Dan Scavino neyere ya aka dee ozi a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ n'ụbọchị Wenzde ka ọgbaghara dapụtara n'ụlọomeiwu Capitola dị na Washington dịka ndị omeiwu gbakọrọ ịkpebi onye meriri ntuliaka afọ 2020 nke mba Amerịka.
Ọgbaghara ahụ taara isi mmadụ anọ ebe ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ.
Ka ọ ọkwụ ugbua, anwụchiela mmadụ 52 ebe ahụ - ha sị na mmadụ 47 n'ime ha bụ maka ịda iwu etinyere ka ndị mmadụ ghara ịgagharị site elekere isii nke ehihie ruo elekere isii nke ụtụtụ.
Ndị mmadụ ekwuola na ọ bụ ihe ịtụ anya ebe onye ga-abụ onyeisiala ọzọ bụ Joe Biden depụtara n'akara Twitter ya na omume ahụ abụghị ihe e ji mara ndị mba ahụ..
Lee ihe ndị Naịjirịa na-ekwu maka ihe a mere
Aisha Yesufu kwuru na ihe mmụta dị na ya bụ na ọchịchị kwuo uche ya bụ ihe ekwesiri ịchekwa iji kwụsị ọtụtụ mmadị imebi ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Onye ọzọ bụ Modele kwuru na Ihe ahụ mere bụ ihe o cheghi ga-eme.
O kwukwara na ọ bụrụ na ọ ma, ọ ga-anọ na Legọs karịa ịga n'obodo ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Anyị na-ele anya etu ndi omeiwu Amerịka siri eme mbinye aka na mpụtara ntuliaka ha mere n'afọ 2020 nke Joe Biden meriri.
Akụkọ ka na-abịa, ma lee etu o sio gaa n'ụbọchị Wenesde.
Ihe a bụ ihe onyonyo.