You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

George Obiozor so azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo daara n'ala n'ọgbakọ Imeobi

Otu n'ime mmadụ ise so azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ George Obiozor daarala n'aka n'oge ọgbakọ ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ndị omekome akụsaala nzukọ ndị Arewa na Kaduna

    Ndị omekome bụ ndị nrotoọbịa akụsasịala nzụkọ otu ndị ntoroọbịa nke Arewa nọ n'okpuru Coalition of Northern Group (CNG).

    Ndị omekome a batara ogige nzụkọ ndị Arewa n'ihe dịka elekere iri na otu nke ụtụtụ were chụpụ ndị ntoroọbịa Arewa na-eme nzụko.

    Ha napụrụ ndị a bịara nzụkọ a ọtụtụ ekwentị ha.

    Nzụkọ a bụ maka atụmatụ ha kpọro ,"Arewa Security Review".

    Onyeisi oche CNG bụ Balarabe Rufai kwuru sị, " Anyị kwenyere na ọ bụ ndị mmadu zitere ndị omekome a, obi adịghi anyị mma chaa chaa".

  2. Ndị ji ịntaneti ezu awakpoola ngalaba na-ahụ maka akunuba na azụmahịa na mba Amerịka

    Akụkọ na-ekwu na ndị ji intaneti ezu awakpoola ngalaba na-ahụ maka azụmahịa na nke na-ahụ maka akụnụba nke mba Amerịka.

    Mwakpo a nwereike inye gọọmentị mba ndị ọzọ ohere ịmata ihe na-eme n'ime obi gọọmentị mba Amerịka.

    Nke a mere ka a gwa ngalaba ọrụ gọọmentị niile ka ha gbajụọ iji ụloọrụ Solarwinds Orion n'intaneti ha n'ihi na ndị ji intaneti ezu ji ya kwara ngwa ọrụ.

    Ụlọọrụ na-echekwa gọọmentị Amerịka n'ihe gbasara intaneti bụ Fireeye ekwuola na ha chọpụtara nsogbu a dịka ezuru ngwa ọrụ ha ji echekwa ụlọọrụ gọọmentị izuụka gara aga.

    Fireeye kwuru na ọtụtụ gọọmentị na ụlọọrụ dị iche iche dị na Amerịka, Irop, 'Asia' na 'Middle East' adanyela n'aka ndị oji intaneti ezu..

    Ha kwuru na nzo ụkwụ a dịka nke mba ọzọ na-akwado.

  3. Ndị agha Naijiría agbaala ogige ndị tọọrọ ụmụakwụkwọ na Katsina steeti Okirikiri

    Akụkọ na-ekwu na ndi agha Naijirịa gbaala ogige ebe e chere ndị tọọrọ ụmụakwụkwọ na Katsina steeti gburugburu.

    Amabeghị ụmụakwụkwọ ole ndị a tọọrọ kama n'ime ụmụ akwụkwọ narị asatọ na-agụ akwụkwọ n'ụlo akwụkwọ ahụ, amaghị ebe ihe dịka ọkara n'ime ha nọ ugbua.

    Otu onye na-arụrụ onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ọrụ kwuru na a na-atụanya na ọ bụ ego ka ndị ntọọ a na-achọ.

    Gọọmentị Naijirịa kwuru na ọ bụ ndị omekome bụ ndị na-akpa mkpamkpa a.

  4. Unu asaala chi?

    Daalụ nu maka isonye anyị na njem nke taa dịka anyị ga-ewetere unu akụkọ si ụwa niile.

    Nnọọ nu.