Ndị omekome akụsaala nzukọ ndị Arewa na Kaduna
Ndị omekome bụ ndị nrotoọbịa akụsasịala nzụkọ otu ndị ntoroọbịa nke Arewa nọ n'okpuru Coalition of Northern Group (CNG).
Ndị omekome a batara ogige nzụkọ ndị Arewa n'ihe dịka elekere iri na otu nke ụtụtụ were chụpụ ndị ntoroọbịa Arewa na-eme nzụko.
Ha napụrụ ndị a bịara nzụkọ a ọtụtụ ekwentị ha.
Nzụkọ a bụ maka atụmatụ ha kpọro ,"Arewa Security Review".
Onyeisi oche CNG bụ Balarabe Rufai kwuru sị, " Anyị kwenyere na ọ bụ ndị mmadu zitere ndị omekome a, obi adịghi anyị mma chaa chaa".