Ụlọikpe mkpesa dị n’Abuja akagbuola mkpọrọ afọ asaa a tụrụ Olisa Metuh, bụbu ọnụ na-ekwuru ndị pati PDP, n’ọnwa Febrụwarị afọ a.
Ha kwuru na ọkaikpe kpeburu ikpe ahụ bụ Okon Abang lere anya n’ihu, nke Bekee kpọrọ Bias, wee maa Maa Metuh ikpe.
Cheta na ngalaba mgbochi nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpụpụrụ Olisa Metuh ụlọikpe n'ihi ebubo na o riri ego gọọmentị Naịjirịa ruru narị nde narịa anọ (N400 million).
Ndị ọkaikpe atọ lebara okwu a anya n'ụlọikpe mkpesa kwuru na ikpe a mara Olisa Metuh ezighi ezi.
Ha atọ kwetara ihe ọkaiwu na-anọchite Metuh kwuru na Okon Abang kpere ikpe ahụ ka a ga-asị na o nwere ihe na-esere ya na Metuh.
Ha kwuru sị: "Ọrụ dịịrị onye ọkaikpe bụ ikpe ikpe ziri ezi na-enweghị onyeọbụla ị ga-ekpelara."
"Ihe akaebe niile anyị hụrụ gosiri anyị na ọkaikpe kpeburu ikpe a, tinyere echiche nke onwe ya n'ime ya bụ ikpe."
"Ọ bụghị naanị ihe akaebe ọ hụrụ anya ka o ji kpebie ikpe, kama o tinyekwara ebumnuche nke aka ya."
"E kpekwara ikpe a n'eleghị anya n'ikike dịịrị onye ahụ a mara ikpe."
"Ọ ga-abụ ihe jọgburu onwe ya ma anyị gbachi nkịtị ka ikpe a guzo."
N'ihi nke a, ha nyekwara iwu ka a malite n'isi kpegharịa ikpe ahụ.
Etu ikpe Olisa Metuh si gaa
Ọ bụ n'ọnwa Febrụwarị afọ a ka e kpebiri ikpe ahụ, ebe ọkaikpe Okon Abang nọrọ kwuo na ikpe mara Metuh n'eziokwu, ma tụọ ya mkpọrọ afọ asaa.
Oge ikpe a na-aga n'ihu, Metu dara n'ọrịa ma rịọ ka ụlọikpe nye ikike ịga ala bekee ga leta ahụike ya anya, mana ọkaipe Okon Abang jụwara isi.
Ugboro ugboro ka Metuh dara n'ụlọikpe n'ihi ọrịa, ugboro ugboro ka e bu ya ebu n'elu akwa si n'ụlọọgwụ bịa ụlọikpe n'ihi na ọkaikpe nyere iwu na ọ ga-abịarịrị.
N'otu oge, Metu boro ebubo na ọkaikpe ahụ na-ele anya n'ihu iji megide ya, mana Okon Abang gọrọ agọ na nke ahụ abụghị eziokwu.
Gbasara ebubo nrụrụaka, Metuh kwuru na ego ahụ a na-ebo ya ebubo izu bụ onyeisiala oge ahụ bụ Goodluck Jonathan kwadoro ka e nye ya.
Ọ kọwara na onye nyere ya ego ahụ bụ Sambo Dasuki, onye ji ọkwa 'National Security Adviser' oge Jonathan nọ n'ọchịchị.
Metuh gara n'ihu kọwaa na ego ahụ bụ maka iji rụọ ọrụ mgbasa ozi oge Jonathan na-achụ nta vootu maka ọkwa onyeisiala e mere n'afọ 2015.
Mana Ọkaikpe Okon Abang kwenyere n'ihe ndị EFCC kwuru, nke bụ na Olisa Metuh kwesịrị ịmata na ego ahụ e nyere ya bụ ego enwetara site na nrụrụaka.
Chetakwa na Sambo Dasuki, onye nyere Olisa Metuh ya bụ ego, nọkwa n'ụlọikpe ugbua, ebe ndị EFCC na-ebo ya ebubo izu ego ruru ijeri dọla abụọ ($2 billion).
Ha kwuru na ego ahụ bụ ego gọọmentị wepụtara maka iji gote ngwa agha nke ndịagha Naịjirịa ga-eji buso ndị ekperima Boko Haram agha.