You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

George Obiozor so azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo daara n'ala n'ọgbakọ Imeobi

Otu n'ime mmadụ ise so azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ George Obiozor daarala n'aka n'oge ọgbakọ ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Covid-19: Gọvanọ Umahi mmachịela ọgbakọ ukwu ma mee iyi mkpuchi imi n'Ebonyi

    Dịka mkpa mkpa covid-19 malitere bụrụ okwu akpụ n'ọnụ ọzụ dịka mfesa ya na-abawanye, aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi ekwuola na ya amachiela ọgbakọ ma nyekwa iwu na onye ọbụla na steeti ahụ ga na iyiriri mkpuchi imi.

    Umahi sịkwa na ụka agaghị agafe awa abụọ ma sịkwa na a ga-enyocha mmadụ 450 n'ime okpuru ọchịchi ime obodo biile dị na steeti ahụ.

    Umahi kwuru ihe a niile dịka ọ na-enyefe gọọmentị Naịjirịa ụlọọgwụ nje gọọmentị Ebonyi rụrụ ọhụrụ n'ime Alex Ekwueme Federal Teaching Hospital dị n'Abakaliki.

  2. Ndị uweojii atọ na mmadụ ise ọzọ anwụọla na Katsina steeti

    Mmadụ asatọ gụnyere ndị uweojii atọ nwụrụ mgbe ndị na-ezu ohi wakporo ahịrị ụgbọala otu Emir na Katsina steeti n’ụbọchị Fraịde.

    Nke a na-abịa dịka o mere naanị otu izuụka kemgbe atọrọ ụmụakwụkwọ ruru narị anọ n’otu steeti ahụ kwa.

    Ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ndị ahụ malitere ịwụ ahịrị ụgbọala ahụ mgbọ nke mere na ndị nche eze ruru ise nwụrụ ebe ndị uweojii atọ nwụkwuru.

    Otu ụgbọala ahụ tụgharịrị dabanye n'ime mmiri dị nso n'ebe ahụ mgbe agbagburu onye na-anya ya.

    Ụgbọala ndị ahụ si Abuja aga Katsina mgbe mwakpo ahụ mere n'obodo Funtua.

  3. Mmadụ 806 ebuterela coronavirus na Naịjirịa ọzọ

    Dịka Naịjirịa na-ahụ mbanwanye covid-19, ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na ọ bụ mmadụ 806 ka ha hụrụ ya bụ nje n'ahụ ha n'ụbọchị 18 nke ọnwa Disemba.

    Mmadụ 287 butere ya na Legọs ebe mmadụ 255 butere ya n'Abuja.

    Ndị ọzọ bụ:

    • Kaduna-36
    • Akwa Ibom-29
    • Katsina-25
    • Rivers-25 Kwara-21
    • Bauchi-19 Kano-15 Ondo-14
    • Plateau-13 Yobe-12 Nasarawa-11
    • Ebonyi-9
    • Gombe-8
    • Abia-7 Delta-4
    • Imo-4
    • Osun-3
    • Anambra-2
    • Borno-2 Cross River-1
    • Edo-1
    • Ekiti-1
    • Jigawa-1
    • Ogun-1

    Ụfọdụ steeti amalitela itinye mmachị maka mbawanye a.

  4. Mba Amerịka enyela ikike gbatagbata maka ọgwụ mgbochi covid-19

    Ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ na mba Amerịka bụ FDA n'aha ịchafụ enyela ikike ngwangwa gbasara ibido ịnye ndị mmadụ ọgwụ mgbochi coronavirus na mba ahụ.

    Ha kwuru na nke a ga-amalite n'bọchị Monde bụ iri abụọ n'otu nke ọnwa Disemba ga-emetụta ndị mmadụ gafere afọ iri na asatọ na mba ahụ.

    Ọgwụ mgbochi bụ nke ụlọọrụ Moderna nakwa ngalaba ọrịa na-efe efe na mba ahụ jikọrọ aka rụpụta.

    Ikike gbatagbata a bịara dịka ọnụọgụgụ ndị ọrịa coronavirus na-efe nakwa ndị ọ na-egbu jisike arị elu na mba Amerịka.

  5. Unu abọọla chi?

    Anyị amalitela njem akụkọ anyị nke taa!

    Jisike sonye anyị maka akụkọ niile dị mkpa n'ogbe gị nakwa mbaụwa niile.

  6. Coronavirus Update: Goomentị Ebonyi enyefela ụlọ Nnyocha ọhụrụ n'aka Ụlọọgwụ Gọọmenti Etiti

    Gọọmenti Ebonyi steeti enyefela ụlọrụ nnyocha nje ha wuru ọhụrụ n'aka ụlọọgwụ " Alex Ekwueme Federal Teaching Hospital dị n' Abakaliki ụbọchị Fraide iji nye aka belata nkesa ọrịa Covid-19 na steeti ahụ.

    N'okwu ya n'emume inyefe ụlọ nnyocha ahụ, aka na-achị steeti ahụ Gọvanọ Dave Umahi dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ kee kwụcha ma na-agbaso ntuziaka maka mgbochi nkesa Ọrịa coronavirus.

    O nyere iwu mmachị ọgbakọ ọha, ma kwuo na na ụka agaghị na-agafe awa abụọ.

  7. Gọọmenti Legọs etinyekwala mmachi ụlọụka n'ihi ọrịa coronavirus

    Gọọmentị Legọs ewepụtela iwu dị icheiche iji gbochie mfesa coronavirus nke ugboro abụọ, bụ a kpọrọ 'second wave of infections' na Bekee.

    N'iwu ndị a, gọọmentị buturu ọnụọgụgụ ndị nwere ịgbakọ n'ime ụlọụka n'otu oge.

    Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu wepụtara iwu ndị a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Fraịde.

    Iwu ndị a gụnyere:

    • Ụlọ okpukperechi ọbụla ga-ahụ na onweghị ọgbakọ nọfere awa abụọ
    • Ndị niile ga-esonye n'ọgbakọ okpukperechi ọbụla ga-eyiriri mkpuchi imi tupu ha abanye
    • Onye ọbụla ga-enyeriri ibe ya efe ruru mita abụọ (2 metres)

    Iwu ndị ọzọ metụtara ndị ọrụ oyibo nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ha gụnyere:

    • Ndị ọrụ gọọmentị niile nọ n'ọkwa 'Grade Level 14' ga-esi n'ụlọ na-arụ ọrụ malite n'ụbọchị Mọnde, abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Disemba, ruo ụbọchị iri na anọ na-abịa abịa.
    • Ndị ọrụ gbatagbata na ndị na-arụ ọrụ ndị ọzọ dị mkpa esoghi n'iwu a
    • Amachiela ụlọ ịgba egwu (night Clubs) niile dị na Legọs steeti
    • Mmachi mkpagharị nke gọọmentị etiti tinyere malite n'elekere iri na abụọ nke etiti abalị ruo elekere anọ nke isi ụtụtụ ka dịkwa etu ọ dịbu
    • Onye ekpughi akwa mkpuchi imi agaghị abanye n'ụlọorụ maọbụ ụlọahịa ọbụla na Legọs steeti

    Iwu ndị a ga-adị ruo abalị iri na anọ ọzọ, tupu atulee ha ma mara ihe ọzọ a ga eme.

  8. Garba Shehu arịọla mgbaghara maka ozi asị o zipuru

    Garba Shehu, bụ ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari, arịọla mgbaghara maka ozi ụghao zipụrụ gbasara ụmụakwụkwọ ndị ekperima tọọrọ n'obodo Kankara, Katsina Steeti.

    Shehu kwuburu na ọ bụ naanị ụmụakwụkwọ iri ka ndị ntọ ahụ ji, mana nke bụ eziokwu bụ na ụmụakwụkwọ a tọọrọ karịrị narị atọ

    N'ehihie Fraịde ka Shehu dere n'akara Twitter ya sị: "Ana m arịọ mgbaghara maka ozi m zipuru nke kwuru na ọ bụ naanị ụmụ akwụkwọ iri ka ndị ntọ tọọrọ."

    Shehu kọwara na ọrụ mgbasaozi nwere ka ọ na-adị oge ụfọdụ nke nwere ike ime ka mmadụ kwuhie ọnụ.

    Cheta na ụmụakwụkwọ niile ahụ a tọọrọ n'ụbọchị Fraịde gara aga, enwerela onwe ha ugbua.

    A tọhapụrụ ha n'uhuruchi ụbọchị Tọzde, abalị iri na asaa nke ọnwa Disemba.

  9. NIN: Gọọmenti Etiti enyela Gọọmenti Etiti a kwụsị ịna N20

    Gọọmenti Etiti enyela ndị ụlọọrụ ekwentị iwu ka ha kwụsị ịna naira iri abụọ(N20) maka ilere akara NIN ozigbo ozigbo.

    Ọ bụ Mịnịịsta na-ahụ maka mgbasaozi n'elu igwe bụ Isah Pantami

  10. Mike Pence anatala ọgwụ mgbochi coronavius

    Osote Onyeisiala Amerịka bụ Mike Pence na Onyeisi Ndị Ọgwụgwọ na mba ahụ bụ Jerome Adams anatara ọgwụ mgbochi covid-19 na ụlọ ọgwụ Walter Reed dị na Waghington DC.

    Maazị Pence si: "amaghidịm oge agbara ya. Daalụ."

    Ọ sịkwa: "Mụ na Karen ji aṅụrị pụta ịnata ọgwụ mgbochi a enweghi ọghọm."

    Ọ sịkwa na "taa dị ebube" ma kpọọ ọgwụ mgbochi ahụ "ihe irubama".

  11. Ndị ọlụomeiwu ukwu na Kenya achụọla otu gọvanọ obodo ha ọsọ ụkwụ eruala

    Ndị ụlọomeiwu ukwu na Kenye esepụla Gọvano Nairobi bụ Mike Sonoko Mbuvi ara n'ọnụ dịka onye na-achị steeti ahụ.

    Ọ bụ ntuilaka ka ha jiri tupu ya bụ nwaamadị n'oche ya ụnyaahụ bụ Tọzde.

    Ndị ụlọomeiwu ukwu mara ya ikpe ileda iwu obodo ahụ anya, mpako, ọchịchị nchigbu nakwa arụ ndị ọzọ megide obodo.

    Ndị nnọchite anya mpaghara ya boro ya ebubo iji ego obodo kpọga ada ya nwaanyị obodo oyibo (New York) na afọ 2018 nakwa imebi ego obodo ekwesiri iji lekọta ụmụaka ndị be ha enweghị aka anya na Nairobi.

    Sonko amaara dịka onye mweyi e ji ọlaọcha na ọlaedo mara sị na ebubo ndị ahụ abụghị eziokwu chacha. Na nke ahụ bụ akaọrụ ndị osochi egbu ji mpụ na nruruaka hiwe isi bụ ndị na-alụsa ya ọgụ maka agha ya na-ebuso mpụ n'obodo.

    Mana ụgụrụ abụghịri nwaamadị ahụ mbụ oyi makana ndị ọrụ ụkọmkpọrọ mba ahụ na-ekwu na ọ si n'ụlọmkpọrọ waa n'afọ iri abụọ (20) gara aga bụ nke Sonko kwetere na ya mere.

    Disemba gara aga anwụchikwere ya maka nruruaka.

    A họpụtara Sonko dịka Gọvanọ Nairobi, dịka o merichara ntuliaka n'afọ 2017 n'ọkọlọtọ Jubilee pati.

  12. Ndị butere nje coronavirus akarịala otu puku na Naịjirịa ụnyaahụ bụ Tọzde

    Ọnụọgụ ndị butere nje coronavirus Naịjirịa achịrịala ọkụ ọzọ dịka o rugoro otu puku, otu narị na iri anọ na ise (1145) achọpụtara naanị ụnyaahụ.

    N'ime ọnụọgụ a Ebonyi chitara asaa (7), ebe Anambra steeti ji naanị otu onye.

    Nke a wetere ọnụọgụ ndị bu ya bụ nje na Naịjirịa puku iri asaa, narị abụọ na asaa (76,207).

    N'ime ndị a, mmadụ puku iri isii na asaa, otu narị na iri (67110) agbakeela laa be ha ebe isi otu puku na narị abụọ na otu (1201) nara na ya bụ ọrịa.

  13. Ka chi fo!

    Igbo tụrụ ilu sị na "ọ bịara ije nwe ụna"

    Anyị ga-ezute unu echi.

    Ka chi fo!

  14. Onyeisi pati PDP esorola mee ngagharịiwe maka ụmụakwụkwọ a tọọrọ na Katsina

    Onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' bụ Uche Secondus edurula ndị mmadụ mee ngagharịiwe n'Abuja iji gosi iwe maka ụmụakwụkwọ karịrị narị atọ ndị ekperima tọọrọ na Katsina steeti.

    Na ngagharịiwe a nke ha mere n'ụbọchị Tọzde, Secondus kwuru na gọọmentị etiti agbaala nnukwu ọnyụpa n'ichekwa ndụ na akụnụba ụmụ mmadụ.

    O kwuru sị: "Sọsọ otu ihe ka anyị chọrọ: 'Buhari, kpọlata ụmụaka anyị atọọrọ na Katsina."

    "Obi dị anyị mwute. Obi dị nne na nna ụmụaka ndị a nnukwu mwute."

    Otu Boko Haram ekwuola na ọ bụ ha tọọrọ ụmụakwụkwọ ahụ.

    N'ụbọchị Tọzde, ha wepụtara ihe onyonyo gosiri ụmụakwụkwọ ahụ ebe ha na-arịọ gọọmentị ka ha gbaa mbọ kppụta ha.

    N'ime onyonyo ahụ kwa, ụmụakwụkwọ ahụ rịọrọ gọọmentị ka ha mechie ụlọakwụkwọ niile ma hapụ naanị ebe a na-akụzi okpukperechi alakụba.

  15. Gọvanọ Plateau steeti ebutela coronavirus

    Akụkọ pụtara ugbua bụ na aka na-achị Plateau steeti bụ Simon Lalong ebutela ọrịa coronavirus.

    Nke a bịara dịka emere ya na ezinaụlọ ya niile nyocha mana ndị ọzọ ebuteghi ya.

    Onye mgbasaozi ya bụ Makut Macham kwuputere nke a n'ime ozi o ziputere n'ụbọchị Tọzde.

    Ugbua, ọ na-edopu onwe ya iche dịka ndị ọrụ enyemaka ya malitere ịme nyocha nke ha.

    Ọ ga-anọ na be ya anata ọgwụgwọ ma na-arụkwa ọrụ.

  16. Abike Dabiri-Erewa sị na anapụrụ ha akara Twitter ya jiri dee na atụghapụla ụmụakwụkwọ Kankara

    Onye na-ahụ maka ọdịmma ndị Naịjirịa nọ ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa ekwuola na ọbụghị ya dere na-atughapụla ụmụakwụkwọ '333' ndị ntọrị nwụchiri n'ime ụlọakwụkwọ Government Science School dị na Kankara.

    Dabiri-Erewa siri na ọ bu ndị ya amaghị napụrụ ya akara Twitter ha na nke Instagram ya.

    Nke a na-abịa dịka ụlọntaakukọ HumAngle wepụtere ihe onyonyo ha sị si n'aka Boko Haram gosiri ndị eche bụ ụmụakwụkwọ ahụ.

  17. Na Akpọtụ Ugbu A, Boko Haram ewepụtala ihe onyonyo ụmụakwụkwọha tọrọla na Kankara

    N'ihe onyonyo ụlọ ntaakụkọ HumAngle weputere na-egosi ndị eche na ha bụ ụmụakwụkwọ ndi omekome tọọrọ n'obodo Kankara dị na Katsina steeti.

    N'ihe onyonyo ahụ, ụmụaka ahụ na-arịọ ka gọọmentị wepu ndi agha na-achọ ha nakwa ụgbọelu eji na-achọ ha.

    Otu n'ime ha sị: "Biko o nu, kpọpụ nụ ndị agha na ụgbọelu unu jiri chọọ iji nyere anyị aka. Ha agaghị emenwu ihe ọbụla."

    Ya bụ nwata gakwara n'ihu kwuo na ahụ adịghị ọtụtụ n'ime ha.

    O ruola otu izuụka a tọọro ụmụakwụkwọ a ruru 300 na Government Science School dị na Kankara.

  18. Omah Lay na Tems alọghachila na Naịjirịa

    Ndị otiegwu Naịjirịa e ji eji na mba Yuganda bụ Stanley Omah Didia (Omah Lay), Temilade Openiyi (Tems), na Muyiwa Ayoniyi, awuchiela n'ọdọụgbọelu Murtala Mohammed dị na Legọs.

    Abike Dabiri-Erewa, onyeisi ngalaba gọọmentị na-elekọta ndị Naịjirịa bi n'ofesi, bụ onye kwuru nke a n'akara Twitter ya n'ehihie Tọzde.

    Cheta na ndị uweojii mba Yuganda nwụchiburu ha oge ha gara mmemme iti egwu na mba ahụ, n'ihi ebubo na ha dara iwu na-egbochi mfesa ọrịa coronavirus.

    A kpụpụrụ mmadụ atọ ahụ ụlọikpe na Yuganda ma tukpuo ha n'ụlọ mkpọrọ ndị uweojii.

    Mana gọọmentị Naịjirịa, site n'enyemaka ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ, gbara mbọ iji gbapụta ha.

  19. Paul Pogba nwereike ịlọhachi Juventus

    Paul Pogba nwereike ịlọhachịazi na Juventus.

    Anyị na-anụ na onye nnọchịte anya bụ Mino Raiola na ndị Juventus amalitela mkparịtaụka maka nlohachị ya bụ nwaadị gbara afọ iri abụọ na asaa hapụburu otu egwubọọlụ ahụ na 2016.

  20. Ndị FRSC ekwuola na onye ejighị NIN ya agaghị enwozi akwụkwọ ụgbọala ha

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi mberede okporo ụzọ bụ FRSC ekwuola na ha aghịghị ekwe ka onye enweghị akara NIN nwete njiri mara ọkwọụgbọla.

    Ọ bụ Bisi Kazeem bu Osote onyeisi ngalaba ahụ weputere ozi n'akara Twitter FRSC.