Covid-19: Gọvanọ Umahi mmachịela ọgbakọ ukwu ma mee iyi mkpuchi imi n'Ebonyi
Dịka mkpa mkpa covid-19 malitere bụrụ okwu akpụ n'ọnụ ọzụ dịka mfesa ya na-abawanye, aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi ekwuola na ya amachiela ọgbakọ ma nyekwa iwu na onye ọbụla na steeti ahụ ga na iyiriri mkpuchi imi.
Umahi sịkwa na ụka agaghị agafe awa abụọ ma sịkwa na a ga-enyocha mmadụ 450 n'ime okpuru ọchịchi ime obodo biile dị na steeti ahụ.
Umahi kwuru ihe a niile dịka ọ na-enyefe gọọmentị Naịjirịa ụlọọgwụ nje gọọmentị Ebonyi rụrụ ọhụrụ n'ime Alex Ekwueme Federal Teaching Hospital dị n'Abakaliki.