Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. 'Ndị ọrụ ahụike bu coronavirus n'Enugwu ruru 70'

    Ndịọrụ ahụike

    Ebe foto si, LSMOH

    Gọọmentị Enugwu steeti ekwuola na ndịọrụ ahụike buterela ọrịa coronavirus n'Enugwu eruola mmadụ iri asaa.

    Onye isi Kọmiti na-egbochi ọrịa coronavirus n'Enugwu bụ Emmanue Ejim kwupụtara nke a n'ụbọchị Mọnde.

    Ejim gbarụrụ ihu na ndị mmadụ anaghị edobe iwu niile gọọmentị tinyere iji gbochie mfesa ọrịa a.

    O kwukwara na ndị uweojii anaghị enyechara gọọmentị aka ịhụ na ndị mmadụ na-eme ihe ha kwesịrị ime.

    Ejim kwuru sị: "N'ime mmadụ 276 bụ ọrịa Covid-19 n'Enugwu, ihe karịrị 70 bụ ndị ọrụ ahụike."

    Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị arịọla ndị agha nke ngalaba 82 'division' ka ha nyere ha aka n'ịmanye ndị mmadụ ka ha na-edebe iwu Covid-19.

  2. A hụla coronavirus n'ahụ mmadụ 566 ọhụrụ na Naịjirịa

    Ọnụọgụ Coronavirus

    Ebe foto si, NCDC Twitter

    Ụnyaahụ bụ ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Junn, Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) a chọpụtala coronavirus n'ahụ mmadụ narị ise, iri isii na isii (566) ọhụrụ na Naịjirịa.

    Nke a nwetere ọnụọgụ ndị bu nje a na Naịjirịa puku iri abụọ na ise, otu narị na iri atọ na atọ (25,133)

    N'ime ndị ọhụrụ a, Ebonyi chitara mmadụ iri anọ na atọ, Imo iri na ise, ebe Anambra steeti ji mmadị abụọ naanị.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  3. "Ọ bịara ije nwe ụna"

    Njem anyị na unu abịala na njedebe taa.

    Anyị ka kwụ chịm echi ị wetara unu akụkọ dị ọku ka o si dị ọkụ gbasara coronavirus.

    Ka chi fo!

  4. Legọs ga-anabata ụlọ nyocha abụghị nke gọọmentị maka nyocha Covid-19

    Akin Abayomi

    Ebe foto si, LSMOH

    Gọọmentị Legọs steeti akọwala na ha ga-amalite iji ụlọ nyocha ndị abụghị nke gọọmentị eme nyocha ọrịa coronavirus.

    Rue ugbua, ọ bụ n'ụlọ nyocha anọ nke gọọmentị etiti nakwa gọọmentị steeti rụrụ ka a na-eme nyocha niile gbasara coronavirus.

    Ha kwuru na ha ga-eme nke a n'ihi na ha na-atụ anya na ndị mmadụ ga-ebido ịme nyocha a maka ihe dị mkpa dị icheiche dịka ịlaghachi ọrụ, ndị chọrọ ị ga njem, ndị na-arụ ọrụ metụtara nri na ndz.

    "O doro anya na gọọmentị anyị sọsọ agaghị emenwu ihe niile dị na nyocha ọrịa" ka ha kwuru.

    Ụlọ nyocha ndị e nyere ikike ugbua gụnyere:

    • Total Medical Services
    • SynLab
    • 54 Gene
    • Medbury Medical Services
    • Biologix Medical Services
    • 02 Medical Services
    • Clina Lancent Laboratories

    Dịka kọmịshọna ahụike na Legọs bụ Akin Abayomi kwuru, ha ka na-elebanye anya n'ụlọ nyocha ndị ọzọ abụghị nke gọọmentị nwereike ịnye aka na nyocha ọrịa a.

  5. Gere akụkọ dị mkpa na mgbede a n'otu nkeji

  6. Na Akpọtụ Ugbu A, Gọọmentị Naịjirịa ewepula mmachi njem si steeti gawa steeti site Jụlaị 1

    Njem steeti

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmenti Naịjirịa ekwuputala etu a ga-esi gawa n'ihu dịka ewepuru mmachị ndị etinyere na njem nakwa ọgbakọ mmadụ n'ọha.

    Dịka ngalaba nọ n'isi mbuso coronavirus agha bụ nke eji Presidential Task Force mara siri kwuo, ewepụla mmachị isi steeti gawa steeti.

    Mana ha kọwara na usoro a ga-eji hazie njem ụgbọelu na ụgbọala ga-abụ nke nchekwwa ndụ ga-abụ isi okwu ya.

    Nke a pụtara na onye chọrọ ịga njem ụgbọelu ga-eru n'ọdọ ụgbọelu elekere atọ tụpụ oge ụgbọelu ya ga-efepụ eruo.

    Ha sịkwa na ụgbọala ga na-ebu ọkara ihe ọ na-ebubu mbụ.

    Ihe ọzọ bụkwa na mmachị ngagharị ka ga-adị site elekere iri nke abalị ruo elekere anọ nke ụtụtụ.

    Usoro ndị a niile ga-amalite n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Jụlaị.

    Ha kwukwara na a ga-ahazi ụsoro ga-eme ka ndị nọ na ngụcha ụlọakwụkwọ n'ogogo dị icheiche gụpụta akwụkwọ ha.

    Nke a metụtara ndị nọ praịmarị 6,JS3 SS3 nakwa ndị mahadum nọ na afọ ikpeazụ ha.

    Okpuruọchịchị ndị a ga-amachi

    Onyeisi ngalaba PTF bụ Boss Mustapha nyere ndụmọdụ ka amachie obodo ọzọ n'okpuruọchịchị 18 n'ime 774 dị n'ala Naịjirịa.

    O kwuru nke a maka na ihe ruru pasentị 60 n'ime ndị nwere ọrịa na Naịjirịa niile si n'okpuruọchịchi 18 ndị a.

    Ya mere o jiri chee na ọ ga adị mma ịmachi ha ka e nweike mee mmadụ niile bi ebe ahụ nyocha na agwụgwọ.

    Dịka ọ dị ugbua mmadụ 24,567 bụ ndị buterela ọrịa a na Naịjirịa ebe mmadụ 565 nwụrụla site na ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Ọkụ agbagbuola mmadụ asaa bu Coronavirus n'ụlọọgwụ

    Eserese Alexandria

    Ọkụ gbara n'obodo Alexandria na mba Ijipt egbuola mmadụ asaa ma merụọ mmadụ asaa ọzọ ahụ.

    Ndị ntaakụkọ maba Ijipt na-akọwa na ọ bụ ọkụ bidoro na ntụoyi etinyere n'ụlọọgwụ ebe e dopuru ndị na-arịa coronavirus iche malitere ịgba.

    Dịka ọ dị ugbua, ebupula ndị ọzọ naa-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ahụ ma gbachie ya dịka a na-eme nyocha bnanyere ọdachi a mere.

  8. Echi ka Naịjirịa ga-ewpụta usoro ọhụrụ maka Covid-19

    Otu ekpokọbara iji lụso ọrịa coronavirus agha ezigarala onyeisiala Muhammadu Buhari nchọpụta nakwa ndụmodụ ha taa n'Abuja.

    Ihe ndị ha kọwara ya gụnyere etu mmepe obodo nwayọ nwayọ nke amalitere n'izuụka anọ gara aga si mee.

    Ndị gara nzụko a gụnyere Boss Mustapha, Osagie Ehanire, Chike Ihekweazu na Sani Aliyu.

    Ha kwuru na ọ bụ echi ka Naịjirịa ga-ekwuputa usoro maọbụ iwu ọhụru nwereike ịpụta gbasara mmepe obodo.

    Otu ndị na-elekọta Covid-19 na Naịjirịa

    Ebe foto si, @BashirAhmad/Twitter

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. Mba Tanzania agbapeela ụlọakwụkwọ taa

    Mgbape ụlọakwụkwọ Tanzania .

    Ebe foto si, AFP

    Mba Tanzania esorola ntuziaka onyeisiala ha bụ John Magufuli n'ịgbape ụlọakwụkwọ pramarị nakwa sekọndrị n'ala ha.

    Nke a na-abịa dịka ha gbachiburu ụlọakwụkwọ n'ọnwa Maachị dịka mkpamkpa coronavirus na-amalite ịkpa n'Afrịka mgbe ahụ.

    Mana gọọmentị ala ahụ nyere ndị ụlọakwụkwọ nakwa ụmụakwụkwọ usoro ha ga-ejide aka iji hụ na ha efesaghị

    Ọ pụtara na Tanzania esorola nzọmụkwụ mba Gini, Kamerun, Saụt Afrịka, Senegal na ọtụtụ ndị ọzọ gbapere ụlọakwụkwọ na mba ha.

  10. Ndị EU ga-emepe okeala ha na Julaị, mana ha achọghị ndị Naịjirịa

    EU ga-emepe okeala ha ọzọ

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị otu 'European Union' ekwekọrịtala imepe oke ala ha n'abalị mbụ nke ọnwa Julaị afọ 2020.

    Mana Naịjirịa nakwa mba ndị ọzọ dịka Amerịka, Brazil, Rụssia, Qatar na ndị ọzọ esoghi na ndị a ga-anabata.

    Nke a bụ maka na ọrịa coronavirus ka na-agbali elu na mba ndị ahụ.

    Naịjirịa nwere mmadụ 24,567 bụ ndị a hụrụla nje covid-19 n'ahụ ha.

    N'ime ọnụọgụgụ a, mmadụ 9007 agbakeela ebe mmadụ 565 alaala mmụọ.

    Ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị na Legọs
    Nkọwa foto, Njem ụgbọelu ka mechiri emechi na Naịjirịa

    Ka ọ dị ugbua, otu EU wepụtara aha mba 54 bụ ndị a ga-ekwe ka ha bata na Europe ma e mepee oke ala.

    Mba 54 ndị a bụ:

    Albania, Algeria, Andorra, Angola, Australia, Bahamas, Bhutan, Bosnia na Herzegovina, Canada, China, Costa Rica, Cuba, North Korea, Dominica, Egypt, Ethiopia, Georgia, Guyana, India, Indonesia, Jamaica, Japan, Kazakhstan, Kosovo, Lebanon na Mauritius.

    Ndị ọzọ bụ Monaco, Mongolia, Montenegro, Morocco, Mozambique, Myanmar, Namibia, New Zealand, Nicaragua, Palau, Paraguay, Rwanda, Saint Lucia, Serbia, South Korea, Tajikistan, Thailand, Tunisia, Turkey, Turkmenistan, Uganda, Ukraine, Uruguay, Uzbekistan, Vatican City, Venezuela, Vietnam na Zambia.

  11. Ụlọikpe emepeela n'Ebonyi steeti dịka e mechichara ya maka egwu coronavirus

    Dave Umahi

    Ebe foto si, Ebonyi state media

    Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti enyela iwu ka e mepegharịa ụlọikpe bụ nke e mechiri kemgbe abalị asatọ maka egwu coronavirus.

    Kọmishona mgbasaozi na steeti ahụ bụ Uchenna Orji sị na mmepe ụlọikpe a bụ maka arịrịọ ndị ọrụ ụlọikpe rịọrọ gọọmentị ka ọ nyere ha aka ịbado ọrụ dịka o kwesiri.

    Dịka Kọmishọna sị kwuo, "Gọvanọ Dave Umahi enyela iwu ka ọrụ malite n'ụlọkpe niile n'Ebonyi steeti taa bụ ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Juun afọ 2020".

    Gọomentị dọkwara ha aka na ntị ka ha gbaa mbọ dowe iwu niile gbasara igbochi mfesa nje coronavirus.

  12. Coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ 500,000 n'ụwa

    Ọnwụ coronavirus

    Ebe foto si, Reuters

    Ihe karịrị mmadụ puku narị ise anwụọla n'akụkụ ụwa niile n'ihi ọrịa coronavirus.

    Mba Amerịka ka bụ mba kacha nwee ọrịa a ma bụrụkwa ebe ya bụ ọrịa kacha gbuo mmadụ.

    Mba ndị ọzọ ebe coronavirus na-akpa ike gụnyere Brazil, Rọshịa, Indịa nakwa UK.

    Ihe karịrị mmadụ nde iri bu ya bụ ọrịa n'ụwa niile.

  13. Mmadụ 490 ọhụrụ ka a chọpụtara coronavirus n'ahụ ha na Naịjirịa

    Ọnụọgụgụ Coronavirus na Nịgerịa

    Ebe foto si, NCDC

    Ngalaba 'National Centre for Disease Control' akpọpụtala mmadụ 490 dịka ndị a chọpụtara nje coronavirus n'ahụ ha n'ụbọchị Sọnde.

    N'ime ndị a, mmadụ 68 si Ebonyi steeti, mmadụ iri na atọ bụ ndị Imo, ebe mmadụ atọ si Enugwu.

    Lee ka ndị NCDC si depụta ya n'uju:

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. Ụnụ asaala chi

    Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ, ụnụ asaala chi.

    Ọfọ anyị na-agọrọ gị bụ ka izuụka butere ngọzị n'ụkpa o.

  15. Ka chi foo!

    Echi ga-abụ echi ọma!

    Bịa nọnyere anyị n'ụtụtụ.

    Ndeewo!

  16. Florida na Texas agaghị emepezị dịka ihe karịrị mmadụ nde 2.5 buterela coronavirus n'Amerịka

    Texas na Flọrịda agaghị emepezị

    Ebe foto si, Getty Images

    Obodo Flọrịda na Texas agbanweela ebumnuche ha imepe obodo ha ọzọ dịka ọnụọgụgụ ndị ọrịa coronavirus na-anyụ ịkpakwụ na steeti abụọ a rịrị oke elu.

    Ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a malitere ịrị elu dịka a hapụrụ ụfọdụ ụlọọrụ ka ha mepee n'ime izu ole na ole.

    N'ụbọchị Satọdee, ihe karịrị mmadụ 9,500 butere ọria, ebe 9,000 butere ya n'ụbọchị Fraịdee.

    Nke a na-abịa dịka ihe karịri mmadụ nde abụọ na puku narị ise (2.5m) buterela ọrịa a na mba Amerịka.

  17. Ihe karịrị nde mmadụ iri ebutela coronavirus na mbaụwa

    Mahadum Johns Hopkins ekwuola na ihe karịrị nde mmadụ iri ebutela ọrịa coronavirus na mbaụwa niile.

    Marakwa na ọrịa a ataala isi ihe ruru mmadụ 499,124, ebe mmadụ 5,077,700 gbakerela.

    A na-atụkwa anya na o nwereike ịrị elu karịa etu ọ dị ugbua.

    N'otu aka ahụ, ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ WHO n’aha ịchafụ kwukwara na ọnụọgụgụ ndị butere coronavirus n’Afrịka eruola puku narị atọ na iri isii na itoolu

  18. Gee akụkọ ehihe taa n'otu nkeji

  19. E liela Abiola Ajimobi onye chiburu Oyo steeti

    E liela gọvanọ chịbụrụ Oyo steeti bụ Abiola Ajimobi taa bụ ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Juun n'Ibadan Oyo steeti.

    Enwebeghị onye ma ebe ha liri ya kama a ga-ekpere ya ekpere pụrụ iche n'elekere iri na abụọ nke ehihie iri abụọ na asatọ nke ọnwa Junu.

    Mara na ọ butere coronavirus tupu ọ nwụọ.

    Etu o siri gaa

    Ajimobi

    Ebe foto si, Abiola Ajimobi

    Akwamozu Ajimobi
    Akwamozu Ajimobi
    Akwamozu Ajimobi
  20. Gee akụkọ ụtụtụ taa n'otu nkeji