Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Nwunye aka na-achi Benue, nwa ya na ndị ọrụ ya ebutela coronavirus

    Eunice Ortom

    Ebe foto si, EUNICE ORTOM/FACEBOOK

    Nwunye gọvanọ steeti Benue bụ Eunice Ortom esorola na ndị butere coronavirus.

    Ọ bụ n'abalị Fraịde ka odozioakụ Ortom kwuru nke a dịka ọ sị na nyocha o mere pụtara na onwere coronavirus.

    O kwuru na nwa ya nwoke nakwa ụfọdụ ndị na-arụrụ ya ọrụ butere ya bụ ọrịa.

    Odoziakụ Ortom si na ha niile abaala n'ọnọdụ ịnọ onwe ha maka igbochi ibunye ndị ọzọ ọrịa.

    Ọ sịkwa ka ndị ọzọ zutere ya n'ime izuụka abụọ gara aga ga mee nyocha mara ma ha ebu coronavirus.

  2. Otu Minista na Gana arituola n'ọrụ maka ịda iwu banyere coronavirus

    Carlos Kingsley Ahenkorah

    Ebe foto si, Ghana Parliament

    Otu Minista na mba Gana akwụsịla onwe ya ọrụ dịka ọ pụtara ihe na o dopughi onwe ya iche mgbe o butere ọrịa coronavirus.

    Carlos Kingsley Ahenkorah kwuputara na o gara ọrụ n’ogbe ya tupu oge mmadụ ịdopu onwe ya iche agachaa.

    Maazị Ahenkorah bụ osote Minsita na-ahụ maka azụmahịa.

    Ọ bụkwa onye omeiwu na Gana.

    Ọ gara ebe a na-edenye aha n'akwukwọ ntuliaka n'obodo Tema so n'ebe ọ na-anọchịte anya.

    Maazị Ahenkorah sị na ya kwụ ịchakwụ oge o mere njem a, ma sikwa na ama coronavirus egosighị n'ahụ ya.

    Ụfọdụ mmadụ na Gana sị ka akpụpụ ya ụlọikpe ma iwu a ọ dara site na-itinye ndị mmadụ n'ọnọdụ ha nwereike si bute coronavirus.

    Gana enwetela ihe ruru mmadụ puku asatọ orịa fesara ma nweka ihe ruru mmadụ otu narị o gburu.

    Ọnụ ọgụgụ ndị bu ọrịa arịala elu kemgbe ewepụrụ mmachị ngagharị na mba ahụ n'ọnwa gara aga.

  3. Mmadụ 454 ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ maka mbochi ọrịa bụ Nigerian Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na ha hụrụ nje coronavirus n'ahụ mmadụ 454 ọhụrụ.

    87 n'ime ndị a nọ na Legọs ebe ndị ọzọ nọ na steeti dị iche iche na Naịjiịa.

    Nke a butere ọnụ ọgụgu ndị bu nje a na Naịjirịa 27,564.

    Mmadụ 628 anwụọla site n'ọrịa a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Nnọnụ!

    Ndị ọrụ ahụike

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị be anyị nnọọ nụ na peeji anyị

    Igbo tụrụ ilu si na nkwụcha abụghị ụjọ ya mere anyị na-asị unu kee nụ nkwụcha n'ebe ọrịa coronavirus nọ.

    Sonye kwanụ anyị taa maka akụkọ niile gbasara ọrịa ahụ taa.

  5. Ka chi fo

    Umụ Igbo, anyị abịala n'isi njedebe mgbasa ozi nke taa.

    Ka echi fotere anyị ihe ọma.

  6. Ọkara ndị niile butere coronavirus n'Afrịka agbakeela

    Coro

    Ebe foto si, FAAN

    Ihe fọrọ obere ka o ruo ọkara ndị niile butere ọrịa coronavirus n'Afrịka agbakeela.

    Nke a bụ dịka ngalaba 'Africa Centre for Disease Control' si depụta n'akara Twitter ha n'ụbọchị Fraịde.

    Cheta na ndị ọkachamara kwuburu na ọrịa coronavirus ga-emekpa Afrịka ahụ, mana ihe a tụrụ anya ya abụghịzị ihe a na-ahụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Ndị nweterela nje coronavirus na Legọs eruola 10,639

    Babajide Sanwo-Olu

    Ebe foto si, Babajide Sanwo-Olu/Twitter

    Gọọmenti Legos steeti agbaala ama na ndị buterela nje coronavirus na steeti ahụ rute abali abụọ nke ọnwa julai kwụ na puku iri, narị isii , iri atọ na itoolu(10,639).

    N' otu aka ahụ, mmadụ puku abụọ,nari isi, iri asatọ na otu ( 2,681) agbakeela, ebe mmadụ otu nari iri asaa na asaa(177) bụ ihe ọrịa ahụ dulara mụọ.

    Gọvanọ steeti ahụ bụ babajide Sanwo-Olu onye kwuru nke a na ozi ọ gbasara n'ehihie Fraide, kwuru dịka Legọs bụ ebe coronaviruskachasị akpa ike, na steeti ahụ ji anya ọnwụ achụ ya ka ọ pụọ.

    Ọ gara ama na iji hụ na ya bụ mbọ mịtara mkpụrụ, na steeti ahụ edenyela aha ụlọ nnyọcha asaa dịrị onwe ha ka ha soro na eme nnyọcha ọrịa ahụ.

    Ụlọ nnyocha ahụ nọrọ onwe ha a mapụtara ọhụrụ ahụ bụ; SynLab, Clina-Lancet, Medbury Medical Services, Total Medical Services, O2 Medical Services, Biologix, nakwa 54Gene.

  8. Gee akụkọ abali taa n'otu nkeji

  9. A kpọlatala ụmụ Naijirịa 86tọrọ na mba Sudan

    Onyeisi nagalaba na-ahụ maka ndị Naijirịa bi n'ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa ekwuola na mmadụ iri asatọ na isii ọzọ esila mba Sudan lọta Naijirịa n'elekere iri nke ụtụtụ n'ụbọchị atọ nke ọnwa Julị afọ 2020.

    Dabiri-Erewa kwuru na nnyocha gosiri na ha ebughị ọrịa coronavirus, kama ha ga-edopu onwe ha iche izuụka abụọ dịka iwu si di.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  10. Madagascar herbal cure: Gọọmenti etiti sị na ha na-eche ego nkwado

    Dkta Enahire Osagie

    Ebe foto si, Enahire Osagie

    Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Dkta Enahire Osagie ekwuola na obere nnyocha ha mere gosiri na ihe dị n'ọgwụ coronavirus nke si mba Madagascar mere gosiri na ọ bụ ihe dịga n'ọgwụ ịba dị n'ime ya.

    Osagie kwuru na ka ọ dị ugbua gọọmenti etiti na-eche ego nkwado nke Bekee kpọrọ 'grant' iji mee nnyocha tọrọ atọ were mata na ọ bụ n'ezie na ọgwụ ahụ na-agwọ coronavirus.

    Cheta na ọnwa ole gara aga, Naijiria natara ọgwụ mkpọrọgwụ n'aka mba Madagascar nke mba ahụ kwuru na ha ji agwọ ndị agwọ ndị ala ha ọrịa coronavirus.

  11. Quarantine: Ingland agụnyela Chaina, Amerịka na mba ndị ha ga-edopu iche ma ha bata ala ha

    Ndị njem nlegharị anya

    Ebe foto si, Reuters

    Ingland ewepụtala aha mba ndị si ha bata ala ha agaghị eso na ndị a ga-edopu iche n'ihi coronavirus

    Mba ndị agụnyere Grisi(Greece) Spen,Fransi na Beljọm so na mba ndị ahụ.

    Mana ha kwuru na ndị si mba Chaina, Amerịka, Swidin na Pọtụgal ga-anọpụ iche abali iri na anọ (14) bido n'abalị iri nke ọnwa Julai bụ oge ha ga-agba ala ha maka ndị si mba ọzọ ịbata.

    E tinyeburu mmachi njem kemgbe ọnwa June iji kwụsị coronavirus ịbata n'ala ahụ dịka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus n'ala ahụ na-agbada.

    Mana ndị nọ n'ọchịchị na Scotland na Wales ekpebibeghị iwepụ mmachi njem dị na mpaghara nke ha.

  12. Umahi ekwuola na ya ga-enyefe ọchịchị n'aka osote ya ma nchọpụta gosi na ya nwere nje COVID-19

    Dave Umahi

    Ebe foto si, Enyinna Omoke

    Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi ekwuola hoohaa na ya ga-enyefe osote ya ọchịchị n'aka maọbụrụ na nchọpụta ya mere egosi na ya nwere nje coronavirus.

    Umahi kwuru nke a mgbe ọ na-edo ụfọdụ ndị ọrụ ọ were ọhụrụ n'iyi n'Abakaliki bụ ebe ọ nọ kwuo na ana atụanya mpụtara nyocha coronavirus e mere ya.

    O kwuru na ọ bụrụ na mpụtara a gosi na ya nwere coronavirus, na ya ga-enyefe ọchịchị n'aka Osote ya mgbe ọ ga-anọpụ iche.

    Chete na ụfọdụ ndị ọrụ ya butere nje coronavirus mana ọ kweghị ekwu ndị ha bụ.

  13. NCDC ahụla nje coronavirus n'ahụ mmadụ 626 ọhụrụ na Naịjriịa

    NCDC

    Ebe foto si, NCDC/Twitter

    Ụlọọrụ na-ahụ maka nje na mgbochi ọrịa mbute bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) achọpụtala mmadụ narị isii, iri abụọ na isii (626) ọhụrụ bu nje coronavirus ụbọchị Tọzde bụ ụbọchị abụọ nke ọnwa Julaị.

    Nke a mere ya mmadụ puku iri abụọ na asaa, otu narị na iri (27110) bu ya bụ nje na Naịjirịa.

    N'ime ndị a, mmadụ puku iri, narị asatọ na otu (10801) agbakeela laa be ha.

    Mmadụ iri atọ na otu (31) n'ime ndị ọhụrụ a si Abia, mmadụ iri na asatọ (18) si Delta, ebe mmadụ iri na ise (15) si Enugwu steeti.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. Unu asaala chi e?

    Ụbọchị taa ga-adịrị unu mma.

    Iseee!

    Daalụ maka ịbịa nọnyere anyị n'ụtụtụ a.

  15. Ka chi fonu

    Ụmụ Igbo, n'ebe a ka anyị ga-awụsa ọwa.

    Ka ọ dịnụ echi.

  16. Nwunye Akeredolu ebughi coronavirus

    Akụkọ na-efesa na nwunye Gọvanọ Ondo State bụ Rotimi Akeredolu ebutela ọrịa coronavirus abụghị eziokwu.

    Ọnụ na-ekwuru gọọmentị Ondo bụ Olusegun Ajiboye gwara BBC na akụkọ a emeghị eme.

    O kwuru na ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, gọọmentị ga-ekwupụta ya etu ha si kwupụta nke gọvanọ.

    Nwunye gọvanọ Ondo steeti

    Ebe foto si, Twitter/Rotimi Akeredolu

  17. Onye zee uzere n'ụgbọelu, a ga-ewe ya ka onye bu coronavirus - Ndịọrụ ụgbọelu

    Ụgbọelu

    Ebe foto si, Getty Images

    Dịka njem ụgbọelu ga-amalite ọzọ na Naịjirịa n'izuụka na-abịanụ, ndị ọ dị n'aka ekwuola na ha agaghị eji ya bụ ọrịa egwu egwu chaa chaa.

    Ado Sanusi bụ onyeisi ụlọọrụ 'Aero Contractors' kwuru na onye ọbụla zere uzere n'ụgbọelu ha, a ga-ewe onye ahụ dịka onye bu ọrịa coronavirus.

    Cheta na uzere bụ otu ihe nwere ike igosi na mmadụ ebutela ọrịa Covid-19.

    Ndị ọzọ gụnyere ụkwara, ahụọkụ, isi ọwụwa, akpịrị ịfụ ụfụ, dgz.

    Sanusi kwuru na onye ọbụla nwere ihe ọbụla n'ime ndị a, agaghị eke ka ọ baa ụgbọelu.

    Ọ bụrụ na ya bụ ihe malitere oge ụgbọelu feliri, a ga-enyefe onye ahụ n'aka ndịọrụ ahụike ngwa ngwa ha feturu.

  18. Komishona ahuike n'Ondo steeti anwụọla n'ọrịa coronavirus

    Komishona ahuike n'Ondo steeti bụ Dkta Wahab Adegbenro anwụọla site n'ọrịa coronavirus.

    Adegbenro nwụrụ n'ụlọọgwụ emaka ọrịa na-efe efe dị na steeti ahụ Taa bụ Tọzde.

    Nke a na-eme abali abụọ gọvanọ steeti ahụ bụ Rotimi Akeredolu kwupụtachara na ya ebutela ọrịa coronavirus.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  19. Switzerland ga-agbape mba ha ka naani mba 14 bata bido Julai 21

    Mba Switzerland
    Nkọwa foto, Grindelwald dị na Switzerland bụ ebe e ji njem nlegharị anya mara tọgbọzi chakoo n'ihi coronavirus

    Mba Switzerland ekpebiela ịgbape ala ha bido n'abalị iri abụọ na otu nọ(21) nke ọnwa Julai ma ha nyere naanị mba iri na anọ ohere ịbata ala ha.

    Mba ndị a gụpụrụ mba ndị emepeghị emepe dịka ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa coronavirus na-agbalite.

    Ka o siri kwụrụ taa (Julai 2,afọ 2020) mmadụ 31,967 bụ ihe nweterela ọrịa coronavirus na mba Switzerland, ebe 1,965 nwụọrọla.

    N'aka nke ọzọ mmadụ 29,200 agbakeela n'ọrịa coronavirus.

    Switzerland
  20. CAN,NSCIA sị ka e buo ọnụ abali atọ maka coronavirus

    Samson Ayokunle na Sa'ad Abubakar

    Ebe foto si, Samson Ayokunle, Sa'ad Abubakar/Facebook

    Otu jikọrọ ndi okpupkpere di iche iche a kpọrọ 'Nigerian Inter-Religious Council' kpọọla oku ekpere na ibu ọnụ abalị atọ maka coronavirus.

    N' ozi nke onyeisi Christian Association of Nigeria (CAN) bụ Samson Ayokunle na onyeisi Nigeria Supreme Council for Islamic Affairs(NSCIA), otu jikọrọ ndị ụka Alakụba ma bụụkwa 'Sultan nke Sokoto bụ Muhammadu Sa’ad Abubakar III binyere aka, ebumọnụ ahụ ga amalite na Fraide rue Sunday iji rịọ enyemaka Chineke n'ibi ọgụ coronavirus.

    Ozi ahụ sirị: “ Ndị ụka Alakụba ga-ebido ụbọchị Fraide bụ Julai 3, 2020 site na ikpe ekpere n'ụlọ okpukpere "Abuja National Mosque" , ebe ndị Ụka Kraistị ga-emechi eekpere ahụ na "National Christian Centre dịkwa n' Abuja n' Elekere atọ nke ehihie.