You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Governorship Election Results: E wepụla Rochas oche n'otele n'Imo steeti

Etu ntuliaka ọkwa gọvanọ na nke ụlọomeiwu nke steeti si aga n'Ọwụwa-Anyanwụ.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa and Chimamaka Ihenacho

  1. 'Card reader' na-emezi 'vum-vam' na Bayelsa, Ụlọọrụ INEC kwuru na "card reader" 22 fuburu na Bayelsa apụtakwala ọzọ.

    Ụlọorụ Inec dị na Bayelsa steeti kwuru na ha chọtara igwe "card reader" 22 n'ime 69 furu ka e mechara ntuliaka ọkwa onyeisiala na steeti ahụ.

    Monday Udoh Tom bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ a na-akpọ "Resident electoral commissioner" na Bekee, gwara ndị ntaakụkọ na ha gwara ndị nnọchiteanya ndị pati nọ na mpaghara ebe igwe ndị a furu, na ha na-ekwe ha nkwa ịgbaghara onye ọbụla weghachịtara nke ya.

    O kwuru sị "nke a mere ka ndị mmadụ bido iweghachị igwe ndị ahụ. Anyị wetara 14 na Nembe, atọ na Sagbama, abụọ na mpaghara Southern Ijaw na atọ si na Yenegoa".

    N'agbanyeghi na a gaghị eme ntuliaka gọvanọ na steeti ahụ ruo ọnwa Disemba, a ga-eme nke ndị ụlọomeiwu nke steeti echi bụ Maachị 9, n'ime okpuruọchịchị asatọ.

  2. Ego ole ka a ga-eji zụta vootụ gị?

    Dịka ntuliaka Gọvanọ tụnyere n'ụkwụ, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị jị ihe onyinye dị iche iche were azụ obi ndị mmadụ.

    N' Abịa Okezie Ikpeazụ kere mmanụ ọkụ lita atọ otu onye.

    Na Legọs, Babajide Sanwo-Olu kere ndị mmadụ osikapa.

  3. Ụlọikpe ajụla ịnapụ Wike ikike ịzọ ọkwa gọvanọ ọzọ

    Ụlọikpe Ukwu n'Abuja nọrọ ụbọchị Fraide jụ ịkwụsị Gọvanọ Nyemsom Wike nke Rivas isonye n'zọ ọkwa onyeisiala ụbọchị Satode.

    Otu nwoke bụ Elvis Chinda kpụpụrụ Wike n'ụlọikpe maka ebubo na akwụkwọ ndị o nyere Inec maka ntuliaka bụ adịgboroja.

    Ọkaikpe Inyang Ekwo kwuru na ebubo ịgbụ asambodo bụ mpụ kara aka nke kwesịrị ka onye boro ebubo gosipụta n'ụzọ were anya na onye a na-ebo ebubọ mere ihe e boro ya.

  4. A gbaala ụlọọrụ Inec ọkụ n'Akwa-Ibom

    Ndị omekome agbaala ụlọrụ Inec dị n'ọkpụrụ ọchịchị Ibesikpo Asutan dị n' Akwa-Ibom ọkụ taa bụ Fraide.

    O webeghị onye ma ihe butere ọkụ ahụ mana onyeisi Inec na steeti ahụ bụ Mike Igini agaala njem nleta ebe ahụ ihe ihe mere

    Ka ọ dị ugbua, obi ko ndị mmadụ n'elu na steeti ahụ dịka a na-akwado ntuliaka gọvanọ.

  5. N'Ebonyi, akọrọngwa ntuliaka erutala mpaghara ke

    Ebonyi steeti: akurungwa eruola Ohaukwu local government dika Chris Okereke onye BBC nọ n'Ebonyị siri choputa.

    Onye 'SPO' anyi gbara ajuju onu kwekwara na ha enwetechaala akọrọngwa nke kachasị mkpa.

    Na ekechaala ndi nke ozo na wodu iri na ise di na okpuruochichi goomenti Ohaukwu.

    Ya bu SPO na-achoghi ka a kpọọ ya aha gbara ama na EO Ulooru ahu anoghi ma meekwa ka anyi mata ebumnobi ya bu EO bu Martin Ayi bu na akurungwa niile ga-aga na RAC ha site na elekere iri na abuo nke ehihie Friday a.

  6. N'Abia, okwu akpụ n' ọnụ bụ ntuliaka echi

      • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
      • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist BBC News Igbo

    Ndị mmadụ gbakọrọ n'ọdụ akwụkwọ akụkọ dị n'okporoụzọ Umuwaya dị n'Umuahia na-akparịtaụka banyere antuliaka gọvanọ na ụlọomeiwu steeti ga-akpọtụ echị.

    Ndị ahịa na-azụ na erekwa n' Ahịa Isigate A ma ama dị n' Umuahia. businesses.

  7. Tupu i chezọ na taa bụ ụbọchị ncheta ụmụnwaanyị...

    Abalị Asatọ nke ọnwa Maachị ọbụla bụ ụbọchị otu mbaụwa bụ United Nations mapụtara maka ncheta ụmụnwaanyị nke a kpọrọ 'International Women's Day",

    Ọ bụ ụbọchị e ji ekwu maka ịkwalite ọdịmma ụmụnwaanyị.

    N'afọ, isiokwu ya bụ 'nhatanha maka ọdịmma.'

    Ụmụnwaanyị bụ nne ma na-arụkwa ọrụ dị iche iche iji kwado ezinaụlọ na obodo ha.

  8. E kwela ka e jiri bute ọgbaghara maọbụ imebi iwu - Buhari

    N'abalị atọ gara aga, onyeisiala Naijiria bụ Muhammadụ Buharị gbasara ozi gbasara ntuliaka ga-eme echi.

    Buhari dọrọ aka na ndị sị onyte ọbụla "ekwela ka e jiri bute ọgbaghara maọbụ imebi iwu' n'oge ntuliaka a.

    O kwụru na ntuliaka a ga-eme echi dị oke mkpa ka ndị mmadụ pụta sonye iji weta ọchịchị na mmepe so nso ha.

    O kwukwara na ndị ọrụ nchekwa ga-anọ nye aka na udo chịị oge ntuliaka a.

    Ọ tasikwara ndị mmadụ nwụnarịrị na ntuliaka ọkwa onyeisiala emere obi.

  9. Akpụrụakụ azịza: Nke a ọ bụ nghasa ka ọ bụ nwanne ya?

    I chetara nnukwu azịza e tinyere n' ama Abụja nke wuru na sọshal midia izu ole na ole gara aga? Lekwa ọnọdụ ya ugbua.

  10. N' Anambara, ngwụcha abụghị ụjọ

    Ụlọọrụ INEC dị na Ọka, n'isi obodo Steeti Anambara malite ikesa akọrọngwaọrụ ndị kachasị dị mkpa nakwa ndị ọzọ a ga-eji mee ntuliaka nke ndị nnọchiteanya n'ogogo steeti n'ụbọchị Satọde na Tọọzde.

    Onyeisi mMgbasaozi na ịkụziri maka ntuliaka na Inec Anambara kwuru na -ahazi igwe 'card reader iji hụ na o nweghị ọgbatauhie ọbụla na ntuliaka Satọde.

    Mbọ ọnye ntaakụkọ BBC Igbo bụ Ken Udeh gbara ịnụta ọnụ okwu onyeisi Inec na steeti ahụ bụ NwaChukwu Orji amịtaghị mkpụrụ dịka e kwuru na ọ gara Abuja.

    Ị ga-echeta na Anambara Steeti agaghị esonye na ntuliaka maka ọkwa Gọvanọ nke afọ a bụ 2019.

    Ntụliaka maka ọkwa Gọvanọ na Steeti Anambara bụ nke e mere mgbe ọnwa Nọvemba dị na onwa iri na asatọ na afo 2017.

  11. Nkwado ebirilarị ọkụ n'Imo,

    Nkwado Inec biri ọkụ abalị ole na ole tupu ụbọchị ehiwere ntuliaka bụ abalị itoolu nke ọnwa Maach.

    Na mgbede ụbọchị isii n'ime ọnwa Maachị ka ha bidoro na-ahazi ya bụ ngwaọrụ n'usoro okpuru ọchịchị dị iche iche tupu e bugawa ha ebe ahụ.

    Ụnyaahụ BBC Ìgbò gara n'ụlọ akụ ọha bụ nke Bekee kpọrọ "CBN" ga hụ etu eji eke ya bụ akụrụngwa ntụliaka.

    Onyeisi ụlọọrụ Inec n'Imo steeti bụ ọkammụta Chukwuemeka Ezeonu, kwuru na ha ahụla na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ ga-ata ezigbo akpụ, ya mere ha ji akwado n'oge ka ihe gaa nke ọma ụbọchị ahụ.

    Ezeonu gwara BBC Ìgbò na njikere ha na ntuliaka nke a ka pụta ìhè maka akụrụngwa eji eme ntụliaka nke ọkpọ a e bụghị ịbụ ruo nke eji mee nke Onyeisiala.

    Ọ gakwara n'ihu kwuo na akụrụngwa ga-eru ebe ọ kwesịrị tupu ọ kụọ elekere iri na abụọ ke ehihie ụbọchị Fraịdee bụ ụbọchị nke asatọ nke ọnwa Maachị, akụrụngwa ntụliaka ga-eru ebe niile o kwesịrị. Ọ sịkwara na ebumnuche Inec Imo bụ na ntuliaka ga-ebido n'elekere asatọ nke ụtụtụ.

    Cheta otu ihe were ọtụtụ mmadụ iwe na ntụliaka ọkwa onyeisiala bụ na ntuliaka amaliteghi n'oge.

    N'okwu banyere ụlọọrụ Inec agbara ọkụ n'Isiala Mbano, Inec Imo sị na ha nwetere ebe ọzọ ha ga-edebe akụrụngwa nke mpaghara.

    Ọkụ gbara ụlọọrụ Inec ahụ butere na a ga-emeghari ntụliaka nke iji họpụta ndị omeiwu nke mpaghara 'Okigwe Zone'.

  12. Dịka ntuliaka tụnenyerela n'ụkwụ, Inec dọrọ ụmụ Naijirịa ọkachasị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị aka na ntị sị na ha agaghị enye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị manyere ndị ọrụ ha ka a kpọpụta ha dịka ndị meriri na ntuliaka gọvanọ na ụlọomeiwu nke steeti a ga-eme ụbọchị Satọde akwụkwọ mmerị akwụkwọ mmerị.

    Inec kwukwara na ha ga akagbu ntuliaka n'ebe niile ndị mmadụ jụrụ igwe 'card reader'.

    Onyeisioche Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a n'ụbọchị Tọọzde n' ọgbakọ ngalaba ndị ọrụ ntuliaka metụtara n'ọkwu gbasara nchekwa na ntuliaka n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja.

  13. Ndewoo nụ O!

    Bia sonyere anyị ka anyị nọrịa dịka anyị na-ewetara gị ihe na-eme dịka o si gbasa nkwado ntuliaka ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachi