You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Governorship Election Results: E wepụla Rochas oche n'otele n'Imo steeti

Etu ntuliaka ọkwa gọvanọ na nke ụlọomeiwu nke steeti si aga n'Ọwụwa-Anyanwụ.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa and Chimamaka Ihenacho

  1. "BBC zutenụ m n'ụlọikpe" - Segun Adewale

    Otu onye a ma ama n'otu ADP bụ Segun Adewale amajaala BBC na ọ ga-akpụpụ ha ụlọikpe maka ebubo eboro ya na ọ mara onye ntaakụkọ BBC aka ntị.

    O gwara BBC "wepụtanụ ihe akaebe ịgosi na m mere nrụrụaka ego maọbụ unu ezute m n'ụlọikpe"

    O gọrọ na ọ mara nwaanyị ahụ ọra maka kwuo na o gbochiri ndị Igwe mmadụ ịti ya ihe.

  2. Onye na-azọsa igbe ntuliaka ebe a?

    Anya hụrụ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ ndị agboro na-akwado otu AA na-akpa mkpa mkpa a.

    Ha kwuru na nke a mere n'ụtụtụ a n'obodo Eziobodo dị n'Owerri West.

    Cheta na AA bu otu Uche Nwosu na-azọ ọkwa Gọvanọ n'okpuru ya mgbe o si n'otu APC mapụta.

  3. Ndị Ọka ekurula ume ndụ ugbua

    Ndịi mmadụ ebidola ịgagharị n'Ọka dịka emechiri ntuliaka n'ebe dị icheiche n'Anambra.

    Foto na-egosi na ndụ ebidola na Zik Avenue a ma ama n'Ọka.

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo kwuru n'onweghi akụkọ ọjọọ a nụrụ ka ọ dị ugbu a,

    O kwukwara na ebe niile anyị gara ịhụ ka ọ si ga, nakwa site na ajụjụ ọnụ anyị gbara ndị mmadụ, ihe niile gara nke ọma.

  4. Mpụ a bụ ọgaranya na Borno n'ime ntuliaka a?

    EFCC anwụchiela otu nwoke aha ya bụ Abba Ali Abbari na Borno steeti ebe o ji ego kariri otu nde naira n'aka.

    Abbari gwara EFCC na ego ahụ bụ maka ikesa dịka ego nrụrụaka ịzụ vootu na Konduga n'ime Borno steeti.

    O kwuru na ebumnuche ya bụ ịkenye ndị nnọchịte patị dị iche iche puku naira iri ise (50,000).

  5. Gịnị na-enye ndị mmadụ aṅụrị n'Anambara?

  6. I chetara nwaanyị ahụ bu ute bịa ntuliaka onyeisiala?, O kpotere "whot" o ji azụ okwe n'ọgbọ ntuliaka ya n'Enugwu.

  7. Alex Otti tụrụ vootu ya mana o nwere mkpesa, Otti kwuru na ọ nụrụ kepu kepu na e nwere ndị nwara imabu igbe ntuliaka.

  8. Nsogbu dapụta na ntuliaka, bo ya ndị ndọrọndọrọ na-achụsị ọkwa ike - Umahi

    Dave Umahi kwuru na ntuliaka gara ọfụma ebe ọ nọ mee ntuliaka.

    O kwukwara sị na ọ bụrụ na e nwee ebe ọbụla ọgbaghara dapụtara ka a na-eme ntuliaka, na ọ ga-abụ n'aka ndị ndọrondọro ka o si.

  9. Rochas na nwunye ya atụọla vootu, Rochas Okorocha na Nkechi nwunye ya so pụta tụọ vootu n'Ogboko dị n'Imo steeti.

    Cheta na ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu, na-azọ oche ịnọchi ya dịka gọvanọ Imo steeti.

  10. Na Makurdi ndị omekome na-akupu mmadu isi ka obi sị tọọ ha

    Otu onye ọrụ EFCC agaala ụlọọgwụ maka ndị omekome kupuru ya isi na Markurdi taa.

    Ndị EFCC ahụ dere sị na ọ bụ ndị omekome APC kpara mkpamkpa a.

  11. Etu e si agụ mpụtara vootu na ihe ndị ọzọ na-eme na ntuliaka ọkwa gọvanọ a

  12. Onweghi ihe a tụtara n'ụlọọrụ INEC gbara ọkụ n'Ebonyi

    Cheta na BBC Igbo kọrọ akuko a mgbe o mere n'ụtụtụ taa bụ Maachị 9 n'Ezza Ebonyi steeti.

    Ndị omekome a batara n’ụlọọrụ INEC n'elekere abụọ nke isi ụtụtụ.

    Ha gbara ụlọakwụkwọ akpọrọ Community Secondary School dị n'Okposị, Umuoghara, n'Ebonyi steeti ọkụ.

  13. Ndị ntorobia Enugwu na-eme ngagharịiwe gbasara Ayogu Eze

      • Onye dere ya, Ebere Ekeopara
  14. E bidola ịgụ vootu n'Anambara

    A tụchaala vootu n'ụfọdụ ọgbọ ntuliaka n'Anambara steeti.

    Ugbua, e bidola ịgụ vootu n'ebe ahụ.

  15. A tụchaala vootu n'Amigbo Nwangele

    A tụchaala vootu na unit 007 dị n'Amigbo, Nwangele, Imo Steeti

    Ndị ọrụ INEC ebidola ịgụ vootu n’ebe ahụ.

    �x�4

  16. Ụda egbe na-ada na Kogi steeti

    INEC ekwuola na ha ehihariala ntuliaka na Mopomuru dị n'ime Kogi steeti ruo echị bụ ụbọchị iri n'ime ọnwa Maachi.

    Ha kwuru na a kpebiri ihe a makana ndị uweojii na-agba egbe na Lokoja ugbua nakwa na ndị omekome maburu ọtụtụ Igbe ntuliaka wụbanye n'ime ọhịa.

  17. 'Pụtanụ bịa sonye n'ịhazi ọdịnịhu Imo steeti' - Uche Nwosu

  18. Atiku tụkwara vootu, Abubakar Atiku zọrọ ọkwa onyeisiala kwuru sị ndị mmadụ chekwa vootu ha ma tụọ ya n'udo.

  19. 'Mpụtara ntuliaka ga-abụ mmeri m' – Ikpeazu

    Ikpeazu na-azọ ịchị Abịa steeti n’agba nke abụọ ya ekwuola na okwenyere na mmeri ya kpam kpam.

    Ihe ndị ọzọ o tinyere ọnụ na ya bụ okwu gbasara ndị nchekwa na ụzọ ha si esonye n'igbochi nrụrụaka.

  20. Election 2019: Ndị mmadụ na-anara ego iji tụ vootu na Bayelsa