Ntuliaka ebidola n'Abia na Ebonyi steeti
Ndị ọrụ INEC eruola Umuobiakwa wọd 7 n'Obingwa n'ime Abia Steeti.
Ntuliaka ebidokwala n'Anike n'ime Onicha, Ebonyi steeti. Ntuliaka malitara n'elekere asatọ nke ụtụtụ.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ntuliaka ọkwa gọvanọ na nke ụlọomeiwu nke steeti si aga n'Ọwụwa-Anyanwụ.
Uche Akolisa and Chimamaka Ihenacho
Ndị ọrụ INEC eruola Umuobiakwa wọd 7 n'Obingwa n'ime Abia Steeti.
Ntuliaka ebidokwala n'Anike n'ime Onicha, Ebonyi steeti. Ntuliaka malitara n'elekere asatọ nke ụtụtụ.
Sunny Emerenini bụ onye ọrụngo INEC bụkwa naanị onye pụtara ugbua na unit 006, wọọdụ 1 n'Umuaka, Imo steeti.
Ebe a bụ ụlọakwụkwọ Premier nke dị n'Achalla.
Uche Nwosu na-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti etiela mkpu arịrị maka ndị na-ebugharị akụkọ na o soghizi azọ ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ntuliaka ebidola ugbua n'Ado-Ekiti bụ isi obodo Ekiti steeti.
Ndị ntaakụkọ BBC nọrọ ebe ahụ na-ekwu na ugbua onweghị mgbagwoju anya na-eme ugbua na-ebe ahụ.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo na-ekwu ugbua na ndị agha Naịjirịa egbochiela okporoụzọ na Nkwagu military cantonment n'ime Abakaliki.
Cheta na ọ bụ ebe a ka ndị agha Naịjirịa gbochiri ụzọ ndị ntaakụkọ na ntuliaka ịhọpụta onyeisiala Naịjirịa nke ha mere n'ime izuuka abụọ gara aga.
Ụfọdụ ụgbọala na-agba n'ụzọ okirikiri nke dị na Wetheral n'ụtụtụ a n'Owere.
O nwekwara ndị ụgbọala na-agbakwa ugbua n'Owere.
Mana n'ọtụtụ ebe uzọ tọgbọ chako!
Otu nwaanyị na-eghe akara n'Abịa achọghị ịma na a na-eme ntuliaka taa.
Ihe ọ ma bụ "ọkwa ndị ga-eme ntuliaka ga-ebu ụzọ tụnye ihe n'afọ?
Hajara Sani gara na wọọdụ ya dị na Jọs Jarawa, ebe elekere anọ nke isi ụtụtụ, makana ọ chọrọ ịbụ nwaanyị mbụ ga-atụ vootu taa.
Akụkọ na-eru anyị ntị n'isi ụtụtụ a na-akọwa na ndị omekome bu egbe wakporo ụlọọrụ ebe ndị ọrụ Inec nọ na-eche imalite ọrụ ha taa.
Dịka ozi si n'aka otu onye Inec rute anyị, ndị omekome a mụnyere ọgbọ ntuliaka Okposi Umuoghara (07) RAC dị n'ụlọakwụkwọ Community Secondary dị n'Ọkpọsị, dị n'okpuruọchịchị Ezza Nọt, ọkụ.
Ụtụtụ ọma ndị nke anyị. Unu abọọla chi taa?
Ndị uweojii na Steeti Anambara ekwupụtala njikere ha dị inye nchekwa n'ụdị pụrụ iche maka ntuliaka ndị Ụlọomeiwu na Steeti Anambara.
Na mkparịtaụka ekwentị ya na BBC News Igbo nwere n'Ọka, isiobodo Steeti ahụ, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mazi Haruna Mohammed, kwuru na ha dị njikere ugbua karịa ka ha dị n'oge ntuliaka onyeisiala.
O kwuru na aka ndị uweojii Steeti Anambara akparala ndị ahụ niile ji akaike chọọ ka ha maburu igbe ntuliaka n'oge emere ntuliaka onyeisiala na Satọdee izuuka abụọ gara aga, gosi ha ọhaneze ma kpupukwa ha n'ụlọikpe.
Ọ gwara ndị mmadụ ga-atụ vootu ka ha ghara ịtụ egwu kama ka ha pụta n'igwe tụọ vootu ha, gbakwunye na ndị uweojii Steeti Anambara na-atụ anya inweta ọtụtụ ọnụọgụgụ ndị uweojii na Steeti ndị gbara Steeti ahụ gburugburu, dịka ha ga-enwe ọtụtụ ndị nchekwa na ntuliaka nke a Karị ka ọ dị n'oge ntuliaka onyeisiala.
Imo steeti so na steeti ndị azọm ọkwa gọvanọ ga-akpụ ọkụ n'ọnụ n'ihi ọtụtụ ihe gụnyere nnukwu mmọnwụ ndị anya ha dị n'oche ahụ.
Ndị a gụnyere Ikedị Ohakim, Hope Uzodinma, Uche Nwosu,Ifeanyị Ararume nakwa Emeka Ihedịoha.
Na ntụnye ya, onye e ji okwu ya agba izu bụ Chinedu Eze, kọwara ntụliaka ọkwa Gọvanọ nke steeti Imo dịka nke ga-akpụ ọkụ n'ọnụ, bụkwa nke ndị Naịjirịa niile na-ele anya mpụtara ya.
Eze guputara ọnunu ọkụ ọ na-anụ mmadụ ise a ị bụ Gọvanọ dịka nke nwere ike ime ndị mmadụ ghara ịpụta n'igwe n'ihi ụjọ.
Lee dịke ise a na-azọ ọkwa Gọvanọ; ebe ha nwere ike nakwa ebe ha gbara ọnyụpa:
1. EMEKA IHEDIOHA
Nwamamadị a ji aha otu Pati PDP azọ ọkwa Gọvanọ.
O jikwa aha otu pati a ma zokwaa ọkwa Gọvanọ n'afọ 2015, bụ nke Rochas Okorocha meriri. Ọ bụ onye Mbutu dị na kansulu Aboh Mbaise.
2. IFEANYI ARARAUME:
Onye a bụbu onye nnọchiteanya Okigwe n'ụlọ nzukọ Sineti, site n'afọ 1999-2007. Ọ zọọla ọkwa Gọvanọ site n'afọ 2007 rue n'afọ a n'otu pati dị iche iche.
Nwaamadị a si Isiebu nke kansulu Isiala Mbano a gbaala mbọ ịbụ Gọvanọ steeti Imo mana ọ nweghị isi.
O ji otu pati APGA azọ ọkwa Gọvanọ ka a na-ele anya na ọ ga-agbali na ntụliaka a, ọ kachasị na mpaghara ọgbọ nta vootu Okigwe bụ nke gụnyere, Isiala Mbano, EHIME MBANO, Okigwe, Onuimo, Ihitte-Uboma nakwa OBOWO.
3. IKEDI OHAKIM:
Onye a ji aha otu pati Accord azọ ọkwa Gọvanọ ma bụrụkwa Gọvanọ chịrị steeti Imo site n'afọ 2007 - 2011, a gbalịsiala ike iloghachita n'ọkwa Gọvanọ ichipu afọ anọ ọzọ kamgbe Rochas Okorocha Merichara ya.
Ọ ga-abụ ọgụ na mgba nye ya na nwanne ya bụ Ifeanyi Araraume nke APGA na mpaghara Okigwe bụ ebe ha ga-achipu ya.
Ihe mkpobi ụkwụ ọ ga-enweta gụnyere na ndị mmadụ a matachabeghi otu pati ahụ, ya nakwa ndị nkwado ya ụfọdụ na-esoghị ya banye na pati ọhụrụ a.
Ka osila dị, a na-ele anya na nwaamadi a nwekwara ohere inweta vootu n'ihi na akara pati a bụ nke mbụ n'akwụkwọ ntụliaka.
4. HOPE UZODIMMA
Hope ji aha otu pati APC azọ ọkwa Gọvanọ. Ọ bụ onye Ọmụma nke kansulu Oru East dị na mpaghara Ọlụ zone bụ nke kansulu iri na abụọ mejupụtara.
Ka ọ dị ugbu a, ọ bụ ya na-ọnọchita anya Ọlụ na Sineti. Ihe mkpobi ụkwụ ọ ga-enweta gụnyere ọgbaghara dị n'otu pati ya na steeti Imo, bụ nke mere onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari jiri gwa ndị steeti Imo oge ọ bịara achụmnta vootu n'ọnwa Febrụwarị ka ha tụnyere onye ọbụla obi ha nabatara na pati niile vootu maka ọkwa Gọvanọ. Ọ ga-enweta nsogbu ọzọ n'ihi ọgbaghara dị n'etiti ya Gọvanọ Okorocha bụkwa onye sikwa na ọgbọ nta vootu Ọlụ. Ka osila dị, a na-ele anya na ọ ga-enweta mmeri na kansulu Oru East.
5. UCHE NWOSU
Nwaamadi a ji aha Action Alliance, AA azọ ọkwa Gọvanọ bụ Ọgọ mbụ Gọvanọ Rochas nwere. Ọ bụ onye Eziama Obaire dị na Nkwerre, bụkwa nke dị n'ọgbọ nta vootu Ọlụ.
Ihe niile dịka ọ na-agara ya were were n'ihi oké nkwado ọgọ ya bụ Rochas na-enye ya. A na-ele anya na ọ ga enweta mmeri na Nkwerre, nakwa kansulu ndị ọzọ dị iche iche n'ihi mbọ otu pati ya gbara site n'enyemaka ọgọ ya nwoke. O nwere ike inweta mmeri na NJABA, Nwangele, Ideato North, Ideato South nakwa OHAJI EGBEMA. Ihe mkpobi ụkwụ o nwere gụnyere oku a na-akpọ ka e nwetu mpaghara Owerri ka ha weghara ọkwa Gọvanọ, nakwa nhuta ụfọdụ na-ahụta ya dịka mbiaghachi ọchịchị nke ugboro atọ nke Rochas Okorocha. A na-ele anya na ọ gaghị adị chara ya mfe n'ihi na ya na Hope Uzodimma ga-alụ ya ị ji mara mbe abụọ nke bụ oke.
Aka chịburu Akwa Ibom steeti ma bụrụ onye omeiwu n'ụlọomeiwu ukwu bụ Godswill Akpabio, ewepụla akwụkwọ o tinyeburu n'ụlọikpe banyere ịgbagha azọtaghị oche na ntuliaka gara aga.
Akpabio gwara ndị ntaakụkọ Channels TV nke a, kwuru na mwepụ a bụ ka ọ ghara imebi usoro ụlọikpe.
Ọkaikpe Valentine Ashi nke ụlọikpe ukwu nke Abụja, kwukwara na o wepụrụ ya bụ akwụkwọ.
Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka na Naịjirịa bụ EFCC, nwụchiri Uzoho Casmir bụ onye na-ejikọta akpa ego Imo steeti na mgbede a.
Ebubo ha boro ya bụ na o nyerela Rochas Okorocha bụ gọvanọ Imo steeti aka izuputa naịra otu ijeri na nde ise (N1.05bn), maka ntuliaka ọkwa gọvanọ a ga-eme echi.
Dịka ụlọntaakụkọ Punch si kwuo, ndị EFCC akpachiela akpa ego ebe e tinyere ego ndị ahụ.
Ka BBC Igbo kpọtụrụ Ebere Nzewuji bụ ọnụ na-ekwuchitere Okorocha n'ekwentị gbasara akụkọ a, o kwuru na ọ nụbeghi maka ya.
Ọ gwakwara onye ntaakụkọ anyị na ọ ga-ebu ụzọ n'ọnụ onye e boro ebubo, tupu o kwuo ihe ọbụla maka ya.
BBC Igbo kpọkukwara Tony Orilade, ọnụ na-ekwuchitere EFCC, o kwukwara na ọ bụ eziokwu na ndị otu ya nwụchiri Uzoho.
Nwunye onyeisiala Naijiria bụ Aisha Buhari adụọla di ya bụ Muhammadu Buhari na ndị APC ọdụ ka ha họpụta ndị bụ ndị patị ahụ n'ọrụ ọkwa ọchịchị.
Aisha kwuru nke a ụbọchị Tọọzde n'ọgbakọ ọ kpọrọ iji kelee ndị tụnyere ha vootu n' amaegwuregwu Daura Staduim.
O kwuru na iwu APC kwuru sị a na-eke ọrụ, ka e nye ndị doro anya na ha bụ ndị otu pati ha ọrụ.
O kelere ndị ụmụnwaanyị nakwa ndị ntorobịa maka vootu ha tụnyere Buhari ma kwe ha nkwa na ọ ga aga n'ihu idozi Naijiria.