You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ataala ụmụnwaanyị 100 ahụhụ maka izipu ụmụ ha ịrịọ arịrịọ

Akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ọnwa Febuwarị afọ 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ọtụtụ mmadụ anwụola n’ọkpọrọ mmanụ agbịdị gbara ọkụ

    Ọnụ na-ekwuru uweojii Imo steeti bụ ASP Henry Okoye kwuru na ọkpọrọ mmanụ agbịdị nwuru ọkụ n’okpuruọchịchị Ohaji/Egbema dị n'Imo steeti gbuo ọtụtụ mmadụ.

    Okoye gwara BBC na ọ bụ ndị oshi mmanụ agbịdị kpalịrị ya bụ ọkụ ka ha jere oshi mmanụ.

    O kwuru na ndi uweojii, ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ n’Imo steeti agbakọla aka ma malitela nyocha iji chọpụta ndị niile aka ha dị na ya bụ ihe.

    Akụkọ kwuru na ọbụ ọkpọrọ mmanụ ndị ụlọ mmanụ ‘Indoroama’ gbara ọkụ.

    Ọtụtụ ndị ọrụgbo bere akwa na ihe ndị ha kụrụ n’ubi ha emebiela maka ọkụ gbara.

    Ọnụ na-ekwuru ndị Ohaji/Egbema bụ Uzoma Francis kọwaara ndị ntaakụkọ etu ihe siri mee.

    N’okwu ya, ndị nwe ọkpọrọ mmanụ agbịdị ahụ gbawara bụ ‘Indorama’, ha enchewaghị ọkpọrọ ahụ etu kwesiri , anyị ji ọhiere a ezigara ‘Indorama’ ozi ka ha lebanye anya ma nye ọkpọrọ mmanụ ndị a nchekwa kwesiri’’

    O kwuru na ọbụrụ na elekọtara ọkpọrọ mmanụ ndị a anya nkeọma,ndị oshi mmanụ agaghị enwe ọhiere izu ohi ebe a hụ, agaghị enwe ndi nwụrụ anwụ.

  2. Hemant Soren: A nwụchciela onye bụbụ Mịnịsta maka nrụrụaka

    Ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka na mba India anwụchiela otu onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị anọghị na gọọmentị , ka ọ gachara awa ole na ole ọ gbara arụkwaghị dịka Mịnịsta na-ahụ maka Jharkhand steeti.

    A na-ebo Hemant Soren,onye otu pati Jharkhand Mukti Morcha (JMM) ,ebubo nrụrụaka mana ọ gọọrọ agụghọ n'ebubo ahụ.

    A nwụchiri na mgbede Wenezde ka a gbachara ya ajụjụ ọnụ awa asaa.

    Pati ya akpọpụtala mịnịsta na-ahụ maka njem bụ dịka onye ga-anọchi ya steeti ahụ dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ mba ahụ.

    Soren agbaghala nnwuchi ya n'Ụlọikpe Kachasị na mba India, sị na ọ bụ ọchụchụ ndọrọndọrọ ọchịchị ka a na-achụ ya.

  3. YouTube ehichapụla akara Emmanuel TV nke ụlọụka TB Joshua

    Ụlọọrụ mgbasaozi onyonyo a kpọrọ YouTube ehichapụla akara ụlọụka Emmanuel TV bụ ụlọụka Synagogue of All Nations (Scoan) nke onyeisi ya bụ TB Joshua larala mụọ. Ha kwuru na ha kachara akara ahụ maka okwu akpọmasị ha na-akwalite.

    Nke a na-eme ọtụtụ izuụka ka nyocha BBC na OpenDemocracy mere banyere TB Joshua bọlitere arụ banyere mmetọ ụmụnwaanyị na mmegbu Joshua ji ụa ya emegu ndị mmadụ.

    Emmanuel TV dị na YouTube so n'ihe bulitere ọkwa TB Joshua o ji bụrụ onye a ma ama n'ụwa niile.

    TB Joshua nwụrụ n'afọ 2021 mana nwunye ya bụ Evelyn Joshua bụzi onyeisi ụlọụka ya bụ Synagogue og All Nations (Scoan).

    O nwebeghi ihe ụlọụka ahụ kwuru maka mwepụ ahụ e wepụrụ akara ha mana ha ekwbuola na "ebubo megide onyeisi ha achịaghị aja".

    Ndị na-esobu Emmanuel TV na YouTube ruru ọkara otu nde ebe ha na enwete nde kwuru nde ndị na-ele onyonyo ha.

    Nke a bụ ugbo abụọ n'ime afọ atọ a na-ewepụ akara ha na YouTube maka ime ihe megidere iwu ndị YouTube.

    N'ime nyocha BBC, OpenDemocracy nyochara akara YouTube Emmanuel TV were chọpụta na e nwere onyonyo ruru 50 na-egosi mkpagbu dị na YouTube.

    Ha kpere onyonyo ndị ahụ n'aka YouTube nke mere YouTube jiri wepụ akara ha n'abalị 29 ọnwa Jenuwarị afọ 2024..

    N'okwu ha, YouTube nke Google nwe kwuru na ha "kachapụrụ Emmanuel TV maka na ha na-egosi ihe ndị na-akwado okwu akpọmasị nke megidere iwu"

  4. Gidi gidi bụ ugwu eze!

    Anyị ekele gị onye ọma na-esonye anyị ma na-anabata gị n'ọnwa ọhụrụ bụ ọnwa Febuwarị afọ 2024.

    ị ga-adị ka echi maka na echi anaghị agwụ agwụ.

    Ya gaziere gị n'orie, n'afọ, na nkwọ na eke.