You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ataala ụmụnwaanyị 100 ahụhụ maka izipu ụmụ ha ịrịọ arịrịọ

Akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ọnwa Febuwarị afọ 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Nwada na-anwa iji ụgbọala si London rue Legos abatala Afrrịka

    Pelumi Numbi bụ onye na-eme ihe onyonyo njem atụọla ụkwụ n'Afrịka dịka ọ na-anwa iji naanị ụgbọala eme ya bụ njem si London gawa Legọs.

    Ọ kwadoro ịme ya bụ ihe n'ime mba 17 ma rue Legos n'ime ọnwa abụọ.

    Lee etu njem ya ga-esi dị:

    Ọzara Sahara - Mauritania - Senegal- Gambia - Guinea Bissau - Guinea - Sierra Leone - Liberia - Mali - Burkina Faso - Ivory Coast - Ghana - Togo - Benin na Naịjirịa n'ikpeazụ.

    N'uche Nubi, ọ bụ ya bụ nwaanyị agbụrụ ojii ga-eme ụdịrị njem a mbụ.

    O setere ihe onyonyo n'akara Instagram ya gosiri ebe ọ na-atụ ụkwụ na mba Morocc.

  2. Anyị anaghị enye ndị ọchịehi ala ndị Uzo-Uwani - Gọọmentị Enugu steeti

    Gọọmentị Enugwu steeti apụtaala gọọ na o nweghi mgbe ha kwadoro inye ndị ọchịehi ala ndị Uzo Uwani ka ha jiri zụọ ehi ha.

    Cheta na akụkọ ma;itere iwu na soshal midia ọ kachasị X bụbu Twitter na gọọmentị steeti ahụ chọrọ ịresi ndị ọchịehi ala ukwu dị n'Uzo Uwani ka ha jiri zụọ ehi ha.

    N'ime ozi Dan Nwomeh bụ onye ndumodu pụrụiche nke Gọcanọ Peter Mbah wepụtara, ọ sị na ọ bụ atụmatụ gọọmentị gbasara nchekwa iji kwụsị ntọ na esemokwu ala dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị nkịtị.

    "Ọ bụ Ranch ọ bụhhị RUGA ka anyị na-eme " bụ ihe ozi ahụ kwuru.

    "Ebe gọọmentị kwụ doro anya, o teela aka ndị omekome na ndị ntọ na-ezo n'ime ọhịa anyị eji ya eme mpụ dị icheiche, ya mere ka gọọmentị kpebie ịmalite atụmatụ Ranching bụ etu e si achị ehi n'ọgbara ọhụrụ" bụ ihe ọzọ ozi ahụ kwukwara.

    Ha kpọrọ ndị mmadụ oku ka ha jiri nwayọ ghọta na ndịniche n'etiti Ranching na RUGA.

    N'iwu ọhụrụ ahụ, o nweghi eho maọbụ ọchị ehi ọbụla a ga-ekwe ka ọ na-agagharị etu o si sọ ya dịka ọ dị ugbua.

  3. Kelvin Kiptum bụ ọkaibe n'ọsọ ike agwụ nwamkpi anwụọla n'ihe mberede

    Nwafọ mba Kenye bụ ọkaibe n’ịgba ọsọ ike agwụ nwa mkpị bụ Kelvin Kiptum anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ n’obodo ha.

    Nwamadị a dị afọ 24 na onye nchịkọta ya bụ Gervais Hakizimana nke mba Rwanda nwụrụ n’okporoụzọ dị na mpaghara ndịda anyanwụ mba Kenya na Sọnde.

    Kiptum gbapụtara ihe n’afọ 2023 mgbe ọ maara ogbo ya bụ Eliud Kipchoge bụ otu n’ime ndị kachasị n’ọsọ ike agwụ nwa mkpi.

    Ọ bụ n’ọnwa Ọktọba afọ gara aga n’obodo Chicago ka Kiptum gbafere nturuugo Kipchoge nwetere n’ọsọ mgbe ọ gbara kilomita 42 n’ime awa abụọ na nkeji 35.

    A họpụtala mmadụ abụọ a dịka ndị ga-anọchiteanya Kenya n’asọmpi egwuregwu Olympics a ga-eme na Paris n’afọ a.

    Minista na-ahụ maka egwuregwu na mba Kenya bụ Abuba Namwamba mgbe ọ na-akwanye ugwu ikpeazụ ya kwuru na oke mmadu efunahụla ha n’ọdachi a.

    Onye ọzọ bụ Raila Odinga bụbu Praịm minister mba Kenya kwuru na ezigbo dike mba ha alaala mmụọ.

    Ihe mberede a mere n’elekere itoolu nke abalị ụbọchị Sọnde dịka ndị uweojii si kwuo site n’ihe ndị ntaakụkọ AFP dere.

    Ndị uweojii kwuru na ọ bụ Kiptum kwọ ụgbọala ahụ mgbe ọ gbapụrụ nke na o nweghi ike ịchịkwa ma kpugharịa gbuo ha abụọ nọ n’ime ya.

    Ha kwuru na onye nke atọ nọ n’ime ụgbọala ahụ bụ nwaanyị merụrụ ezigbote ahụ mana e bugara ya n’ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwo.

  4. Igbo ndị ọma kedụ ka unu mere?

    Anyị na-anabata unu n'izuụka ọhụrụ a na-asị ka ụbọchị a maara gị na mma.

    Buru oche bịa nọnyere anyị n'ọbaozi BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa nakwa n'ụwa.

  5. NDLEA anwụchiela nwaanyị dị ime ọnwa isii maka ibu ọgwụ ike

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide ọgwụ ike na Naịjirịa bụ 'National Drug Law Enforcement Agency' (NDLEA)

    anwụchiela otu nwaanyị dị ime onwa isii maka ebubo na ọ na-atụ mgbere ọgwụ ike.

    Anwụchirị Amarachi Akaolisa gbara afọ iri abụọ na ise n’Ọraifite dị n'okpuru ọchịchị Ekwusigo nke Anambra Steeti na nso nso a.

    Ọgwụ ike ndị ahụrụ n’aka ya bụ 'Cannabis' arụ ya dị kilogram 1.850 na mkpụrụ ‘Tramadol’ arụ ya dị gram 6.

    Ndị ọzọ ha nwụchiri bụ nwaanyị mụrụ ụmụaka atọ, ụmụnwaanyị atọ ndị ọzọ, otu nwoke gbara afọ 42 na mmadụ iri abụọ na otu ndị ọzọ.

    Ụlọọrụ a malitere ọrụ na Naịjirịa n’afọ 1989 dịka ọrụ ha bụ ịnwụchi ndị na-atụ mgbereahịa ọgwụ ike ma hụ na o nweghị ndị na-aṅụ ya bụ ọgwụ na Naịjirịa.

    Ha na-eme nke a site na nnyocha pụrụ iche na inyopu ndị aka ha dị n’ihe gbasara ọgwụ ike na Naịjirịa. Onyeisi ya ugbua bụ Mohammed Buba Marwa.

  6. Ndị ihe ejije Nollywood emepeela ọdọ nkiri ejije Igbo n'Ebonyi

    Ndị ihe ejije Nollywood agbapela ebe ihe nkịrị sinema Igbo n'Ebonyi Steeti.

    Ochie dike n'ihe ejije Nollywood bụ Pet Edochie kwuru na memme ahụ e mere n'ụbọchị Satọde n'Abakaliki ga-akpalite mmụọ ndị Igbo na mma dị n'omenala Igbo.

    Aka na-achị steeti ahụ bụ Francis Ogbonna Nwifuru kelere ndị Nollywood maka inye aka n'ikwalite omenala Igbo, sị na ọ bụ omenala bụ ihe e ji mara ndị ma bụrụkwa ihe e ji ejikọ ndị mmadụ.

    Ndị Nollywood a na-anụ aha ha bịara mmemme ahụ e mere na 'Ecumenical Centre' Abakaliki gụnyere ; Kanayo O. Kanayo, Patience Ozokwor, ,Chinwetara Agu, Nkiru Sylvanus, Chacha Ekena ndị ọzọ.

  7. 'Ụgwọọnwa ọnwa ise m dịka 'professor' agaghị agbatanwuru mohere ifega Abidjan kirie asọmpi Afcon ikpeazụ'

    Onye ọkammụta iwu bụ Joy Ezeilo atọọla arịrị maka ọnọdụ ndakpọ akụnaụba na mgbali elu dọla si metụta ihe nile ọbụladị ohere ịga dọnyere Ndị Super Eagles ukwu n’ asọmpi Afcon na-aga ugbua na mba Aịviri Kost.

    N’ozi o wepụtara n’akara ọbaọzi ya na’X, onye nkuzi mahadum ahụ ama ama maka ịgba mbọ maka kike dịịrị ụmụnwaanyị kwuru na ya chọrọ m ifega Aiviri Kost ikiri asọmpi Ikpeazụ ga-akpọtụ n’etiti Ugo Naijiria naEnyi ndị Aiviri Kost Ụbọchịụka, “ M jụọ onye ahịa na-azụrụ m tiketị, gwara m na ọ bụ N2,183,000(Naira nde abụọ, otu narị iri asatọ na puku atọ ) uje na ụla. Ịga Aiviri Kost na-ewe otu awa na nkeji iri atọ na ise. Ọ gbara m gharịị, m were gbakọọ, wepụ were chọpụta na ọ ga-ewe m ụgwọọnwa ọnwa ise m dịka ọkammụta Iwu inweta ego uje na ụla. Nke a gosiri ọnọdụ akụnaụba ala anyị ugbua.”

  8. Tinubu ebinyela aka n'iwu ọkụ latrik

    Onyeisiala Naijiria bụ Bola Tinubu ebinyela aka n'akwụkwọ iwu maka ọkụ latrik nke Bekee kpọrọ, "Electricity Act (Amendment) Bill, 2024."

    Ọnụ na-ekwuru onyeisisala bụ Ajuri Ngelale, gbara ama a n'ozi mgbasaozi o binyere aka ma wepụta ụbọchị Fraide.

    Iwe ọkụ lattrik ahụ ahazigharịị bụ iji hụ maka ọdịmma obodo ndị ụlọọrụ na-arụpụta ọkụ latrik(GENCOs) nọ ma nye ha pasent ise n'ego a na-erite ire ọkụ.

    Cheta na n'abalị 27 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2024, ndị Ụlọnnochiteanya binyere aka n'iwu ahụ, ene Ụlọomeiwu Ukwu binyere ya aka n'abalị 14 nke Ọnwaa Novemba afọ 2023.

    Ọ bụ omeiwu na-anọchite mpaghara Ikorodu n'Ụụlọomeiwu Etiti bụ Babajimi Benson,bulieter okwu ahụ n'ọgbakọ ndị omeiwu.

  9. 'Akọnuche m zuruoke' - Biden asagwarala onye ndụmọdụ pụrụiche, Onyeisi mba Amerịka bụ Joe Biden ejirila iwe sagwara nchọpụta e mere na o dozighị akwụkwọ nzuzo ma kwuo na ọ na-anwa icheta ihe ndị mere na ndụ ya.

    Na nkwurita ụka na-atụghị anya o mere n'abalị Tọzde Onyeisiala Biden kwusịrị ike na "Akọnuche m zuruoke."

    Ọ manyere okwu n'ihe e kwuru na ọ chetaghị mgbe nwa ya nwoke nwụrụ, sị: "Kee ka ọ ga-esi jiri ọnwụ ọpara ya mee ihw ime atụ?"

    Nchọpụta a hụrụ na Onyeisiala Biden "ma ụma wepụta akwụkwọ nzuzo e kwesịrị idobe" akwụkwọ nzuzo ndị a, mana ha achọghị ịkpọpụta ya n'ụlọikpe.

    Onye ngalaba ikpe bụ Robert Hur sị na Onyeisiala Biden edozighị akụkwwọ ụfọdụ gbasara ndị agha makwa ndị mba ọzọ n'Afghanistan ka ọ rụchara ọrụ dịka osote Onyeisiala.

    Akwụkwọ nchọpụta a nwere ihuakwụkwọ 345, e wepụtara n'ụtụtụ Tozde 8 Febụwarị sị na ncheta Onyeisiala "ezuchaghị oke".

    Maazị Hur jiri elekere ise gba Onyeisiala mba Amerịka dị afọ 81 ajụjụọnụ dịka a na-eme nchọpụta.

  10. Kwewe nu nkwa na egwu njirimara Naịjirịa mgbe ọbụla a na-eme nzụkọ ọha. - Onyeisiala Bola Tinubu

    Nke a ga-eme ka e weghachị nsọpụrụ ndị mba Naịjirịa kwesịrị inwe ebe ihe njirimara mba Naịjirịa makwa ka e mee ka e nwe nsọpụrụ ebe ihe niile e jiri mara Naịjirịa nọ,” nke a si n'ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Ajuri Ngelale kwuru n'ụbọchị Tọzde.

  11. Ụtụtụ ọma Igbo ndị ọma..., Ngwụcha izu a agaghị abụrụ gị ngwụcha ngọzị Chukwu na ndụ gị!!!

    Lee nu akụkọ ndị na-ewu na mba ụwa niile.

  12. Agbachiela ụlọọgwụ na-agba mgbere nwa ọhụrụ ma zọpụta ụmụaka ise dị ime

    Ndị ọrụ nchekwa wakporo ma zọpụta umu agbọghọbịa ise n’ ịme ụlọ ọrụ ebe ana atụ mgbere umuaka n'okpuru ọchịchị Oyi dị na Anambra steeti.

    Ndị ọrụ nchekwa na mkpaghara southeast, na ndị ngaraba ọrụ na ahu maka ahuịke n’ Anambra steetị mere ka azọpụta mmadu ịse ndịa.

    Kọmịsịọna na ahu maka arụịke na Anambra steetị, Dọkịnta Afam Obidike gwara ndị nta akuko na ndịahu anaenyo-enyo na arụ orụ dịka ụlọọgwu mana ha na ezu ụmụaka.

    Ọ kọwara ụlọ ọrụ ahụ dị ka 'Mother and Child Hospital and Maternity’ dị n'okporo ụzọ, n'akụkụ mahadum Tanzania, Umunya.

    Anyị chọputara ma ọtụtụ ụlọọgwụ adịgbọrọja, aha ha adighị na akwukwo gọọmentị juru na Anambra. Anyị enweputara ndekọ a ga ejị dee aha ụlọọgwụ nịle dị na Anambra.

    Nke a ga eme ga ndị be anyi nwee ezị arụịke “Na otu ụlọọgwụ anyị gara, anyị chọpụtara na aha ha adighị na akwukwo gọọmentị.

    Ha adighị na ndekọ anya”. ọgbakwunyere na ndị nọọsụ asaa nọ ọrụ mgbe ha bịara na ụlọogwụ ahụ gbara ọsọ.

    Okwuru na ndị azọpụtara na ụlọọgwụ ahụ dị bịdọ na afọ ịri na anọ ruọ na afọ ịrịabụọ na ọtu.

    “Ụlọ ọgwụ ahụ edeghị ahan na akwụkwọ gọọmentị, anyị na-enyo enyo na ọnwere ịhe adịgbọrọja na eme ebeahu.

    Ya mere, anyị kpebiri ịhụ naanị nnukwu dọkịta n'ụlọ ọgwụ na ndị nọọsụ asaa ahụ na arụ ọrụ ebeahu”.

  13. Ijeoma Nneke: Ụlọikpe amaala onye gburu nwagbọghọ 'makeup artist' ikpe ọnwụ

    Ụlọikpe Ukwu dị n'Enugwu Steeti amaala otu nwaanyị ikpe ọnwụ maka ọnwụ otu nwaagbọghọ ọrụ ya bụ itechasị ndị mmadụ.

    N'ikpe e kpere n'abalị asaa nke ọnwa Febụwarị, afọ 2024,Ọkaikpe Jọstịs K. I Okpe, onye kwuru na ikpe mara Chiamaka Ifezue nyere mkpebi ka a kwụgbụọ ya maka ogbugbu Ijeoma Nneke gbara afọ 27 bụ onye e gburu n'abalị 11 nke afọ.

    Cheta na n'afọ 2020, akụkọ fegharịrị na soshal midia kwuru na a na-a chọwa Nneke achọ dịka o kwuchara na o nwetara ọrụ ịga techa mmadụ n'ụlọ ya.

    A hụrụ ozu ya ka abalị ole na ole gachara nke mere ka ndị uweojii malite nnyocha ihe gburu ya nke dugara ha na ụmụnne abụọ;otu nwoke na ootu nwaanyị bụ ndị a kpụpụrụ ụlọikpe maka ebubo na ha manyere nwada ahụ lara mmụọ ọ ṅụọ nsi

    Mana e mechara tọhapụ nwanne Chimaka nke nwoke.

  14. Anwụchiela ndị omeiwu atọ n'ogbaghara ntuliaka mba Senegal

    Anwụchiela ndị omeiwu atọ n'ogbaghara dapụtara na mkpebi ndị omeiwu mba Senegal mere iyighari ntuliaka mba ahụ rue ọnwa Disemba.

    Ọnụ na-ekwuru ọgbakọ otu ndị anọghị n'ọchịchị bụ El Malick Ndiaye gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters na anwụchiri ndị otu ha atọ n'ụbọchị Tuusde.

    Cheta na n'ụbọchị Monde, ndị omeiwu nyere ikike ituliaka ịmara ma a ga-akwado ọchịchọ onyeisiala n'iyighari ntuliaka mba ahụ dịka a chụpụrụ ụfọdụ ndị omeiwu n'oche ha maka esemokwu malitere n'etiti ha.

    Ndọtị ntuliaka a e mere na Senegal ebutela ọgbaghara na nsogbu dịka ọnọdụ ahụ na-echekasị mba ndị ọzọ ahụ.

    Ọgbakọ mba ndị ọdịda anyanwụ Afrịka bu ECOWAS agwala ndị ndọrọndọrọ mba ahụ ha mee ngwangwa wepụta ụbọchị ntuliaka ọhụrụ nke iwu ala ha kwadoro.

  15. Sebastián Piñera, aka chịburu Chile anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu

    Aka chịburu mba Chile bụ Sebastián Piñera, anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu helịkọpta kpọkasịrị ka ọ gbachara afọ 74.

    Piñera, onye chịrị agba abụọ ma bụrụ ojiegoachụego bara ọgaranya na-efe onwe ya ụgbọelu mana o doghị anya maọbụ ya kwọ ụgbọelu ahụ dara ụbọchị Tuzde n' Lago Ranco.

    Mmadụ atọ ndị ọzọ so na ụgbọelu ahụ ji isi ha pụta.

    Ugbua, mba ahụ na-akwa arịị maka ọnwụ ya, dịka ndị mmadụ na-ekwupụta ihe ha ma banyere ya.

    A ma ya dịka onye hụụ na a zọpụtara ndị ọrụ mgwupụta ọnatarachi tọrọ n'ime ụmị abalị 69 n'ịkpa Atacama n'afọ 2010.

    N'agba mbụ nke ọchịchị ya bụ n'agbata afọ 2010 rue 2014, ọ kwaliere nto akụnaụba mba ahụ.

    Mana n'agba nke abụịọ ya malitere n'afọ 2018 rue afọ 2023, ọgbaghara dara ebe nile.

    Ka ọ dị ugbua, ndị aghammiri ma Chile, dịka akwụkwọ akụkọ mba Spen bụ El País, si kwuo.

    Onyeisial Chile bụ Gabriel Boric, bu onye kpọrọ oku iru ụjụ abalị atọ, kọwara Pinera sị,

    "Anyị nile bụ Chile, anyị chesịrị ị na-arọ nrọ ya , na-ese ya ma na-akwalite ya."

    "Sebastián Piñera kwuru nke a oge ọbanyere n'ọkwa onyeisiala agba nke abụọ ya n'abalị 11 nke ọnwa Maachị, 2018.

    Anyị na-amakụ ndị ezịnaụlọ ya mba n'oge a ọ gbajuru dọọrọ ha."

  16. Otu Hamas enyela ọsịsa n'atụmatụ ịkwụsị nkwarịta mgbọ n'etiti ha na Isreal

    Hamas ekwuola na ha azaghachịla atụmatụ ndị e hiwere maka ịkwụsị nkwarịta mgbọ dị n’etiti ha na mba Isreal n’obodo Gaza.

    A matabeghi n’uju ihe ndị nọ n’atụmatụ a nke mba Isreal, Amerịka, Qatar nakwa Egypt gbakọtara aka hazie.

    E kwuburu na ọ gụnyere nkwerikọta izuụka isii, bụ mgbe a ga-eji isi ndị Isreal e ji eji gbanwere na ndị Palestine a tụrụ mkpọrọ.

    Mba Isreal na Amerịka kwuru na ha na-eleba anya na nzaghachị otu Hamas nyere.

    Odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Antony Blinken bụ nọ na mpaghara Middle East ugbua kwuru na ya na ndị ọrụ mba Isreal ga-akparịtaụka banyere nzaghachị ahụ na Wenezde.

    Na-agbanyeghi na Blinken ekwubeghi uche Amerịka banyere ọsịsa ahụ mana Onyeisiala Joe Biden kwuru na “ọ situkwara ike” – ma kwuo na ọ gaghị adịrị ndị ndu mba Isreal mfe ịnabatacha ihe ndị otu a na-achọ.

    Otu onye ọkwa ya dị elu n’otu Hamas gwara BBC na ha enyela ‘ọhụhụ dị mma’ na nzaghachị atụmatụ ma sị ka e mezitụ ụfọdụ ihe e dere maka iwugharị obodo Gaza, nlọghachị ndị bi ebe ahụ nakwa nrọpụta nye ndị a chụpụrụ n’ụlọ ha.

    O kwuru na Hamas sị ka e nwee mgbanwe banyere etu e si agwọ ndị merụrụ ahụ gụnyere nlọghachị ha nakwa ibuga ha n’ụlọọgwụ.

    E zigaara Hamas atụmatụ a n’izuụka gara aga mana otu n’ime ha gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters na ụfọdụ ihe ndị nọ n’ime ya edochaghị anya na ọ bụ ya mere ha jiri azaghachị n’ụbọchị Tuzde.

    Praịm minista mba Qatar akọwaala ọsịsa a Hamas nyere dịka ihe “dị mma” gbaa gburu gburu.

    Ọgbaghara dị na Gaza ugbua bụ site na mwakpo ndị Hamas bu egbe wakporo mpaghara Ndịda Isreal n’ụbọchị 7 Ọktoba 2023 nke e gburu ihe ruru mmadụ 1,300 ebe a tọọrọ 250.

    E gbuola mmadụ 27,500 na Gaza kamgbe ahụ dịka ministri ahụike na Gaza si kwuo.

  17. Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ daalụ nụ ooo!

    Anyị ji aka na unu hiri ma teta ụra ọfụma?

    Biko buru oche gị bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo taa maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.

  18. Agbachiela Mahadum Michael Okpara dịka ụmụ akwụkwọ mechara ngagharịiwe

    Akwụsịla ihe niile gbasara agụmakwụkwọ na Mahadum Michael Ọkpara dị n'Abia steeti taa dịka ụmụ akwụkwọ mechara ngagharị iwe.

    Ọnụ na-ekwuru ya bụ Mahadum bụ Patrick Oparah gwara BBC na ọ bụ eziokwu na ngagharịiwe mere

    Ọ sị na ọ bụ mgbe ụmụ akwụkwọ na-ele ule ka abatara chụpụ ndị akwụbeghi ụgwọ akwụkwọ ọhụrụ.

    Nke a gbara ụmụ akwụkwọ iwe nke mere ka ha nọchie ụgbọala onyeisi Mahadum ahụ bụ Ọkammụta Maduebibisi Ofo Iwe.

    Oparah kwukwara na o nweghị ihe ụmụakwukwọ ahụ mebiri dịka ha na-eme ngagharị iwe. "Amabeghi mgbe a ga-agbape Mahadum ahụ" ka Oparah kwuru.

    Ọkammụta Iwe na onwe ya eziputala ozi gbasara ihe mere.

    Ọ sị na ọ bụ ndị agboro batara n'ime ụlọ akwụkwọ ahụ ma nwaa iwakpo ya na ndị ọrụ ya.

    Ọzọ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Maureen Chinaka kwuru na ha ma maka ya bụ ngagharị iwe.

    N'ozi o wepụtara, ọ sị na ebe niile dara jụụ ugbua.

  19. Aka akparala ndị ọmekọme na-atọrọ ndị mmadụ n'Abuja

    Ndi uweojii Abuja anwụchiela ndị ekperima napụrụ ndi bi n’Abuja ụra nanya site na na ịtọrọ mmadụ na izu ohi n'ogbe ahụ.

    Aha ndị anwụchiri bụ Buhari Muhammad bụ nwoke gbara afo 20, Muhammad Sabiu bụ nwoke gbara afo 20, Isah Abdullahi bu nwoke gbara afo 21, Hamzat Musa bụ nwoke dị afọ 21, Fatimah Abdullahi bụ nwaanyị gbara afọ 22 na Zuliat Yusuf bụ nwaanyị dị afọ 23.

    Anwụchịrị ha n’ụlọndila dị na obodo Bassa n'Abuja.

    Ndị ekperima a bụ ha tọọrọ nwoke aha ya bụ Joshua Eze onye mgbọ egbe tụrụ nwụnye ya bụ Blessing Eze mgbe a biara ịtọrọ di ya na 27 Jenụwarị nke2024.Ndị uweojii mechara chọta Joshua na 28 Jenụwarị nke 2024.

    Ihe ndị enwetere n’aka ha bụ otu egbe AK47, ekwentị iri, ego ruru puku naira atọ na iri anọ na ise (#340,000) ahụrụ ihe ndị ọzọ dara ọnụ ego n’aka ha.

    Ha saraasisa ma kwupụta ihe arụ niile ha mere n’ọgbe ahụ.

    Ka nyocha ka na-aga n’iru, Kọmịshọna uweojii Abuja bụ CP Bennedith C Igweh gwara mmadụ niile na ya kwdọrọ ụkwụ ịhụ na achụrụ ndị ọmekọme n’Abuja ọsọ ọkpa aruala ma hụ na ndị bị n’ọgbe ahụ ga ehiụrụ na-eweghị ụjọ ọbula.

  20. EFCC awụchịela ụkọchukwu maka ebubo igwu ndị mmadụ ego dị N1.3bn

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) anwụchiela otu ụkọchukwu bụ Apostle Theophilus Oloche Ebonyi maka ịkapu ndị ụka, na ndị ọzọ na-esọ ya egọ karịrị otu ijeri naira (N1.3bn).

    Ụlọọrụ EFCC na-akọwa na Theophilus Oloche Ebonyi jịrị ego enyemaka na-abụghị adịgboroja, nke ọ gwara ndị mmadụ na ọ bụ ego sitere n'aka ụlọọrụ Ford Foundation were ghọgbuo ma napụ ha ego ahu.

    Na nkwupụta ụlọọrụ EFCC mere n'ubochi Monde, kwuru na onyeịsị ụlọọụka ‘Faith On The Rock Ministry International’ ka e boro ebubo na ọ ghọgburu ndị uka, na ndị na esọ ya, site n'ọrụ ntinye aka NGO ya a kpọrọ (Theobarth Global Foundation).

    EEFCC na-ekwu na Ebonyi gwara otutu mmadu na Ford Foundation na-enye ndị ọhanaeze onyinye ego ruru $20,000,000.000 ( Ijeri dollar ịrị abuo).

    E boro ya ebubo na ọ gwara ndị mmadu ka ha jịrị ego ruru otu nde na puku naịra asatọ were debanye aha ha na ndị ga-erite ego enyemaka ndị ford foundation.

    Mana “Nnyocha ụlọọrụ EFCC mere gosiri na Ford Foundation na ụkọchukwu ahu enweghị njịkọ, mmekọrịta ma ọ bụ azụmaahịa.

    Ndị Ford kwuru na ha amaghi onye ụkọchukwu ahụ bụ. EFCC chọpụtakwara ụlọ ise ụkọchukwu ahụ zutara site n'ego mpụ ahu”. EFCC kwuru na “Ebonyi ka na-agba ndị debanyere aha inweta ịhe ọnyịnye ahu ụgwọ na soshal midia.

    Ha kọwara na a ga-akpụpụ ya n'ụloikpe ngwa ngwa ma ha mechaa nyocha