You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ataala ụmụnwaanyị 100 ahụhụ maka izipu ụmụ ha ịrịọ arịrịọ

Akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ọnwa Febuwarị afọ 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. A machiela ịntanetị dịka ngagharịiwe na-eme na mba Senegal

    Gọọmenti mba Senegal kwuru na ha machie ịntanetị maka ngagharịiwe ụmụafọ obodo ahụ na-eme megide Onyeisiala ha bụ Macky Sall.

    N’ụbọchị Sọnde, ndị Senegal malitere ime ngagharịiwe megide Onyeisiala Macky Sall maka na ọ gbatịkwuru oge ha kwesịrị ime ntuliaka onyeisiala.

    Minista mgbasaozi ha kwuru na mkpebi ịmachie ịntanetị bụ maka ọtụtụ ozi ụgha na akpọrọmasị a na-ekesa na soshal midia nke na-emetụta ọha.

    Ndị mba Senegal na-akwado ime ngagharịiwe a na-aga n’ihu malite n’ụbọchị Mọnde dịka ndị omeiwu na-achọ iwepụta atụmatụ etu e si ahazie ntuliaka ahụ na 25 Ọgọọst.

    Mba Senegal kwesịburu inwe ntuliaka ha n’ụbọchị 25 Febụwarị 2024 mana ihe gbanwere mgbe a tụrụ arọ ịgbatịkwu oge ya.

    Dịka nzuzu mgbatị a na-aga n’ihu, pati ndị na-anọghị n’ọchịchị kpokọtara ndị mmadụ ka ha kwụsị atụmatụ ịgbatịkwu oge ntuliaka ahụ.

    A nwụchiela ọtụtụ ndị so na-eme ngagharịiwe a dịka ndị ụlọọrụ ndị nchekwa zipuru ndị ọrụ ha.

    Ọ bụru na mgbatịkwu oge ntuliaka a kwụrụ, ọ pụtara na onyeisiala Macky Sall ga-anọ n’ọkwa ọchịchị ruo oge ahụ.

    Ọ bụ atụmatụ Onyeisiala ịnọ n’ọkwa ọchịchị a butere oke iwu dị ọtụtụ ndị mmadụ n’obi nke butere ngagharịiwe.

  2. Lee ihe anyị ma maka ụgbọala ndị ekperima nwụchiri n’uzo Kogi ma tọọrọ ndị nọ n’ime ha

    Ọnụ na-ekwuru uweojii Kogi steeti bụ SP Willaims Ovye Aya ekwuola na ọbụ eziokwu na ndị ntọ nwụchịrị ụgbọala ‘God is Good Motors‘ na ‘ABC Transport’ n’uzo Kogi steeti ma tọọrọ ndị nọ n’ime ha ka ha na-eme njem aga Abuja.

    Otu nwoke aha ya bụ Chude Nnamdi dere n’ọbaozị X bụbụ 'Twitter' etu nwoke nwụnye ya sọ banyere ụgbọala ahụ siri kwuru na ndị ntọọ ji ekwentị nwụnye ya kpọọ ya n’ụtụtụ taa.

    SP Williams gwara BBC na ya bụ ihe mere n’ezi Inele Eteke Ogugu dị na Olamaboro, o kwuru na ndị uweojii, ndị ọrụ nchekwa ime obodo na ndị dinta abanyela ọhia ịchọta ha.

    Akụkọ kwuru na ụgbọala ndi ahụ si Umuahia Abia steeti aga Abuja tupu a nwụchie ha n’uzo Kogi ma kpọrọ ha tinye isi n’ọhịa.

    Dịka SP Williams siri kwu, akabeghị mata mmadụ ole atọọrọ.

    N’okwu ya ‘’Kọmịshọna uweeojii nke Kogi steeti ezigaala ndị ọrụ nchekwa pụrụiche ebe ihe mere, ha ga agahiarị n’ime ọhịa ma hụ na a chọtara mmadụ niile atọọrọ na-eweghị ọkọ kọrọ ha’’

    Otu onyeọrụ ‘God is Good motors’ gwara BBC na ihe dị etụ a mere-eme n'ezie.

    N’otu aka ahụ, onyeọrụ‘ABC transport’ kwuru na ha akabeghị nwete ozi doroanya gbasara ihe mere mana okwughị maọbụ eziokwu ka ọbụ ụgha.

    Uzo Ajakuta, Okene na Lokoja abụrụla ebe eji ntọọrị mmadụ na ihe ike mara na Kogi steeti.

    Cheta na Disemba 2023,ndị uweojii kwuru na ha napụtara mmadu iri na otu n’aka ndị ntọọrị mmadụ n’uzo dị n’agbata Ajaokuta na Itobe dị na Kogi steeti.

  3. Burkina Faso amalitela ịgba ụmụaka ọgwụ mgbochi ọrịa Ịba

    Burkina Faso anabatala ọgwụ mgbochi ịba (RTS,S) nke ụlọọrụ ahụike mba ụwa ‘World Health Organisation’ wepụtara.

    Ihe ọpụtara bụ na ụmuaka gaa ụlọọgwụ ịnata ọgwụ mgbọchi, ha ga-anata kụ nke ga-egbochi ha ibute ọrịa iba.

    N’afọ 2021, ‘World Health Organisation’ chọpụtara na enwere mmadụ nde iri na atọ na-arịọ ọrịa ịba na Burkina Faso- ihe nke a pụtara bụ na,n’ime otu puku mmadụ nọ na mba ahụ, enwere mmadụ narị ise na iri isii na itoolu (569) na-arịa ọrịa Ịba.

    Agba ọgwụ mbụ ewepụtara kwadoro ụkwụ n’ịrụte ụmụaka 250,000 nọ n’agbata ọnwa ise ruo otu afọ na ụlọọgwụ iri abụọ na isii dịna Burkina Faso.

    Dọkita Issa Oue’draogo bụ onye na-elekọta ụlọọrụ ahụike na adimọcha mba Burkina Faso kọwara na akụkụ obodo ha họpụtara dịka ndị ga-aebuuzo nata ọgwụ a bụ ebe akachasị nwe ọnọdụ ịba na ọnwụ ndị mmadụ sitere na ọrịa Ịba kwaafọ.

    Ọ kọwara na ha ga-agbadọ ụkwụ n'akụkụ ebe ọrịa ahụ kacha egbu ụmụaka, site na i nye-aka kwalite ahụịke ụmụaka ruru pacentị 95 n’ọgbe ndị ahụ.

    N’ọnwa garaaga Kameruon malitere atụmatụ ọgwụ mgbochi ịba dịka mba mbu n’ụwa niile.

    Ụlọọrụ na ahụ maka ọgwụ mgbochi n’ụwa bụ ‘Global Vaccine Alliance’ kwuru na mba iri na ise na-eme njikere isonye na ya bụ atụmatụ n’afọ a.

  4. Ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe na Niger steeti

    Ndị isiobodo Niger steeti bụ Minna apụtala mee ngagharịiwe maka ọnọdụ ọjọọ obibi dakwasiri ha.

    Dịka ihe si kwụrụ ha nọchiri ụzọ na-agụ egwu nzogbu nzogbu iji gosi iwe ha.

    Ndị ahụ, nke ụmụaka na ụmụnwaanyị ka nku n'etiti ha gwara BBC na ha nọchiri ụzọ maka ọnụ ego ngwa nri n'ahịa nakwa nkịtị gọọmentị gbachiri iji gbatara ha ọsọ enyemaka mere ha ji mee nke a.

    Ha sị na ha chọrọ ịnọchi ụzọ ka gọọmentị nwe ike nụrụ olu ha na akwa ha na-ebe.

    Yakubu Garba bụ osote aka na-achị steeti ahụ rịọrọ ndị ahụ ha nwee ndidi. Ọ sị na gọọmentị ma na ihe akwanyela njọ kemgbe ewepụrụ subsidy.

    O kwukwara na gọọmentị na-arụsị ọrụ ike iji chọpụta ụzọ a ga-eji belata ahụhụ ndị mmadụ mana ọ kọwaghị etu a ga-esi mee ya.

  5. Nchịkọta etu ntuliaka mgbakwunye si gaa na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec hibere ntuliaka n’ụfọdụ ebe na Naịjirịa n’ụbọchị Satọde gara aga.

    Steeti ebe ndị e mere ntuliaka mgbakwunye a gụnyere Ebonyi steeti, Anambra steeti, Kano steeti, Plateau steet nakwa Akwa Ibom.

    Enugwu steeti

    Akụkọ pụtara na-ekwu na e nwere nsogbu ụfọdụ ebe dịka ndị mmadụ pụtara igosi iwe n’Imufu dị n’okpuruọchịchị Igboeze Not na-ekwu ka Inec wepụta akwụkwọ mputara ntuliaka ezigbo.

    Iwe ha bụ na Inec ebughi ngwa ntuliaka bịa n’oge n’ụfọdụ ebe ma gbara aka akwụkwọ mpụtara ntuliaka n’ebe ndị ha gara dịka ụlọntaakụọ Punch si kọ.

    Nke a mere ka ndị mmadụ jụ ịtụ vootu n’ebe ahụ rue mgbe Inec mere ka ha si chọ.

    Mgbe BBC kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru Inec na steeti ahụ bụ Rex Achumie, o kwuru na o nweghi ihe mere n’Igboeze Nọt dịka ntuliaka gara n’ihu ebe ahụ akpọpụta onye meriri bụ Atigwe Simon nke PDP.

    Achumie si na akwụsịtụrụ ntuliaka obere oge n’Enugwu South dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nọ ebe ahụ malitere inye nsogbu.

    “Ọ bụ ha zupuru akwụkwo mpụtara ntuliaka na-ekwusi ike si wepụta ya ebe ọ dị, Kọmịshọna anyị gara ebe ahụ ibelata okwu mana ha azaghị ya” ka o kwuru.

    Dịka ihe si kwụrụ, amabeghi mgbe a ga-eji metọpụ ntuliaka ahụ.

    Plateau steeti

    Ihe ịtụ anya mere na Plateau steeti dịka Pam Dachungyang nke ADP meriri ọkwa ụlọomeiwu etiti nke steeti ahụ ebe Daniel Asama Ago nke otu Labour Party meriri ọkwa nke ụlọomeiwu nta nke etiti.

    Dachungyang ji vootu 122,442 rite ya bụ ọkwa dịka onye otu ya nke APC bụ Chris Giwa wetara naanị vootu 39,132.

    Asama Ago ji vootu 66,442 rite ya bụ ọkwa dịka onye otu ya n’otu PRP bụ Adamu Alkali ji vootu 61,670 soro ya n’azụ.

    A kwụsịtụrụ ntuliaka na Kano nakwa Akwa Ibom maka ọgbaghara

    Dịka INEC siri kwuo, na steeti Akwa Ibom, Inec kwuru na a kwụsịtụrụ ntuliaka n'ọgbọ atụmvootu ngalaba ntuliaka abụọ (Village Hall, EdemUrua 003 na Ini LGA na Village Hall Mbiabong Ikot Udo 003 na Ikono LGA) ebe ndị ọchụchụ chụpụrụ ihe niile e ji eme ntuli aka.

    Maka mpaghara Kunchi/Tsanyawa steeti dị na Kano steeti, INEC kwuru na amachibidoro ntuli aka na ngalaba ntụli aka iri dị na Kunchi LGA n'ihi mbuso agha, imebi ihe, na ịkpaghasị ndị ntọ.

    Inec kwuru na mkpebi ya dabara na nkebi nke 24(3) nke iwu ntuliaka, 2022.

    Anambra steeti

    Na ntuliaka ndị e mere n’Anambra steeti o nweghi akụkọ nsogbu maọbụ ọgbaghara dapụtara na ya.

    Inec kpọpụtara aha Chinwe Nnabuife dịka onye meriri ya bụ ọkwa dịka o ji vootu 14416 rite oche Orumba North na Orumba South nke steeti ahụ.

    Cheta na akpọbuola aha Nnabuife na ọ bụ ya meriri ntuliaka ahụ mbụ mana onye otu ya bụ Okwudili Ezenwankwo nke PDP gara ụlọikpe iji gosi na o kweghi na mpụtara ahụ.

    Ụlọikpe nyere iwu ka emegharịa ntuliaka ahụ nke gosiri na ọ bụ Nnabuife meriri ọzọ.

  6. Ọkụ agbagbuola mmadụ 112 n’oke ọhịa dị na Chile

    Ihe karịrị mmadụ 112 anwụọla n’ọkụ gbara n’oke ọhịa dị na mpaghara Valparaiso nke mba Chile dịka ndị ọrụ obodo si kwuo.

    E tinyere ọnọdụ gbatagbta na kwuo na ọ ga-eme ihe niile o nwereike iji kpochie nsogbu a.

    Nke a bụ ọkụ ọgbụgba kachasị njọ na mba Chile kamgba ha pụtara ihe. Ọtụtụ ndị o metụtara bụ ndị na-aga njem nlereanya na ezumike na mpaghara ahụ.

    Ministri na-ahụ maka ahụike adọọla aka na ntị banyere ahụike na mpaghara ahụ.

    Minista a enyela iwu ka e hiwe ụlọọgwụ ọdịrị ụkọ na mpaghara ebe ihe a mere dịka ọ kpọkuru ndị ọrụ ahụike ka ha gbaa mbọ n’ịzọ ndụ ndị mmadụ.

    Ọ na-esiri ndị ọrụ gbatagbata ike iru na mpaghara ebe ọkụ gbasiri ike dịka miniter imeụlọ bụ Carolina Toha kwuru na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ nwereike ịkarị nke dị ugbua.

    Gọọment mba Chile agwala ndị mmadụ ka ha ghara ime njem gaa na mpaghara ahụ.

  7. Lee Tyla napụrụ Davido, Burna Boy na ndị ọzọ ara n’ọnụ na nturuugo Grammy

    Nwafọ mba Saụt Afrịka na-eti egwu bụ Tyla nwetere nturuugo Grammy nke mbụ ya na ngalaba egwu a kpọrọ ‘Best African music performance’ maka egwu ya ọ kpọrọ ‘Water’.

    O meriri ụmụafọ Naịjirịa dịka Burna Boy, Davido, Ayra Starr na Asake bụ nke buterela ọtụtụ nkatọ n’akụkụ ndị Naịjirịa ma ito ya aha n’akụkụ ndị Saụt Afrịka.

    Ụfọdụ ndị Naịjirịa gara na soshal midia na-akọwa na ọ bụ ihe ịtụnanya na nwada a ka bịara ọhụrụ n’egwu si merie ụfọdụ ndị Naịjirịa gbarala mgbọrọgwụ n’iti egwu bụ a họpụtara ya na ha.

    Mana ndị nkwado Tyla hụtara mmeri ya dịka ihe tozuuru ya n’ihi etu egwu ya si mee ọfụma ma wuo ewuo.

    Egwu a bụ ‘Water’ o tiri n’afọ gara aga wuru ewu na mbaụwa ma pụtakwa ihe n’ihu akwụkwọ egwu ndị kachasị ewu ewu a kpọrọ Bilboard Hot 100.

    “Nke a bụ ihe ịtụnanya! O nweghi mgbe m cheere na m ga-eturu ugo Grammy n’afọ 22!” Tyla tiri mkpu mgbe ọ natara nturuugo ahụ n’ụbọchị Sọnde.

    Ụfọdụ ndị Afrịka etoola emume nturuugo Grammy nke afọ dịka ihe gara ọfụma site n’etu Tyla si merie, Burna Boy gụrụ egwu ya ebe ọkpaọchị mba Saụt Afrịka bụ Trevor Noah chịkọtara emume ahụ nke ugboro anọ.

  8. Igbo ndị ọma anyị ekelee unu taa

    Daalụ n'izu ọhụrụ. Anyị na-asị ka ị bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo taa.

  9. Ịkwụsị nnata ọgwụ ọgwọgwọ ọrịa kansa bu mmadụ iji aka ya gbuo onwe ya- ndị ọrịa kansa na Naịjịrịa

    Taa bụ 4 Febụwarị bụ ụbọchị eji echeta ndị ọrịa Kansa n’uwa niile.Kansa egbuola ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa na ụwa niile .

    Ụfọdụ ndị na-arịa Kansa na Naịjirịa gwara BBC obi ha, ha kwuru na ego ole ana-ere ọgwụ Kansa arịala karịa ka ọ dị bụ.

    O doro ọnyeọbụla anya na ego ana-ere ihe niile na Naịjirịa arịala. Ụlọọrụ na-ahụ maka ọgụọnụ ego nke Naịjirịa bụ ‘National Bureau of Statistics’ kwuru na ihe ngalaọnụ na Naịjirịa kwụ na pacentị 28.9 na ọnwa Disemba nke 2023.

    Mary bụ onye ọrịa Kansa na-anata ogwụgwọ n’ụlọọgwụ kansa dị na Abuja gwara BBC ‘’Anaghị m agbadozi anya n’ọgwụgwọ m maka na ego ole ana-ere ọgwụ karịrị, a na ma echekarị echiche etu m ga esi nwete ego ọgwụ m’’

    Mary chọpụtara na obu ọrịa ahụ n’afọ 2020, ọ natara ọtụtụ ọgwụgwọ ma nke an-akpọ ‘Chemotherapy’mana ụgbụa, Dokịta ya enyela ya ọgwụ ọzọ ana-akpọ ‘Zoladex’

    ‘’Na mbụ, otu Zoladex bụ # 60,000 mana ụgbụa ọ nọzị na # 120,000, onwere mgbe m na gbara ọgwụ m n’ihi ahụghị ego, nanị dị m na-ebu ihe niile a maka na anaghị m aru ọrụ’’ Mary kọwara.

    Dika osiri kwu, ọgwụ ọzọ ana-enye ndị ọrịa Kansa bụ ‘Zoledronic acid’ arịala ruo #180,000.

    ‘’Ọgwụ na-ewetulata ụfu m na-azụ bụ #1000 nọzị na #3000 ụgbụa, otu iko vitamin C bụzi #7.500 nke a mere m jiri gbanwee ya zụba nke #2,500’’

    ‘’N’ime ihe ndị a inweghị ike ịkwụsị nnata ọgwụ gị maka na ị kwụsị ọgwụ bụ mmadụ iji aka ya gbuo onwe ya’’

    Amina Abubakar, onye ọrịa Kansa ọzọ bi n’Abuja gwara BBC na otu ọgwụ ọna-azụ bu #5000 eruola #10,500.

    ‘’Aha ọgwu ahụ bụ Xeloda Capecitabine, dịka onye ọrịa kansa, ị ga anụ sachetị itoolu n’ime ịzuụka atọ eji akwado maka nyocha ‘Chemotheraphy’ nke anyị na-eme otu ugboro n’izuụka atọ’’ Amina kọwara.

    Ihe ọpụtara bụ na Amina ga-eji ihe ruru #95,000 zụọ ọgwụ a n’ime izuụka atọ.

    ‘’Nke kachasị ewute anyị bụ na Gọọmentị anaghị eme ihe ọbụla iji nyere anyị aka, anyi nọọrọ onwe anyị, dịka onye ọrịa kansa na Naịjirịa, ị ga na-eche maka ahụịke gị, ị ga na-echeku etu ị ga-esi nwete ego ị ga-eji zụta ọgwụ ndị a’’

    Ndị ọrịa ‘Tuberculosiis na HIV na-enwete ọgwụ ha n’efu na Naịjirịa mana ọ dịghị etu nyere ndị ọrịa kansa. Dịka onye ọrịa kansa, ị nọọrọ onwe gị wee ruo mgbe ị ga-anwụ’’ Amina kwuru.

    Onyeisi otu enyemaka ndị kansa na Naịjiịa bụ Gloria Orji Nwajiogu kwuru na anatara enyemaka iji wetulata ego ole ana-ere ọgwụ ndị kansa na Naịjirịa na-aka Gọọmetị ugboro ole na ole mana ọnagị ezu.

    ‘N’ulọọgwụ gọọmentị, anyị na-enweta ndị ọrịa kansaruru mmadụ 15 na 20 n’otu izuụka, nwere ya manye ihe ụlọọgwụị ndị ọzọ na-enweta’’ Gloria kwuru.

  10. A zọpụtala ụmụakwụkwọ ise na ndị nkuzi ha a tọọrọ n’Ekiti Steeti

    Ndị uweojii Ekiti Steeti ekwupụtala na a zọpụtala ụmụakwụkwọ ise ahụ na ndị nkuzi ha a tọọrọ n’Emure-Ekiti Steeti n’ụbọchị 29 Jenụwarị 2024.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Abutu Sunday sị na e mere nke site na njikọta aka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ gụnyere Amotekun, ndị nchekwa ọdịnala na ndị dinta.

    O kwuru na ozi iti aka n’obi ya na-agara ezinaụlọ onye ọkwọ ụgbọala ụmụakwụkwụ ahụ dịka a na-enye na ndị ntọrị ahụ gburu ya.

    Sunday kwuru na ha na-eme nyocha tara ọchịchị iji nwuchie ndị ntọrị ma taa ha ahụhụ dịịrị ha.

    Ọ gara n’ihu kwuo na e nyefeela ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ha a zọpụtara n’aka gọọmentị Ekiti Steeti maka inyocha ha ahụ ma nye ha ọgwụgwọ.

  11. Ihe mere mba US na UK jiri atụ ogbunigwe n’ogige ndịagha nnupuisi Houthi

    Mba Amerịka na Briten gbakọtara aka ọnụ ma tụọ ogbunigwe n’ogige 36 nke ndị otu agha nnupuisi Houthi nke mba Iran na-akwado na mba Yemen.

    Ogbunigwe ha tụrụ na Satọde ụbọchị atọ nke ọnwa Febụwarị gbatara ọtụtụ ebe ndị otu Houthi na-edosa ngwa ogbunigwe ha dị iche iche.

    Nke a abụghị mbụ mba US ba UK ga-agbakọta aka ịtụ ndịagha nnupuisi a ogbunigwe , ha tụrụ ndị a ogbunigwe n’ụbọchị 11 nakwa 22 nke ọnwa Jenụwarị 2024.

    Kedụ ihe mere ha jiri awakpo ndị Houthi?

    N’ọnwa Nọvemba 2024, otu agha nnupuisi Houthi nke nwere nkwado mba Iran malitere ịtụ ogbunigwe n’ụgbọmmiri ndị na-agafe n’oke osimmiri uhie (Red Sea) ma kwuo na ọ bụ ụgbọmmiri ndị na-achọ ịbanye mba Isreal ka ha na-atụ ogbunigwe ndị a.

    Otu a kwuru na ha na-eme nke a iji busoo mba Isreal agha maka ihe na-eme otu Hamas n’obodo Gaza. Mana ọtụtụ ụgbọmmiri ha tụrụ ogbunigwe abụghị nke mba Isreal, o nweghikwa ihe ọbụla jikọtara ha na mba Isreal.

    Nke a mere iwe jiri wee mba Amerịka na Briten ha jiri malite ịtụ ndị otu Houthi ogbunigwe aghara aghara na mba Yemen.

    N'otu aka ahụ ndị Houthi aṅụọla iyi imegwara ihe a mba Amerịka na Briten mere ha dịka ọtụtụ ogige ha larala n'iyi.

    Ọnụ na-ekwuru ha wepụtara ozu n'akara X ma sị na mwakpo nke ugboro atọ mba US na UK ga-awakpo ha agaghị egbochi ha ịkwado mba Palestine n'ụzọ ọbụla ha kwesịrị.

    Ụfọdụ foto gosikwara ka ndị otu ha na-agbakọta ma na-akwado maka etu ha ga-esi zaghachị mba Amerịka na UK.

  12. Onyeisiala Senegal akagbuola ntuliaka mba ahụ na-akwado

    Onyeisiala Senegal bụ Macky Sall akagbuola ntuliaka onyesisala mba abụ na-akwadobu n'alaị 25 nke ọnwa Febụwarị rue oge a mabeghị.

    N'ozi o ziri ụmụamala mba ahụ n'ụbọchị Satode, Sall kwuru na ya binyere aka n'iwu kagburu atụmatụ tinyere ntuliaka ahụ. maka na ndị omeiwu mba ahụ na-enyocha ọkaikpe abụọ a na-enyo ma ha a na-akwụwa aka ọtọ n'okwu metụtara ntuliaka.Sall kwuru na ya ga-ehiwe atụmatụ mkparịtaụka iji hazie ntuliaka kwụ ọtọ, enweghị wuruwuru. maka o kwughị ụbọchị ọ ga-abụ.

    Mkpebi a na-abịa dịka esemokwu dapụtara n'etiti Ụlọomeiwu mba ahụ na ụlọikpe banyere ndị na-azọ ọkwa ọnhịchị na ntuliaka ahụ.

    Nke a bụ mbụ Sall na-akagharị ntuliaka.

  13. Ihe mere INEC ji kwụsị ntuliaka mgbakwụnye n'Enugwu, Kano, Akwa-Ibom

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntulịaka na Naịjiria bụ Inec, na-ekwu na ha akwụsịla ntuliaka na-aga n'ihu na mpaghara ụfọdụ dị na Enugwu, Kano na Akwa Ibom steeti n'ihi ọgbaghara, wuruwuru na ịtọrọ ndị ọrụ Inec. Ebe o metụtara bụ mpaghara Enugu-South, Enugwu Steeti, mpaghara Ikono/Ini 'Federal Constituenc', Akwa-Ibom State na mpaghara Kunchi/Tsanyawa dị na Kano Steeti.

    Otu na-ahụ maka ntuliaka kwuru nke a n'akwụkwọ ozi nke onyeisioche kọmịti na-ahụ maka mgbasaozi bụ Sam Olumekun binyere aka na Satọde.

    Mkpebi a bịara ka Inec kwuru na mbụ na ha na-eleba anya maka ndị omekome na izu ohi a na-eme ntuliaka na steeti ndị a.

    Dịka INEC siri kwuo, a kwụsịtụrụ ntuliaka na ngalaba ntuliaka asatọ niile bụ ebe a na-enwetaghị akwụkwọ mbụ na ntuliaka ndị ntuli aka tupu ebido ntuliaka n'Enugwu South 1 Constituency.

    N'otu aka ahụ na steeti Akwa Ibom, Inec kwuru na a kwụsịtụrụ ntuliaka n'ọgbọ atụmvootu ngalaba ntuliaka abụọ (Village Hall, EdemUrua 003 na Ini LGA na Village Hall Mbiabong Ikot Udo 003 na Ikono LGA) ebe ndị ọchụchụ chụpụrụ ihe niile e ji eme ntuli aka.

    Maka mpaghara Kunchi/Tsanyawa steeti dị na Kano steeti, INEC kwuru na amachibidoro ntuli aka na ngalaba ntụli aka iri dị na Kunchi LGA n'ihi mbuso agha, imebi ihe, na ịkpaghasị ndị ntọ.

    Inec kwuru na mkpebi ya dabara na nkebi nke 24(3) nke iwu ntuliaka, 2022.

    Ebonyi South Senatorial Bi-Election: Etu atụmvootu sibu gaa

    Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Dave Umahi atuola vootu na ntuliaka mgbakwụje.

    Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ, David Umahi etinyela vootu ya na ndị ọzọ n'Umunaga Uburu. ntuli aka a na-ewerekwa ọnọdụ n'otu oge na okpuru ọchịchị gọọmentị ịse ndị ọzọ dịka Ohaozara,Onicha,Ivo, Eda, na Afikpo South karị. Mmadu abuo aha ha na enwuenwu na azọ ya bu ọkwa bu ọkammuta Ogbonnaya Okorie Ani nke APC na Silas Onu nke PDP.

    Lee ka onodu sịrị dị Ntulịaka ebịdọla na mkpaghara ndịdị anyanwu Ebonyi Steetị maka nwete onye ga anọchị anya David Umahi bu onye rịtụlụ na ọche mgbe ọnwetere ọrụ dịka mịnịsta na ahụ maka ọrụ n' Abuja.

    Ntụlịaka ahu na aga n' ịru na ebe a na atu vootu onuogugu ya dị 868 n' okpuru ọchịchị ise enwere na mkpaghara Ọdịda-Anyawu nke Ebonyi Steetị.

    N' Ebonyi, onyeisioche na-ahụ maka ntuliaka ahụ, Adedeoye Adeleye kwuru na usoro ntuliaka ahụ na-aga na enweghi nsogbu ọ bụla.

  14. Oluwadarasimi Omoseyin:A tụọla onye ejije Nollywood nga maka ịbọ ego na ịzọ naira ụkwụ

    A tụọla onye ejije Nọllywood mkpọrọ afọ isii maka etu ozi mee ego naira.

    A nwụchiri Oluwadarasimi Omoseyin a ma ama dịka 'Simi Gold,' na Legọs n'ọnwa Febụwarị afọ 2023 dịka ihe onyonyo mmemme o mere gosiri ebe a na-efe ego naira ma na-azọ ya ụkwụ gbara na ịntanet.

    Nke a na-abịa dịka e bipụtara naira ọhụrụ ma nwekwa ụkọ ya.

    Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe Omoseyin na-efe ego dị otu narị pukyu naira(N100,000) dịka ọ na-agba egwu na agbamakwụkwọ enyi ya na Lekki Legọs, dịka EFCC si kwuo.

    Omoseyin gwara EFCC na ọ tarara ego ọhụrụ ahụ n'aka nd i ihe ya na-amasị bịara mmemme ahụ, na ya amaghị ndị nyere ya ego ahụ.

    Oge ọ bụtara ụlọikpe n'ụbọchị Tọzde, Omoseyin kwetara na ikpe mara ya, dịka ọ hụụ ihe akaebe doro anya gosiri na o mere ya, dịka EFCC si kwuo.

    Ọ rịọrọ ka e meere ya ebere, na nke a bụ mbụ ya na-ada iwu ma bụrụkwa onwaanyị jo otu nwa.-

    Omoseyin, who is popularly known as further asked for a non-custodial sentence, according to EFCC.

    Jọstịs Chukwujekwu Aneke bụ onye kpere ikpe ahụ tụrụ ya mkpọrọ ọnwa isii maọbụ nye ya ohere ịkwụ nha N300,000.

    Cheta na n'ọnwa Novemba afọ 2022, ụlọakụ etiti Naijiria bụ 'Central Bank of Nigeria(CBN) wepụrụ N200,500 na N1000 ochie n'ahịa ma tichie nke ọhụrụ nke butere ụkọ naira.ation.

  15. Gọọmenti Enugwu amachiela ndị “Scavengers”

    Gọọmenti Enugwu ewepụtala iwu machie ndị na-atụtụ ggwe nakwa ndị na-atụtụ ihe n'ebe mkpofu ahịhia Bekee kpọrọ 'scavengers' na-akpa ike na mpaghara di iche iche n’Enugwu.

    Odeakwụkwọ Gọọmenti Enugwu bu ọkammụta Chidiebere Onyia kwuru na ihe kpatara nke a bụ na ha enwetala nari kwuru nari mkpesa maka etu ndị “Iron condemn” si ezu ohi n’ụlọ ndị mmadụ, ya nakwa arụ ndị ọzọ dị iche iche.

    O kwuru, “ ọ bụ ihe mwute na ndị ahụ na-eme na ha n’atụtụ igwe jizi ohere ahụ abanye ime ụlọ ndị mmadụ, zuo ohi ma meruo ndị mmadụ ahụ.

    Onyia gara n’ihu kwuo, “ ọrụ anyị dịka gọọmenti Enugwu bụ ichekwa ndụ na akụnauba."

    "Ya mere anyị ga agba mbọ ịhụ na anyị tinyere anya n’ebe ọbụla na echere nchekwa aka mgba ugbua”

    Iwu Enugwu bụ Enviromental Law nke 20 kwuru na onye ọbụla e jidere la ọ na arụ ọru “Scavenger” ma ọ bụ “Iron Condemned” ga-aga mkpọrọ afọ abuo.

    Odeakwụkwọ Enugwu rịọọrọ ndị mmadụ ka ha weta mkpesa nye ndị uweojii ngwa ngwa ha hụrụ onye ọbụla ka na-atụtụ Igwe maọbụ na-achọ ihe n’ebe mkpofu ahịhịa .

  16. Gaasị agbara na mba Kenya egbuola mmadụ atọ ma merụọ ihe karịrị mmadụ 300 ahụ

    Nnukwu ikuku gaasị agbaala n'isi obodo na mba Kenya bụ Nairobi, nke gburu ihe dịka mmadụ atọ ma merụọ ihe karịrị mmadụ 300.

    Etu o si wee mee bụ na nnukwu ụgbọala bu gaasị n'obodo a kpọrọ Embakasi n'ihe dịka elekere nke 23:30 (20:30 GMT) n'abalị "Nke a kpatara nnukwu ọkụ gbara", dịka onye ọrụ gọọmenti si wee kwuo.

    Ụlọ, ụlọahịa, ụgbọala socha ihe ndị mebiri, ihe onyoonyo gosisi ọkụ gbara n'akụkụ ụlọ obibi.

    E mechiela ụzọ gara ebe ihe a mere area, ma na-emekwa nnyobanye n'ihe kpatara gaasị a gbara.

    Na nghọta BBC a machiela otu onye maka ebubo ihe kpatara ọgbụgba gaasị a.

    Gọọmenti buru ụzọ sị na gaasị a gbara b'abalị ebe ndị ọrụ na-agbanye gaasị mana ndị isi obodo mechara wepụtakwa ozi ọzọ ịgwa ọha na ọ bụ ụgbọala dị ukwuu gbawara n'ọdọụgbọala.

    A sịkwa na ndị gbatagbata na-agba ezigbo mbọ ịhụ na ha kwụsịrị ọkụ ọgbụgba a.

    Onyeisi ndị uweojii n'Embakasi bụ Wesley Kimeto sị na otu nwa ntakịrị so na ndị nwụrụ mgbe gaasị a gbara.

  17. 'Mkpa ọ dị EFCC ịkpọ aha ndị otu ọkpụkperechi na-ejidere ndị oyinduegwu ego'

    Otu onye ọkaiwu etinyela ọnu mkpughe nke onyeisioche ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka na Naijiria, 'Economic and Financial Crime Commission( (EFCC), bụ Ola Olukoyede kpughere na ụlọọrụ ha chọputara ndị otu okpukperechi na Naịjirịa na-eweta ma na-ejidere ndị oyindụegwu ego.

    Olukoyede kpughere na ha chọputara ego a na-enyo enyo n' ụlọakụ ha, ma ụfọdụ ego ahu bu ego nke a na-achọ achọ.

    Onye ọkaiwu nwere agba n'Abuja bụ Peter Aja, kọwara na-agbanyeghị na "o nweghị ịwụ kwuru na ndị mere nyocha dịka ndị EFCC ga-akpọ okwu aha", mana na "idepụta aha otu ndị ahụ na-akwado ndị na-eyi ndụ egwu ga-eme ka otutu sọ n' otu ahụ mata ihe na-eme n' otu ha nọ n'ime ya"

    Ọkaiwu Aja sịrị, "Ndị EFCC nwere ikike ime nyochaa ma kpupu mmadu ụlọikpe na onwe ihe ha hụrụ."

    "Asi m kwuo, ịkpọ aha maọbụ kwupụta ndị aka ha dị na nrụrụaka tupu e nwee ikpe ziri ezi n' ụlọikpe bụ ihe na-eme ndị a na-enyo enyo agaa kwado ofuma maka ikpe ahụ".

    "Mana nke à ga-eme ka ụwa nile hụ na e nwekwara ike isi ụzọ ahụ nwere bupu ego maọbụ kwado ndị na-eyi ọha egwu".

    "O nweghị iwụ mere ya ka ọ bụrụ iwu na ndị EFCC ga-akpọ aha ndị okperechi ahụ na-akwado ndị na-eyi ndụ egwu tupu ụlọikpe e kpebie ikpe".

    "O kwuru na ọ ka mma na emeghị ya okwu akpụ na ọnụ ruo mgbe ụlọikpe ga ama ha ikpe, maka na ndị EFCC nwere ike inwete ntaram ahụhụ na ọ bulu na okwu ha bugara ụlọikpe mechaa bụrụ ụgha".

    Ihe onyeisioche EFCC kwuburu na-akpọtụ

    N'ụbọchị Wednezde, onyeisi EFCC kwupụtara na mkparịtaụka otu ụbọchị maka mmemme "Ndi na-eto eto, ndị na-ekperechị, na ndị na-alu ọgụ megịde mpụ na nruruaka,nke e mere n' ogige 'Musa Yar'Adua Centre' dị n' Abuja, na EFCC chọpụtara na ụfọdụ otu okpukperechi na-ebupu akatamkpo ego maọbụ zooro ndị na-asa ego mego n'ụlọakụ.

    Ọ gbakwụnyere na ha chọpụtara otu otu okpukperechi na-akwakọba ndị na-eyi ọha egwu ego.

    Olukoyede kwuru, "A chọpụtala otu okpukpere chi dị na mba a ka ha na-akwakọba ndị na-eyi ọha egwu ego."

    Ọ gbakwụnyere na ọ dị mkpa ka ndị isi okpukperechi, ndị omenaala na ndị ọrụ ọha na-enyere ndị EFCC aka na mbọ ha na-agba iji kwụsị nrụrụaka na mba ahụ.

    O kwuru na EFCC agaghị agbanarị ijide onye ọbụla a chọpụtara n' aka ya dị ịme mpụ gbasara ego, gụnyere; ndị isi ọchịchị, ndị omebeiwu na ngalaba ikpe nke gọọmentị.

    Olukoyede kwukwara sị, "Ọ dịghị onye a ga-azọpụta, anyị ga-enyocha onye ọbụla a na-enyo enyo na ọ na-eme mpụ ego, ndị a gụnyere ndị isi ọchịchị, ndị omebe iwu na ndị ikpe nke gọọmentị."

  18. Ndewoo ,ndị be anyị

    Ndewoo, ndị be anyị.

    Ya gazie.

  19. Etu ị ga-esi chekwa onwe gị n’oge ntọọrị mmadụ a

    Etu ndị ekperima si atọọrị ndị mmadụ nke ikpeazu a bụ ihe mgbawaobi nyere onye ọbụla, ọtụtụ mmadụ efuola n’ala Igbo nakwa Naijirịa niile.

    Nke mere ikpeazu a bụ ntọọrị ụmụakwụkwọ itoolu na ndị nkụzi ha mmadụ anọ nakwa ọkpụgbọala ha n’Ekiti steeti.

    Onye nwe ulọọkwụkwọ ahụ Gabriel Adesanya kọwara na ndi tọọrọ ha kwuru na-aga enye ha ego mgbapụta ruru naira nde iri (10 million)

    N’ime ihe ndia na-eme na Naịjirịa, lee ihe ị ga-eme wee chekwa onweghị n’oge a.

    1. A mapadona akara na-gosiri ụlọọrụ ebe ị na arụ n’ụgbọala gị, ọ kachasị ọ bụrụ na ọrụ gi na-akwụlite ụgwọ.

    2. Etinyela foto ụmụaka gị ebe ha yi akwaakụkwọ ha n’ihụ soshal midia, chekwaa ụmụ gị .

    3. Mgbe ọbụla ị gara mmemme, eji na ike fee ego, nke a nwere ike ịme ka ndị ọjọọ hụta gị dịka onye nwere ego.

    4. Gbaambọ hụ na ịnaghị aga n’ọdụ POS maọbụ ATM enwere nnukwu ego, nke nwereike ị mee ka ndị ọjọọ hụchata gị.

    5. Gbambọ hụ na ị hichara ozi ego ụlọọakụ gị ziteere n’ekwentị gị.

    6. Gbambọ hụ na ị na emechi ọnụzo ụlọ gị mgbe ọbụla ị pụrụ-apụ.

    7 .A dịna eko akwụkwọ njiri mara onye nke ụlọọrụ gị, ndị mmadụ ewesịghị ị mata ebe ị na arụ-ọrụ.

    8. Gbambọ hụ na ị na agwa ndị ulọ gị ebe ị na-aga.

    9. Ọbụrụ na ọ ga ekwe gị mee, a dịna ezịpụ ụmụaka gị na ha bi ozi n’abalị, ndị ọjọọ nwereike ị si n’aka ha nwete gị .

    10. Emela ka ndị agbataobi gị hụta gị dịka onye nwere ego, zochilata onwe gị, enweghị onye bụ ọkachabaụba n’elu ụwa.

    11. Ị na enyere ndị nwere mkpa ego aka, mee ka ha mata na ịnweghị oke ego, na obụ nanị enyemaka ka ị na0-enye ha.

    12. A dina anọ karịa oge mgbasa gị n’ụlọọrụ, ọrụ anaghị agwu-agwu.

    13. Mee ka nchekwa onwe gị bụrụ ihe nọ gị n’obi mgbe niile.

    14. Gbambọ hụ na ị naghị abanye ụgbọala na-akwụsị n’ọgologo ezị, ị chọọ ị banye ụgbọala, banye ya n’ọdụ ụgbọala ama ama.

    Ihe ndị a bụ usoro dị nfecha ị ga-eji nyere onwe gị aka ma gbanarị ọnwuwa ntọọrị mmadụ n’efeghiarị ụgbua

  20. Ndị 'bureau de change' Abuja agbaala abụbọọrụ

    Ndị na-agbanwe ego n'isiobodo Naijiria bụ Abuja emechiela ọdọahịa ha, kwụsị ịgbanwe si belụsọ ma onyeisiala Naijiria bụ Bola Tinubu elebanye anya n'okwu ụkọ dọla, na ha agaghị emepe.

    Otu onyeisi ndị otu a bụ Abdullahi Dauran, gwara BBC na ha kwụsịrị nke a iji gosi ụmụ Naijiria na nsogbu ụkọ dọla na-ewute ha,

    O boro ebubo na na ọbụ ụlọọụ ndị na-azụ ma na ere ego igwe ịntanet a kpọrọ 'cryptocurrency" bụ ha nyụrụ ihe na-esi na ya bụ okwu.

    Nke a na-abịa dịka ụlọakụ etiti bụ Central Bank of Nigeria(CBN)na-agba mbọ ime ka mịzụ maọbụ ire ego igwe (forex) kwụrụ chịm

    Taa bụ Tọzde, CBN nyere ụlọakụ dị iche iche dị na Naijiria iwu ire dọla, ma dọọ aka na ntị ka ndị mmadụ ghara ijikpa nke ha nwere maka irite uru ahịa.