Onyeisiala Zimbabwe ahọpụtala nwa ya n'ọkwa minista
A na-ebo Emmerson Mnangagwa ebubo ime mpụ maka etu o siri họpụta nwa ya nwoke dịka otu n’ime ndị minista ọhụrụ ya na-agbanyeghi etu ntuliaka si gaa.
Mnangagwa họpụtara nwa ya bụ David Kudakwashe dịka osote minista na-ahụ maka akụnaụba dịka oke ruuru ndị ntoroọbịa.
Ọ ga-akwara n’ihu họpụta nwa nwanne ya bụ Tongai Mnangagwa dịka osote minista na-ahụ maka ebe nlereanya họpụta.
Mthuli Ncube bụ onye ọrụ ụlọakụ ka ji ọkwa dịka minista na-ahụ maka akụnaụba ebe onyeisioche pati Zanu-PF bụ Oppah Muchinguri-Kashiri nọ n’ọchịchị ka a họpụtagharịrị dịka minista nchekwa.
Pati ndị na-anọghị n’ọchịchị akatọọla atụmatụ nhọpụta ndị a minista a ma sị na o zighi ezi.
Ọtụtụ ndị mmadụ nọ na soshal midia agbarụọla ihu ma katọọkwa nhọpụta ndị minista ọhụrụ a.
O nwebeghi okwu ọbụla si n’ọnụ ndị pati Zanu-PF maọbụ ụlọọrụ onyeisiala banyere nhọpụta mana ndị nkwado Mnangagwa kwuru na nwa ya tozuruoke iji ọkwa ahụ.
Nhọpụtagharị Mnangagwa dịka onyeisiala ka bụ ihe a na-ama aka maka ebubo na e mere nrụrụaka na ntuliaka.