You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Aka akparala agadi nwoke, ndị ọzọ maka mgbere ọgwụ ike

Nchịkọta akụkọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile n'ọnwa Sepụtemba 2023.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Adline Okere, Jessica Nwankwo, Chukwunaeme Obiejesi, Chimezie UcheAgbo and Chioma Nkemdilim Daramola

  1. Onyeisiala Zimbabwe ahọpụtala nwa ya n'ọkwa minista

    A na-ebo Emmerson Mnangagwa ebubo ime mpụ maka etu o siri họpụta nwa ya nwoke dịka otu n’ime ndị minista ọhụrụ ya na-agbanyeghi etu ntuliaka si gaa.

    Mnangagwa họpụtara nwa ya bụ David Kudakwashe dịka osote minista na-ahụ maka akụnaụba dịka oke ruuru ndị ntoroọbịa.

    Ọ ga-akwara n’ihu họpụta nwa nwanne ya bụ Tongai Mnangagwa dịka osote minista na-ahụ maka ebe nlereanya họpụta.

    Mthuli Ncube bụ onye ọrụ ụlọakụ ka ji ọkwa dịka minista na-ahụ maka akụnaụba ebe onyeisioche pati Zanu-PF bụ Oppah Muchinguri-Kashiri nọ n’ọchịchị ka a họpụtagharịrị dịka minista nchekwa.

    Pati ndị na-anọghị n’ọchịchị akatọọla atụmatụ nhọpụta ndị a minista a ma sị na o zighi ezi.

    Ọtụtụ ndị mmadụ nọ na soshal midia agbarụọla ihu ma katọọkwa nhọpụta ndị minista ọhụrụ a.

    O nwebeghi okwu ọbụla si n’ọnụ ndị pati Zanu-PF maọbụ ụlọọrụ onyeisiala banyere nhọpụta mana ndị nkwado Mnangagwa kwuru na nwa ya tozuruoke iji ọkwa ahụ.

    Nhọpụtagharị Mnangagwa dịka onyeisiala ka bụ ihe a na-ama aka maka ebubo na e mere nrụrụaka na ntuliaka.

  2. Ụlọikpe Tribunal achụọla ndị omeiwu Labour Party abụọ n’Abia Steeti

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ndị omeiwu nke nọ n’Umuahia achụọla onye Labour Pati a họpụtara ịnọchi anya Arochukwu/Ohafia n’ụlọomeiwu nta bụ Ibe Okwara.

    Ụlọikpe a gara n’ihu kpọpụta Dan Okeke nke pati All Progressive Congress (APC) dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.

    Ụlọọrụ na-ahụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (Inec) nyere Okwara mmeri nke mere Okeke jiri gbaa akwụkwọ n’ụlọikpe sị na nke ahụ esoghi usoro iwu.

    Mana ụlọikpe a nke ọkaikpe Adeyinka Aderegbegbe nọ n’isi ya kagburu mmeri Okwara ma sị na o soghi usoro iwu Naịjirịa.

    Ọ gara n’ihu sị na ọ bụ Okeke nke APC meriri ma nye Inec iwu ka ha na-apụ Okwara asambodo mmeri ma nye ya Okeke.

    N’otu aka ahụ, ụlọikpe ọzọ n’Umuahia chuturu Emeka Nnamani nke Labour Party na-anọchiteanya Aba North/South n’ụlọomeiwu nta ma kpọpụta Alex Ikwechegh nke All Progressive Grand Alliance (APGA) dịka onye meriri.

    Cheta na ụlọikpe chụpụburu Amobi Godwin Ogah na-anọchiteanya Umunneochi/Isiukwuato na Munachim Alozie na-anọchiteanyaOsisioma/Obingwa/Ugwunagbo bụcha ndị Labour Pati.

  3. Igbo ndị unu abọọla chi?

    Onye a hụrụ taa ka a hụụ ya echi, ya mere anyị ji aka na unu apụtala n'ahụ izuoke n'ụbọchị taa.

    Bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.

  4. Gọmenti Enugwu na Ohaneze Ndigbo ekelela mba UK maka ịmepe “Visa submission Centre” na steeti ahụ

    Gọọmentị Enugwu steeti ekeleela mba UK maka ịmepe 'Visa submission center' n'Enugwu iji mee ka ọ dịrị ndị na-achọ akwụkwọ njem mba ahụ mfe.

    N'ozi nke onye odeeakwụkwọ gọọmentị steeti ahụ bụ Chidiebere Onyia wepụtara, ọ sị na ọ so n'ihe ha rịorọ gọọmentị UK mgbe Gọvanọ bụ Peter Mbah nabatara onye nnọchiteanya mba ahụ bụ Peter Montgomery n'ọnwa Juun afọ a.

    N'otu aka ahụ Ohaneze Ndigbo kelekwara mba UK maka ịnabata otu arịọrịọ imepe ebe dị etu ahụ n'Enugwu bụ isi obodo mpaghara ala Igbo.

    Nke a mere mgbe otu Richard Montgomery ahụ gakwara nleta otu Ohaneze Ndigbo n'ụlọorụ ha dị n'Enugwu.

    Ha kwuru na enweburu ụlọorụ British Council dị n'Enugwu nke nọkatara gbachie n'enweghi okwu ọbụla pụtara.

    "Ịnwe ebe dị etu a ga-enye aka wulite mmekọrịta dị n'etiti mpaghara ahụ na mba UK.

    Ụlọorụ mba UK esila n'akara Twitter ha kwuo na ha ga-emepe ụlọọrụ obere oge ebe ndị mmadụ ga-enweike itinye akwụkwọ ịnata ikike njem mba ahụ.

  5. E buliela mmachi Visa nke UAE nyeburu ụmụ Naịjirịa

    Mba UAE ebuliela mmachi Visa ha nyeburu Naịjirịa n'ọnwa Ọktoba afọ 2022.

    Onyeisiala Tinubu nke Naịjirịa nakwa onyeisiala UAE nwere nkwkọrịta a na nzụkọ pụrụiche ha nwere n'ụbọchị Monde.

    Mwepu mmachi a bụ mpụtara nzụkọ ahụ.

    Ha kpebikwara na ụlọọrụ ụgbọelu Etihad nakwa Emirates ga-ebido ọrụ mbupu na mbubata mmadụ na Naịjirịa ozugbo ozugbo.

  6. Ihe Joe Biden gwara Tinubu mgbe ha zutere n'India

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ekeleela Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu maka mbọ ọ na-agba dịka onyeisi otu Economic Community of West African Countries (Ecowas).

    Biden kwuru nke a mgbe ya na Tinubu zutere onwe ha n’ụbọchị Sọnde n’akụkụ ọgbakọ G20 a na-eme na mba India.

    O kwuru na Tinubu na-eme ọfụma ịhụ na e chekwara ọchịchị onye kwuo uche ya na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ ebe ndịagha weere ọchịchị n’ike na mba Niger.

    Ozi ndị ụlọọrụ Biden wepụtara n’akara Twitter kwuru na Biden kwenyere n’atụmatụ Tinubu nwere n’iwulite akụnaụba Naịjirịa nakwa nchekwa ọchịchị onye kwuo uche ya na mpaghara Afrịka.

    Ọkpụkpọ oku a kpọrọ Naịjirịa ka ha sonye n’ọgbakọ G20 gosiri na nnabata ya dịka mba kachasị nwee akụnaụba nakwa ọchịchị onye kwuo uche ya na mpaghara Afrịka.

  7. Igbo ndị ọma ndewo nụ ooo!

    Anyị ji obi ọma anabata gị n'ọgbakọ anyị n'ụbọchị taa.

    Biko bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.

  8. Ihe karịrị mmadụ 20 anwụọla n'ihe mberede ụgbọ mmiri na Niger steeti

    Ihe karịrị mmadụ 20 awuola na ịhe mberede ụgbọ mmiri mere na Niger steeti taa bụ ụbọchị ụka.

    Nke a mere mgbe ụgbọ mmiri bu ndị ahụ bụkarị ndị ọrụ ugbo kpuru na Gbajibo dị n'okpuruọchịchị Mokwa dị na steeti ahụ.

    Dịka ụlọntaakụkọ Daily Newspaper si kwuo, onyeisioche okpuruọchịchị ahụ bụ Jibrin Abdullahi Muregi kwuru na achọtala ozu mmadụ iri abụọ na otu dịka a ka na-achọ ndị ọzọ.

    Ndị ọrụ gbatagbata na steeti ahụ kwuru na ha ka na-agbambọ ịchọpụta ndị ihe mberede a metụtara n'ezie .

    Nke a na-abịa dịka abalị abụọ gachara ebe ụgbọ mmiri bu ụmụ nwaanyị na ụmụaka kpuru na Yola dị n'Adamawa steeti ma bute ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ.

  9. Onyeisiala Tinubu ga-ezute ndị ndu mba Unites Arab Emirate

    Onyeisiala Bola Tinubu ga-eme njem na mba United Arab Emirate (UAE) ebe ọ ga-ezute ndị ndu mba ahụ.

    N’awụkwọ ozi onye ndụmọdụ pụrụiche ya bụ Ajuri Ngelale wepụtara, o kwuru na Tinubu ga-akwụsị na mba ahụ ma o si na mba India na-alọta.

    Ngelale kwuru na na nzukọ Tinubu na ndị ndu mba UAE ga-eme ga-agbakwasị ụkwụ n’imezi nghọtahie dị na mmerịkọta Naijirịa na mba a.

    O kwuru na ọ ga-eso mkparịtaụka ya na onye nnọchiteanya mba na Naịjirịa nwere n’Abuja n’izuụka ole ma ole gara aga.

    Tinubu ga-ejikwa ohere ahụ gbasaa ozi ọma banyere mwulite ụlọ nrụpụta ihe na Naịjirịa bụ nke ọ na-akpọku ọtụtụ mba ka ha bịa tinye aka na ya.

    O kwuru na a na-atụ anya na Tinubu ga-alọghachị Naịjirịa ngwa ngwa o mere njem ndị a.

  10. Etu ndị uweojii Anambra Steeeti si gbagbuola onye ntọrị mmadụ n’Obosi

    Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha agbagbuola otu n’ime ndị na-atọrị mmadụ n’obodo Obosi ma zọpụta otu onye a tọọrọ.

    Nke a dị n’akwụkwọ ozi Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii wepụtara n’ụtụtụ Sọnde 10 Sepụtemba 2023.

    O kwuru na ndị ọrụ ha nọ na-akpagharị n’Obosi n’elekere asaa nke abalị Satọde mgbe ndị obodo gwara ha na e nwere onye a tọọrọ ma gwa ha ụzọ ndị ntọrị ahụ si gbaa ọsọ.

    Ndị uweojii chụụrụ ndị ntọrị ahụ ruto n’ụlọ a na-arụchabeghi ọhịa gbara gburu gburu dị n’Umuota, Obosi ebe ha na ha kwakọrịtara egbe.

    Ikenga kwuru na ha gbara otu n’ime ndị ntọrị ahụ egbe ma nwuchie ya ebe ndị ọzọ bucha mgbọ egbe gbaa ọsọ, ma sị na a natakwara ha ngwa egbe.

    Onye a nwụchiri kpọpụtara aha ndị otu ya mmadụ atọ ndị ọzọ tupu ọ nwụọ oge e bu ya na-aga n’ụlọọgwụ.

    Kọmishọna ndị uweojii n’Anambra kelere ndị otu ya maka ike ha kpara n’ibuso ndị a agha ma kwee ndị Obosi nkwa na ha agaghị ada mba n’ibuagha megide mpụ na ntọrị mmadụ.

  11. Mangosuthu Buthelezi, eze ndị Zulu,anwụọla ka ọ gbachara afọ 95

    Onyeịsị obodo Zulu,Mangosuthu Buthelezi, nke South Africa anwuoola na afọ 95.

    Dika onyeịsịala South Africa Cyril Ramaphosa siri kwụ, Buthelezi nwụru na ụbochi Satode, nke mere ya ịzụụka abuọ ọ gbara afọ ịrị itoolu na ise (95)

    Cheta na na Mangosuthu Buthelezi bụ otu onye na ndi welitere ịsị na ochichi mba Saụt Afrịka oge ọchịchị mkpagbu ndị isiojii n'aka ndịọcha a kpọrọ, 'Apartheid' na Bekee.

    Ihe e jiri mara ya bụ na ọ bụ onye kepụtara pati nke a na-akpọ 'Zulu Inkatha Party' n'agbata afọ 1990s.

    Buthelezi bụ otụ onye n’ime ndị ndọrọndọrọ ọchịchi Saụt Afrịka na oge mbụ na-ha akwado mmegbu na mmekpa ndị ịsị ocha Saụt Afrịka.

    Cheta na afọ 1990s, Buthelezi na Nelson Mandela nwere nghọtahie nke mere Mandela jiri boya ebụbọ na o kwadoro ndị ịsi ocha Saụt Afrịka na mmegbu ha na-emegbu ndị ịsi ojii South Africa.

    He lụrụ Irene,onye na-agụ nọọsụ si Johannesburg.

    A sị na nna ya lụrụ nwaanyị 40 mana dịka onye ụkaa Anglikan na-akasi ụka ike, ọ jụrụ ịlụ ọtụtụ nwaanyị dịka eze na-achị ndị Zulu oge e chiri ya eze.

  12. Ndị 'unknown gunmen' awakpoola ọdọ ndị 'custom' n'Abia steeti

    Ndị bu egbe amaghị ndị ha bụ wakporo ọdọ ndị Kọstọm dị n'okporoụzọ awraawara si Enugu gawa Aba na Pọtakọt n'Isiala Ngwa n'Abia steeti.

    Mwakpo ahụ bụ nke mere n'ebe Elekere Asatọ nke abalị Tọzde na nso ọnọdụ ndịagha mmiri dị na Umuika Junction.

    Ndị omekatara ihe daaụjọ ahụ suru ụgbọala ndị kọstọm ọkụ ma gbakanyere onye njem nọ n'ụgbọala pụtara oge ha na-akpa ike, merụọ ya ahụ.

    Akụkọ kwuru na e bugara nwa amadi ahụ ụlọọgwụ akpọghị aha ya.

    Otu onye nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ ndịagha si Nigerian Army Ohafia 14 Brigade bụ ndị gbatar ọsọ enyemaka weta udo na mpn'ebe ya bụ ihe mere dịka njem n'akụkọ abụọ okporoụzọ ahụ nọrọ n'ọnọdụ ejeghị eje anaghị ana rue 144 Battalion,

    Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta olu ndị agha 14 Brigade amịtaghị mkpụrụ.

    Ọge onye ntaakụkọ anyị kpọrọ ọnụ na-ekwuru ha bụ Lt Innocent Omale,n' ekwenti, o nwetaghị ya nke ọ na-asa ozi e zigara ya oge anyị wepụtara akụko.

  13. Ide mmiri na-emebi ihe na Hong Kong ugbua

    Agbachiela ụlọakwụkwọ nakwa ụlọọrụ na Hong Kong dịka mmiri ozuzo ka njọ kemgbe afọ 140 na-ezo n'ebe ahụ.

    Nke a ebutela ide mmiri mere ka ebuga ihe karịrị mmadụ otu narị ma buga ha ụlọogwụ nakwa nzọpụta ọtụtụ ndị ọzọ tọrọ n'ebe dị icheiche.

    Mmiri a na-ezo kemgbe abalị ụbọchị Tọzde emeela ka okporoụzọ ndị dị n'ebe ahụ na-ekwo ekwo ka nnukwu mmiri.

    Ihe onyonyo si na soshal midia pụta gosiri ebe ndị mmadụ na-arị n'elu ụgbọala iji chekwa onwe ha dịka mmiri ahụ na-arịso elu ike.

    Ndị isi obodo n'ebe ahụ adọọla aka na ntị na mmiri a na-ezo nwereike ịga n'ihu rue ụbọchị Satode.

  14. Ndị agha 15 na ndị ọzọ anwụọla na mwakpo Jihad na mba Mali

    Ndị agha Jihad nke okpukperechi Islam awakpoola ụgbọmiiri na mpaghara ugwu Mali ma gbuo ihe ruru mmadụ 49 ka gọọmentị kwuru.

    N'otu aka ahụ ha wakpo kwara ogige ndị agha ebe ha na ndị agha kwakọtara ya ma gbuo mmadụ 15 dịka akụkọ na-ekwu na ndị agha Jihad ahụ ruru 50 nwụrụ na ya.

    Nke a mere ka gọọmentị mba ahụ manye ụbọchị atọ a ga-eji ru ụjụ maka ndị nwụru nakwa mwakpo ndị ahụ mere.

    Cheta na gọọmentị mba ahụ na-ekwu na otu Wagner na-enyere ha aka n'ịlụsọ ndị ahụ agha mana mmaja si n'aka ndị agha Jihad ahụ ka na-abawanye.

    BBC emebeghi nchọpụta nke ha gbasara ozi ikpeazụ a gọọmenti wepụtara bu nke a gupụtara n'igwe onyonyo.

    A wakporo ụgbọ mmiri ahụ dịka ọ na Niger si n'obodo Gao na-aga Mopti bụ ebe enweghi okporoụzọ ziri ezi.

  15. Ndị agha Gabon atọhapụla Ali Bongo maka ọnọdụ ahụike ya

    Ndị isi agha chuturu onyeisiala Gabon bụ Ali Bongo n'ọchịchị amaala ọkwa na ha ahapụla onyeisiala Ali Bongo. Ha kwuru na o nwere ikike ịkpagharị etu o si chọọ.

    N’ozi ha gbasara n’onyonyo na mgbede ụbọchị Wenezde, ọnụ na-ekwuchitere ndị agha bụ Col Ulrich Manfoumbi kwuru na mkpebi a bụ maka ọnọdụ ahụike Bongo.

    Ulrich kwuru si, ‘Ọ chọọ o nwere ike ime njem gaa mba ofesi maka nyocha ahụike ya’.

    Cheta na ndị agha ahụ kagburu mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere, n'ụbọchị Ọọgọst 26 2023, bụ nke e kwupụtara na ọ bụ Ali Bongo meriri ya iji nọdụ n'ọkwa onyeisiala ruo afọ ise ọzọ.

    A machibidoro Bongo n’ụlọ dịka a chuturu ya kamgbe Ọọgọst 30.

    N’afọ 2018, Maazị Bongo rịara ọrịa strok.

    Ahụike ya mere ka ọtụtụ ndị na-enwe nchegbu tupu ntuliaka ha e ruo.

  16. Ndị uweojii atọhapụla nwunye onye bụbu onyeisiala Zambia

    Atọhapụla nwunye Edgar Lungu, bụ onye chịburu Zambia, ruo mgbe ọ ga-aga ụlọikpe.

    Ndị uweojii nwụchiri Esther Lungu, na mmadụ anọ, n’ụbọchị Wenezde, maka na a na-arụ ya aka na o zuru ohi. Mana a hapụrụ ya ka ọ laa n’otu ụbọchị ahụ, dịka Danny Mwale siri kwuo.

    Ndị uweojii boro ya na ndị ahụ ebubo atọ gụnyere ohi ụgbọala na ohi asambodo meturu ihe nweta mmadụ na Lusaka.

    Ọzọkwa bụ ijide njirimaraihe mmadụ a na-eche nọ sitere na mpụ.

    Ha gọnarịrị na ya zuru ohi ọbụla.

  17. Kim Jong Un na Vladimir Putin ga-ezute maka mkparịta banyere ngwa agha

    Onyeisiala mba North Korea bụ Kim Jong Un ga-eme njem gaa mba Russia n’ọnwa Sepụtemba a izute ogbo ya bụ Vladimir Putin dịka otu onye ọrụ mba Amerịka gwara ụlọ mgbasaozi CBS.

    Ndị ndu abụọ a ga-akpa nkata etu North Korea nwereike iji ebunye Moscow ngwa agha iji nyere ha aka n’ọgụ ha ndị Ukraine na-alụ, dịka onye ahụ si kwuo.

    A matabeghi kpọmkwem ebe ha nwereike izute onwe ha.

    O nwebeghi okwu ọbụla e kwuru banyere akụkọ nke ụlọọrụ mgbasaozi ndị ọzọ n’Amerịka kọrọla.

    Otu onye a na-amaghị gwara ụlọ ntaakụkọ New York Times ma Kim nwereike iji ụgbọoloko mgbọ egbe anaghị atụ mee njem ahụ.

    Akụkọ nzuko ndị a pụtara ihe dịka ụlọọrụ White House nke Amerịka kwuru na ha nwere ozi na mkparịtaụka banyere inye ngwa agha dị n’etiti mba abụọ a na-aga n’ihu.

    Ọnụ na-ekwuru ngalaba ndụmọdụ na nchekwa mba Amerịka bụ John Kirby kwuru na minista nchekwa mba Russia “na-agba mbọ ka mba North Korea resi Russia ngwa agha” na njem o mere na mba ahụ na nso nso a.

    Na njem ahụ e gosiri ọtụtụ ngwa agha dị iche iche gụnyere nke a kpọrọ ‘Hwasong intercontinental ballistic missile’. Njem ahụ mbụ Kim na-ekwe ka mba ọzọ bata n’obodo ha kamgbe ọrịa covid-19.

    Putin na Kim ezigaara ibe ha ozi ma kwuo na ọ dị mkpa iwulite imekọrịta dị n’etiti mba abụọ ndị a.

  18. Igbo ndị ọma anyị ekeleela

    Unu abọọla chi n'ụbọchị taa. Obi ọcha ka anyi ji anabata gị n'ọgbakọ taa.

    Bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa niile.

    Daalụ!

  19. Mba France agbaala isi akwara na ndịagha ha agaghị apụ na Niger

    Mịnịsta mba France na-ahụ maka mba ndị ọzọ ekwusiela ike na ndịagha ha ga-aga n'ịhụ inọsike na mba Niger ichekwa onye nnọchiteanya ha na mba ahụ.

    Ndịịsị ndịagha na Niamey kwuru ka onye nnọchiteanya mba France si na mba ha pụọ kamgbe izuụka abụọ gara aga.

    Nwada Catherine Colonna gwara ụlọ ntaakụkọ Le Monde na Sylvain ltte bụ onye nnọchiteanya ha n'okpuroọchịchị mba Niger nke iwu kwadoro n'ọchịchị Onyeisiala Mohamed Bazoum a chụrụ achụ.

    Dika nwada Colonna ka na-ekwu okwu, ka igwe mmadụ bu ngagharịiwe aga n’okoporoụzọ Niamey n'ụbọchị atọ n'otu usoro, n’akụkụ ogige ndịagha mba France.

    Ha kpọkuru ndị a chịrị ha na mbụ ka ha wepụ ndịagha ha n'obodo ha.

    France nwere ndịagha ruru mmadụ 1500 na Niger bụ ndị na-enye aka ibuso ndị oyi ndụ egwu agha na mpaghara Sahel.

  20. Ndịisi mba Afrịka amalite ọgbakọ 'climate change' na Kenya

    Ndịisi mba Afrịka gbakọtara na mba Kenya ime ọgba mgbanwe ihu eluigwe a kpọrọ ‘climate change’ ebe ha ga-akpa ka a ga-esi ebelata ọnọdụ ahụ.

    Nzuko a na-aga n’ihu na mba Kenya ga-abụ nke mbụ a ga-eme ya n’Afrịka. Ha ga-enwe mkpebi ha ga-eji aga na mbaụwa n’ọgbakọ Otu United Nations a kpọrọ COP 28 n’afọ a.

    N’ime ụbọchị atọ na-abịa ndị nnochiteanya mba ndị a ga-ekwu maka ụzọ ha ga-eji kwadoo gọọmenti iji belata mgbanwe ọnọdụ ihu eluigwe.

    Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto kwuru na Afrịka kwesịrị iso na ndị ga-eweta ogbugbo nsogbu mgbanwe ihu eluigw, karịa ịbụ ndị ọ ga-emetụta.

    “Kamgbe ọtụtụ afọ anyị eleela ihe a anya dịka nsogbu. Oge eruola mgbe anyị ga-atụgharị ma lee ya anya n’ụzọ ọzọ.”

    “E nwere ọtụtụ ohere dị, ọ bụ ya mere na anyị anọghị ebe ịgụkọ nsogbu anyị nwere, anyị nọ ebe ịchọpụta ụzọ a ga-esi gboo nsogbu dịịrị anyị.”

    Mba Afrịka so na mba kachasị nta n’ime ihe ndị na-ebuta mgbanwe ihu eluigwe mana ha so na ndị kachasị ata ahụhụ dị n’ime ya.