Ndị ọrụ nchekwa awakpoola ogige ndị ESN ma gbuo mmadụ atọ
Ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa bụ njịkọ aka ndị uweojii nakwa ndị agha agbagbuola mmadụ atọ mgbe ha wakporo ogige ndị ESN n'ụzụ ụtụtụ ụbọchị Monde n'ọhịa Igboro.
Oke ọhịa ahụ dị n'etiti Arochukwu na Ohafia n'Abia steeti bụ ebe ndị ahụ hibere ogige nzuzo ha.
Ha na ndị ọrụ nchekwa ahụ kwara mgbọ obere oge tupu ndị ọrụ nchekwa emerie ha ma nye ha ọsọ ụkwụ eru ala.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị agha bu Onyema Nwachukwu wepụtara, "anyị chọpụtara ogige ha dịka emechara nyocha kemgbe izuụka ola ma ole gara aga. Ọ bụkwa ebe ahụ ka ha na-eme ọzụzụ ma na-akpa nkata ịwakpo ndị ọrụ nchekwa nakwa ụlọ gọọmentị dị icheiche"
Ozi ahụ sịkwa na mgbe ha bara legharịa anya n'ogige ahụ, ha chọpụtara egbe dị icheiche ruru ise, ihe na-agba ogbunigwe dị isii, akwa ndị agha, otu igwe Baofeng nakwa nsị na ọgwụ dị icheiche.