You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Aka akparala agadi nwoke, ndị ọzọ maka mgbere ọgwụ ike

Nchịkọta akụkọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile n'ọnwa Sepụtemba 2023.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Adline Okere, Jessica Nwankwo, Chukwunaeme Obiejesi, Chimezie UcheAgbo and Chioma Nkemdilim Daramola

  1. Etu ndị ntọrị si tọrọ kọmishọna mgbasaozi na Benue Steeti

    Gọọmenti Benue Steeti ekwupụtala ntọrị a tọọrọ kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na omenala na steeti ahụ bụ Mathew Abo nakwa onye bụbu onyeisioche okpuruọchịchị Ukum bụ Iorwashina Erukaa.

    Odeakwụkwọ mgbasaozi gọvanọ Benue bụ Tersoo Kula kwuru na a tọọrọ Abo n’ụlọya dị n’obodo Sankara n’elekere asatọ nke abalị ụbọchị Sọnde ebe a tọọrọ Erukaa n’ụbọchị Satọde.

    “Ndị ntọrị a buuru ndị a gawa n’ebe a maghị ma kpọọ ezinaụlọ Erukaa mana ha akpọbeghi ezinaụlọ Abo.

    O kwuru na Gọvanọ Benue steeti akatọọla ntọrị ndị a ma kpọọ oku ka ndị ọrụ nchekwa gbaa mbọ zọpụta ha.

    Ọ gakwara n’ihu gwa ezinaụlọ ndị a nakwa ọha mmadụ ka ha dere jụụ na ndị a ga-enwere onwe ha,

  2. Ihe a na-atụ anya ka ụlọikpe ga-ekpe ike ọkwa Gọvanọ Legọs

    Ọtụtụ ndị mmadụ awụchiela n'ụlọikpe dịka a na-eche ka ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ọkwa gọvanọ na Legọs Steeti chabie ikpe n’akwụkwọ ndị ji aha Labour Pati na PDP zọọ ọkwa gbara Gọvanọ Babajide Sanwolu nke APC maka imeri na ntuliaka ahụ.

    Mmadụ abụọ a bụ Gbadebo Rhodes-Vivour na Olajide Adeniran na-ama n’ụlọikpe maka etu ụlọọrụ Independent Electoral Commision (Inec) si kpọpụta aha Sanwolu na osote ya bụ Obafemi Hamzat dịka ndị meriri.

    Sanwo nwetere vootu 762,134, Rhodes-Vivour nwetere vootu 312,329 ebe Jandor nwetere vootu 62,449.

  3. Ihe anyị ma maka ọkụ gbara n'Ụlọikpe Kachasị na Naịjirịa

    Ọkụ a na-amaghị ihe kpatara ya malitere ịkpa n’Ụlọikpe Kachasị na Naịjirịa dị n’Abuja na Mọnde.

    Ụlọọrụ a nke dị n’ebe a kpọrọ ‘Three Arms Zone’ bụ ebe ụlọọrụ ọtụtụ ndị ọkaikpe na Naịjirịa dịcha.

    O dobeghi anya ihe kpatara ọkụ a mana ndị gbanyụ ọkụ agaala ebe ahụ ma menyụọ ya bụ ọkụ.

    Akụkọ kwuru na nke a metụtara ụlọọrụ ndị ọkaikpe atọ mana a mabeghi ogogo ihe ndị ọ lara n’iyi.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Ọkaikpe Kachasị bụ Festus Akande kwuru na ọkụ ahụ gbara n’ezie ma mebie ọtụtụ akwụkwọ ozi.

    O kwuru na ọkụ a metụtara otu alaka nke Ụlọikpe Kachasị mana o kwughi ndị ọkaikpe o metụtara

  4. Onyeisiala Tinubu enyela ndị nchekwa iwu ka ha zọpụta ụmụakwụkwụ a tọọrọ na Zamfara

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu enyela ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha zọpụta ụmụakwụkwọ mahadum Gusau a tọọrọ na Zamfara Steeti n’izuụka gara aga.

    Nke a na-abịa dịka ndị ekperima wakporo obodo Sabon-Gida dị n’okpuruọchịchị Bungudu nke Zamfara steeti ma tọrọ ụmụakwụkwọ mahadum a karịrị iri abụọ na anọ (24).

    Mmandụ isii n’ime ha mechara bụrụ ndị a zọpụtara ebe ndị ọzọ ka nọ n’aka ndị ekperima a.

    N’akwụkwọ ozi onye enyemaka ya na mgbasaozi Tinubu bụ Ajuri Ngelale wepụtara n’ụbọchị Sọnde ma sị “Onyeisiala Tinubu enyela ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha zọpụta ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị fọrọ n’ime ndị ahụ a tọọrọ na mahadum gọọmentị etiti dị na Gusau, Zamfara steeti.”

    Tinubu katọrọ agwa a ndị ekperime kpara ma sị na o nweghi ihe ọbụla kwesịrị ekwesị ka ụdịrị ihe a mee, ọ ga-akwara n’ihu tie ezinaụlọ ndị nke a metụtara aka n’obi.

    N’otu aka ahụ gọọmentị Zamfara Steeti katọkwara agwa ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha sie imi n’ala chọpụta ebe ndị a nọ ma zọpụta ha.

    Ha gakwara n’ihu tie ezinaụlọ ndị o metụtara aka n’obi ma kwee nkwa na ọkọ agaghị akọ ụmụ ha.

  5. Onyeisiala mba France ekwupụtala ọpụpụ ụlọọrụ ha na ndịagha ha si na mba Niger

    Onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron ekwuola na ndịagha na ụlọọrụ onye nnochiteanya ha na mba Niger ga-esi na mba ahụ pụọ maka ọchịchị ndịagha mba Niger weere n’ike.

    O kwuru nke a na mgbasaozi o nyere na TV n’ụbọchị Sọnde n’ime izuụka ole ma ole ndịagha weere ọchịchị n’ike na mba Niger ma chụpụ onyeisiala mba ahụ bụ Mohamed Bazoum.

    Cheta na mba France na onyeisiala a chụpụrụ achụpụ nwere ezi mmekọrịta.

    N’ụbọchị Fraịde, Onyeisiala Macron kwuru na ya na Bazoum na-akparịtaụka ụbọchị niile na sị ma mkpebi ọbụla ha ga-eme bụ ka e nwee ike tọhapụ Bazoum bụ onye ndịagha ji eji.

    Ngagharịiwe megide mba France na Niger rịrị elu mgbe mba France gbara isi akwara na onye nnọchịteanya ha bụ Sylvain Itte agaghị esi Niger pụọ dịka ndịagha gwara ha.

    Nwere ọchịchị n’ike a mere n’ọnwa Jualị ga-abụ nke ugboro asatọ ga-eme na mpaghara West nakwa Central Afrịka kamgbe afọ 2020.

    Nke a enyela mbaụwa ndị ọzọ echiche banyere etu ọchịchị si alaghachị n’aka ndịagha na mpaghara ahụ.

  6. Igbo ndị ọma anyị na-ekele ooo

    Obi ụtọ ka anyị ji anabata unu n'izuụka ọhụrụ.

    Biko gbalịa nọnyere anyị n'izu a maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa niile.

    Ndewo!

  7. A ga-ekpebi ikpe ntuliaka ọkwa gọvanọ Legọs na Mọnde 25 Sepụtemba

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ọkwa gọvanọ na Legọs Steeti ga-anọ n’ụbọchị Mọnde 25 Sepụtemba chabie ikpe n’akwụkwọ ndị ji aha Labour Pati na PDP zọọ ọkwa gbara Gọvanọ Babajide Sanwolu nke APC maka imeri na ntuliaka ahụ.

    Onyendu ndị ọkaikpe nọ n’isi ikpe ahụ bụ Ọkaikpe Arum Ashom mere ka ndị o metụtara mata nke a n’ụbọchị Satọde.

    Mmadụ abụọ a bụ Gbadebo Rhodes-Vivour na Olajide Adeniran na-ama n’ụlọikpe maka etu ụlọọrụ Independent Electoral Commision (Inec) si kpọpụta aha Sanwolu na osote ya bụ Obafemi Hamzat dịka ndị meriri.

    Sanwo nwetere vootu 762,134, Rhodes-Vivour nwetere vootu 312,329 ebe Jandor nwetere vootu 62,449.

    Ndị ọkaiwu nọ n’ikpe ahụ nọọrụ n’ụbọchị 12 Ọgọstụ nabata akwụkwọ mkpesa nke ikpeazụ e dere ede.

  8. Igbo ndị ọma e ji aga mba

    Unua abọọla chi nke taa?

    Ọṅụ ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ anyị taa, biko buru oche gị bịa gụrụ akụkọ ndị hiri odo n'ụwa taa.

  9. Etu ndị uweojii si wakpoo ụlọ ngwọrị ndụ, gbapụta ụmụaka ụmụnwaanyị asaa e ji agba mgbere n'Ọnịcha

    Ndị uweojii Naijiria agbapụtala ụmụaka ụmụnwaanyị erughị eru n'ụlọ ngwọrị ndụ dị n'okporoụzọ 'Akunnia Njota Street, Woliwo na nso ahịa Ọchanja dị n' Ọnicha.

    Otu n'ime ndị nọ ebe o mere gwara BBC Igbo na ọ bụ n'ebe Elekere asatọ ka ndịuweojii si ogige ndịuweojii CPS Ọnicha wakporo ụlọ ngwọrị ndu ahụ anyị achọghị ịkpọ aha ya maka ji ụmụaka ụmụnwaanyị erụghị eru agba ha akwụna, zọpụta ụmụaka ụmụnwaanyị asaa dị n'agbata afọ 13 na afọ 18 m ma nwuchie onye nwe ụlọ ngwọrị ndụ ahụ.

    Oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga, o kwuru na ụlọọrụ ya enwetaghị ụdị ozi dị otu ahụ.

    N'otu aka ahụ, onyeisi ngalaba na-ebu agha megide ịtụ mgbere mmadụ a kpọrọ 'National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons(NAPTIP) alaka nke Anambara steeti bụ Judith Ibadin gwara BBC Igbo n'ekwentị na ndị uweojii enyeghị ya mkpesa ọbụla yiri nke a.

    "Ọ na-abụ ụdị ihe mee, ndị uweojii akpọọ anyị ma were ụmụaka ndị ahụ nyefee anyị, mana o nweghị mkpesa ọbụla si na aka ndị uweojii yiri nke a anyị nwetara."

    Mana otu n'ime ụmụaka ahụ a gbapụtara ma nyefee n'aka onye nlekọta ya(guardian) anyị achọghị ịkpọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ n'ọnwa Julai "ka onye chọrọ 'inyere m aka' kpọtara m ebe".

    Na nso nso a, iji ụmụaka ụmụnwaanyị erughị eru agba agba ha akwụna na-arị elu mpaghara dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ.

    N'ọnwa Juun, a nwụchiri otu nwaanyị ji ụmụaka dị agbata afọ 12 na 13 agba ha akwụna n'Ọka, Anambara steeti.

  10. Benue Governorship Election Tribunal: Fr Alia emeriela n’ụlọikpe

    Ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka akụpụla mkpesa ka onye ọkwa gọvanọ n’aha otu PDP bụ Titus Ụba wetara o ji aghara mmeri nke Rev Fr Hyaccint Alia nke APCmeriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ steeti ahụe mere n’Abalị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023.

    Inec kpọpụtara Alia onye bụ ụkọchukwu Katolik dịka onye meriri na ntuliaka ahụ maka inweta vootu 473,933, ebe Uba, vootu 223,913.

    Ọnyeisioche ndị ọkaikpe atọ kpere ikpe ahụ bụ Ibrahim Karaye kwuru na ụlọikpe ahụ enweghị ikike ige ya bụ ikpe n’ihi na mkpesa ha wetara metụtara ihe mere tupu ntuliaka dịka o siri metụta akụkọ 285 Iwu Ntuliaka.

    Ụlọikpe gbadoro ụkwụya na Uba bụ onye gbara akwụkwọ na-arịọ ka a chutuo n’ihi n etozughị etozu ịzọ ọkwa n’ihi iji asambodo adịgboroja nakwa ozi ụgha nke a sị na Osote ya bụ Samuel Ode denyere n’akwụkwọ ‘EC9 Form’’ozi o denyere .

  11. Ndị ntọ atọrọla ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị mahadum 'Federal University Gusau', Zamfara

    Ndị ntọ atọọla ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị a mabeghị ọnụọgụgụ ha na otu mahadum dị na Zamfara steeti.

    Ndị ntọ ahụ wakporo ebe obibi(họstel)atọ ụmụakwụkwọ mahadum 'Federal University Gusau' dị na Sabon Gida na Zamfara steeti n'ụzọ ụtụ Fraide were tọọrọ ụmụakwụkwọ ndị ahụ.

    Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị omekome ahụ malitere ịgba egbe aghara aghara tupu ha wakpoo mahadum ahụ.

    Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri etu e si kwasasịa nime ụlọ ebe ụmụakwụkwọ ahụ bi.

    Cheta na n'afọ 2021, ndị ekperima tọọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị dị 300 na steeti ahụ, emechara tọhapụ ha dịka ha Gọọmentị steeti ahụ kweọrịtara na ụtụ iji gbara isi ndị ha ji.

    Ntọ na-arị ibe ya elu na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Ugwu Naijiria bụ ebe ndị ekperima a kpọrọ 'bandit' na Bekee na-wakpo obodo, ụgbo na okporoụzọ na-atọọrọ ndị mmadụ iji napụta ego.

  12. Ụmụakwụkwọ pramarị ruru 90 agaala ụlọọgwụ maka iri nri nwere 'igbo' n'ime ya

    Ihe ruru ụmụaka iri itoolu agaala ụlọogwụ dịka ha richara nri 'muffin' echeere nwere 'Igbo' n'ime ya.

    Ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuru na ụmụakwụkwọ ahụ zụtara ya n'ụzo mgbe ha na-aga akwụkwọ n'ụlọakwụwkọ Pulamadibogo Pramarị.

    Ihe ndị metụtara ụmụakwụkwọ ahụ gụnyere agbọọ nakwa afọ mgbu.

    Mmadụ iri asatọ na asaa esila n'ụlọọgwụ laa dịka ụmụnwaanyị atọ ka nọ n'ụlọogwụ.

    Otu onye nkuzi kpọrọ ụgbọala ụlọogwụ dịka ọ chọpụtara na ụmụakwụkwọ ya na-emegharị n'ụzọ edoghi ya anya.

    Ndị ụweojii kwuru na ha anwụchiela mmadụ abụọ dị afọ iri na itoolu nakwa iri abụọ na otu ma kpụpụ ha ụlọikpe taa bụ Fraịde.

  13. Ndị ntọ atọghapụla Fada Okide e ji kemgbe ụbochị ụka

    Ndị ntọ tọọrọ buru otu Fada aha ya bụ Marcellinus Obioma Okide n'Enugwu atọghapụla ya n'abalị ụbọchị Fraịde.

    Ozi pụtara ihe n'aka Chancellor dayosis nke Enugwu bụ Wilfred Agubuchie kelere mmadụ niile maka ekpere ha nakwa maasị ndị ha nyere dịka a na-atụ anya nzọpụta ya.

    Agubuchie kpọkwara oku ka ndị nso Kraịst niile na Naịjirịa soro kpee ekpere maka udo na nchekwa ndị ụkọchukwu n'ala Naịjirịa niile.

    Cheta na na a tọọrọ Fada Okide n’okporoụzọ Eke-Egede-Affa mgbe ọ kụrụ elekere ise nke mgbede n'ụbọchị ụka gara aga.

  14. Election Tribunal Ruling: Ndị uweojii etinyela mmachi ngagarị na Kano

    Ndị uweojii Kano steeti etinyela nọrọnụlọ awa 24 dịka ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka na steeti ahụ kagburu mmeri nke kagburu Abba Kabiri nke otu NNPP nwere na ntuliaka e mere na steeti ahụ ma nye ya Nasiru Gawuna nke otu APC.

    Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ CP Mohammed Usaini Gumel onye mara ọkwa ahụ n'akwụkwọ mgbasaozi o binyere aka n'Ụbọchị Wenezde kwuru na nọrọ n'ụlọajhụ ga-amalite n'elekere isi nke mgbde Wenezde rue Elekere isii nke mgbede Tọzde.

    Ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka ntuliaka nọrọ n'ụbọchị Wenezde chutuo aka na-achị steeti ahụ bụ Yusuf Kabir, bụ onye Inec kpọpụtara dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ e mere n'ọnwa Maachị ma nye Nasiru Gawuna mmeri.

  15. Ụlọikpe akpọpụtala Nasiru Gawuna nke APC onye meriri n'ọkwa Gọvanọ Kano Steeti

    Ụlọikpe achụọla Abba Kabir nke NNPP dịka gọvanọ Kano Steeti

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kano Steeti achụọla Gọvanọ Abba Kabir Yusuf nke New Nigerian Peoples Party (NNPP) ma were Nasiru Gawuna nke All Progressive Congress (APC) dochie ya dịka onye meriri na ntuliaka e mere na 18 Maachị.

    Ụlọọrụ Inec kpọpụtara Yusuf dịka onye meriri na ntuliaka ahụ bụ nke ụlọikpe kụchapụrụla ugbua.

    Nke a mere mgbe Pati APC na onye ji ya zọọ ọkwa bụ Nasiru Gawuna mara mmeri Abba Kabir Yusuf aka n’ụlọikpe.

    Ndị ọkaikpe ji ikpe ahụ nke ọkaikpe Oluyemi Akintan-Osadebay kwuru na vootu dị 165,663 nke Yusuf nwetere bụ vootu adịgboroja.

    Ha kwuru na e binyeghi aka n’akwụkwọ e jiri tụọ vootu ndị ahụ nke mere na ha adịghị ire.

    Na ngwụcha ntuliaka ahụ n’ọnwa Maachị, Inec kwuru na Yusuf nweteburu akara vootu dị 1,019,602 nke merie Gawuna nweteburu vootu 890,705.

    Akụkọ ka na-abịa.

  16. Afrịka bụ igodo e ji agbape ọganihu mbaụwa - Onyeisiala Tinubu

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tibubu enyela mgbasaozi mbụ ya n’ọgbakọ otu United Nations n’isi ụtụtụ Wenesde n’obodo New York mba Amerịka.

    Okwu ya gbatụrụ ụkwụ na mkpa ọ dị mba Afrịka ịgafe ọgbatauhie nke ndị Bekee iwere akụrụngwa ha ma ruo n’ogogo ahụ ruturu ha.

    O kwuru na mba ndị gbapụtara ihe kwesịrị ịgba hụụ na Afrịka bụ ebe mepere emepe nakwa nyere ha aka ibuso mgbanwe ihu eluigwe agha.

    O kwuru na nsogbu chere Afrịka n’ihu bụ ọdịda ọchịchị nke na-eme ka ọ ghara imepe ọfụma, mana nkwa nke ndị ofesi na-ekwe ndị Afrịka na-emeghi ha, tinyere mkpagbu ha so n’ihe na-enyekwa Afrịka nsogbu.

    O kwuru na isiokwu ọgbakọ nke afọ a pụtara nnukwu ihe nye mba Afrịka.

    O kwuru na nsogbu akụnaụba na ndọrọ ndọrọ ọchịchị chere mba Afrịka n’ihu dị iche na nke cheere mba Yorupe n’ihu na-agbanyeghi mbaụwa nke metụtara ebe ahụ.

    Tinubu kwuru na mba Afrịka anaghị achọ ka e mee ha ka e si mee ibe kpọmkwem kama ka mbaụwa tinye uchu n’ịhụ na nwetere oke nke ahụ ruuru ha.

    O kwuru na ọ bụru isokwu ọgbakọ nke afọ nwere ihe ọ pụtara nye mbaụwa, na ha kwesịrị ịgba mbọ maka mwulite mba Afrịka maka ọ dị mma nke mba na-abụghị naanị nke Afrịka.

    Tinubu gara n’ihu kwuo na Naịjirịa nakwa mba Afrịka ndị ọzọ na-anabata ndị ahụ na-ahụta na ha dị mkpa maka mwulite mbaụwa.

    Na ngwụcha Tinubu kwuru na Afrịka achọghị ka e meere ya ebere, na ọ bụghị nsogbu kama na ọ bụ igodo e ji agbapụ ọganihu mbaụwa.

  17. I nwereike ịmalite ịkwụ ụgwọ tupu ibanye n’akara Twitter e ji X maara

    Elon Musk ekwuola na ndị mmadụ nwereike ị na-akwụzi ụgwọ tupu ha abanyere n’akara soshal midia X nke e ji bụ Twitter maara.

    Na mkparịtaụka ya na praịm minista mba Isreal bụ Benjamin Netanyahu nwere, idejiego a kwuru na ịkwụ ụgwọ bụ otu ụzọ a ga-esi ebuso akara adịgboroja agha.

    “Anyị na-achọ ka ndị mmadụ na-akwụ obere ego kwa ọnwa maka iji ọbaozi anyị eme ihe,” ka nwamadị a kwuru.

    BBC kpọtụụrụ ụlọọrụ X maka nkọwa mana o nwebeghi azịza ọbụla ha nyere.

    O dobeghi anya ma nke a ọ bụ okwu nkịtị ka ọ bụ atụmatụ ha choro ime n’ezie.

    Na mbụ Elon Musk kwuru na ihe ọ ga-eji gboo nsogbu akara adịgboroja na soshal midia bụ ị na-ana ndị mmadụ ego iji nye ha ọkọlọtọ.

    Kamgbe o weere ọkwa dịka onyeisi Twitter, ọ na-etinye anya n’ụzọ ọ ga-eji na-ana ndị mmadụ ego iji nwete ezi ahụmihe bụ nke a kpọrọ X Premium.

    Mana ugbua ndị mmadụ ka na-eji akara X ezirita ozi n’efu.

  18. Ndị ntọ atọrọla Fada Obioma Okide nke ụka Katọlik Enugwu

    Ụka Katọlik nke Dayọsis Enugwu ji anya mmiri na-ekwụpụta na ndị ntọ tọọrọ ụkọchukwu ha bụ Fada Marcellinus Obioma Okide n’ụbọchị 17 September, 2023.

    N’ozi odeakwụkwọ Dayọsis ahụ bụ Fada Wilfred Chidi Agubuchie wepụtara, kwuru na a tọọrọ Fada Okide n’okporoụzọ Eke-Egede-Affa mgbe ọ kụrụ elekere ise nke mgbede (5:00pm).

    O kwuru nke a mere mgbe o si Enugwu na-alaghachị n’ebe ọzụzụ atụrụ ya bụ St. Mary Amofia-Agu dị n’obodo Affa.

    Dayọsis a rịọrọ ndị mmadụ ka ha kpee ekpere n’isi Fada Okide ma rịọ ka Chineke metụ ndị a aka n’obi ka ha tọhapụ ya.

  19. Igbo mma mma nụ ooo!

    Ndewo nụ n'ụbọchị taa, Biko buru oche gị bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  20. Nzụkọ gọọmentị etiti na NLC amịtaghị mkpụrụ

    Nzụkọ dị n'etiti gọọmentị etiti nakwa ndị isi Nigeria Labour Congress bụ NLC n'ịchafụ abịala na njedebe n'amịtaghị mkpụru.

    Minista ọrụ bụ Simon Lalong, Minista obere n'ọrụ bụ Nkeiruka Onyeajeocha nakwa ụfodụ ndị isi NLC gụnyere Joe Ajero nwere nzụkọ ahụ taa bụụbọchị Monde n'Abuja.

    Ha mere nke a iji hụ na enweghizi abụbụọrụ ọzọ otu NLC ga-ahazi iji gosi iwe ha maka iwu gọọmentị dị icheiche ha kwuru na-akapgbu ndị mmadụ.

    Minista Lalong kwere nkwa ijikọ otu NLC aka ọnụ ịhụ na-emezuru ọchịchị ha niile n'ụzọ ziri ezi. Ọ rịọkwara ndị isi otu ahụ ha wetuo obi sachaa anya na mkparịtaụka ha na-enwe.

    N'aka nke ya Joe Ajero bụ onyeisi NLC kwuru na ọ bịara nzụkọ taa ịhụ ma o nwere ihe ga-adị iche dịka o kwuru na nzụkọ ndị emeburu n'oge gara aga enweghi isi.

    A na-atụ anya na a ga-ehibe nzụkọ ọzọ n'etiti ndị a.