Mmadụ abụọ anwụọla dịka ndị oji egbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ebonyi steeti

Ndị uweojii gbagburu otu n'ime ndị omekome wakporo ụlọọrụ ha dị n'Ugbuodo, n'okpuruọchịchị Ebonyi dị n'Ebonyi steeti.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Anyị anwụchiela otu onye ọzọ so wakpoo ụlọmkpọrọ Owere - Ndị Uweojii Imo steeti

    Onye a na enyo enyo na o so wakpoo ụlọ mkpọrọ Owerri

    Ebe foto si, Imo State Police

    Nkọwa foto, Onye a na enyo enyo na o so wakpoo ụlọ mkpọrọ Owerri

    Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela otu nwoke ha kwuru na ọ bụ onye ekperima ma bụrụkwa onye a na-enyo enyo maka iso wakpoo ụlọ mkpọrọ Owere.

    Orlando Ikeokwu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti, kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zipụtara na mgbede Sọnde.

    Ikeokwu kwuru sị: "Nwoke a bụ Michael Osundu bụ onye Owere mana ọ na-ekwu na o bi na London, United Kingdom."

    "Anyị nwuchiri ya n'ihi okwu gbasara ihe ndị ekperima na-eme na steeti a, anyị na-arọkwa ya anya dịka otu n'ime ndị ekperima wakporo ụlọ mkpọrọ Owere nakwa isi ụlọọrụ ndị uweojii n'ụbọchị ise nke ọnwa Eprel."

    "Oge a nwuchiri ya, anyị hụrụ otu egbe 'pump action' n'aka ya, nakwa mgbọ egbe iri abụọ na isii."

    "Anyị hụkwara akwa ndị uweojii bụ nke o zoro n'ụgbọala ya."

    "Oge a gbara ya ajụjụ ọnụ, o kwuru na ọ bụ onye uweojii nwetara ọzụzụ n'ụlọ akwụkwọ ndị uweojii dị n'Ikeja."

    "Onyeisi ndị uweojii Imo steeti enyela iwu ka a malite nnyocha miri emi iji chọpụtachaa kpọmkwem ndị ha na nwa amadị ahụ na-arụkọ ọrụ."

  2. Ụnụ abọọla chi

    Igbo ndị ọ ga-adịrị mma, ụtụtụ ọma nụ.

    Ka izu ụka ọhụrụ a mịtara gị mkpụrụ ọma.

    Ngwa ka anyị gbapụ ya ọsọ na mgbasaozi nke taa.

    Daalụ dịka ị na-esonyere anyị.