Mmadụ abụọ anwụọla dịka ndị oji egbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ebonyi steeti
Ndị uweojii gbagburu otu n'ime ndị omekome wakporo ụlọọrụ ha dị n'Ugbuodo, n'okpuruọchịchị Ebonyi dị n'Ebonyi steeti.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ụgbọala ndị na-eso gọvanọ Oyo steeti akụgbuola otu nwatakịrị
Ụgbọala gọvanọ Oyo steeti bụ Seyi Makinde akụọla otu nwatakịrị n'Ogbomoso dị na steeti ahụ .
Gọvanọ Makinde, onye kwupụtara nke a n'akara Twitter Twitter kwuru na ọ bụ onye kwọ ụgbọala ọ mịchapụrụ n'aka kụgbụrụ nwata ahụ.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Onyeisiala Buhari atụọla ụkwụ na Naịjiria
Onyeisiala Muhammadu Buhari alọghachịtala Naịjiria ka ọ gachara nzukọ na mba Frans.
Cheta na ọ gara nzukọ a kpọrọ 'African Finance Summit' ebe ha gbadoro anya n'ihe gbasara etu a ga-esi kwalite akụnaụba Afrịka ka mkpamkpa covid-19 metụtachara ya.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Gọvanọ Ayade awụpụla na PDP wụba APC

Ebe foto si, Cross River Government
Aka na-achị Krọs Rivas bụ Ben Ayade agbahapụla otu PDP, wụba na APC
Ayade kwupụtara uche ya dịka ya na ndị gọvanọ APC isii na ndị ụọmewu ụfọdụ bịara zute ya n'obi gọọmentị dị n' n' Uyo, isiobodo steeti ahụ n'ụtụtụ Tozde.
Ayade kwuru ya ihe mere ya ji sonyere APC bụ n'ihi ezi agwa Onyeisiala Muhammadu Buhari ya na ịdọbata Krọs Riva na pati ebe ọ na-eme.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
BBC Nkeji nke ehihie
Gere akụkọ BBC Igbo n'ime otu nkeji.
Ịmachi ichi ehi dịka ịmachi ịzụ ahịa 'spare parts' - Malami

Ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami ekwuola na ndị gọvanọ enweghị ikike ịmachi ndị ọchị ehi ịchịgharị ehi ha na mpaghara Naịjirịa ọbụla ha chọrọ.
Malami kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Channels TV nwere n'abalị Wenezde.
O kwuru na iwu Naịjirịa nyere onye ọbụla ikike ịkpagharị n'akụkụ Naịjirịa ọbụla sọrọ ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na ịmachi ndị ọchị ehi ịchịgharị ehi ha dịka ndị gọvanọ ndị ugwu ịmachi ịzụ ahịa akụrụngwa ụgbọala na steeti ha.
Malami kwuru sị: "Dịka iwu Naịjirịa si dị, mmadụ o nwere ike igbochi mmadụ ịga maọbụ ibi ebe ọbụla sọrọ ya?"
"Ọ dị ka ndị gọvanọ mpaghara Ugwu ịbịakọta ọnụ kwuo na ha amachiela ịzụ ahịa akụrụngwa ụgbọala na steeti ha. Ọ ga-ekwe omume?"
"Ọ bụrụ na e nwere akụkụ iwu ọbụla na-enye nsogbu, usoro ka mma ga-abụ ndị ụlọ omeiwu itinye ya anya ma gbanwee ya."
"Ọ bụ nnukwu ihe ọjọọ ka gọvanọ ọbụna chee na o nwere ịmachi ndị mmadụ ịkpagharị n'obodo etu o si chọọ."
Gịnị mere ụmụnwaanyị agaghị alụ di ole masịrị ha? - Gọọmentị Saụt Afrịka

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị mba Saụt Afrịka na-atụle ịhazigharị iwu na-achịkwa alụmdi na nwunye na mba ha dịka o wepụtara ụfọdụ ihe ọhụrụ ha tinyere.
N'ime ha gụnyere ime iwu ga-eme ka nwaanyị lụọ di abụọ maọbụ karịa n'otu ugboro, nke a kpọrọ 'polyandry'.
Dịka ọ dị ugbua, a ka na-atụle iwu n'etiti ndị ọha mba Saụt Afrịka mana ọ bụrụ na nke a mee, ọ ga-abụ oke ihe nye mba Afrịka.
Mana ọ bụghị mmadụ niile nabatara atụmatụ a.
Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ ugbua bụ "Gịnị mere Saụt Afrịka ji chọrọ iwepụta iwu a?"
Gọvanọ Umahi agwala ndị ọrụ ya kọwaa ihe e jiri gbaa ụlọọrụ Inec ọkụ

Ebe foto si, Ebonyionline/Facebook
Gọvanọ Ebonyi agwala ndịisioche ọkpuruọchịchị obodo atọ na kọmishọna na-ahụ maka okpuruọchịchị obodo ka ha zaa ajụjụ banyere ọkụ a gbara ụlọọrụ Inec atọ dị n’obodo ha na-achị.
Umahi sị ka ndị a dee akwụkwọ ma kọwaa ihe mere ha enweghi ike chekwaa ụlọọrụ Inec abụọ a gbara n’Ebonyi n’ụbọchị Wenesde.
O kwuru nke a dịka ha mechara nzuko ndịisiọchịchị steetị ahụ bụ ebe kọmishọna mgbasaozi bụ Uchenna Orji wepụtara akwụkwọ ozi a.
O nyere odeakwụkwọ gọọmentị iwu ka o zigaara mmadụ anọ akwụkwọ ozi a kpọrọ ‘query’ na bekee ka ha kọwaa ebe mmiri si banye n’opi ụgbọghọrọ.
Ndị nke metụtara gụnyere kọmishọna na-ahụ maka okpuruọchịchị obodo bụ Samuel Okoronkwo, onyeisioche okpuruọchịchị Ezza North bụ Nora Alo na Chinyere Nwaogbaga nke okpuruọchịchị Ebonyi.
Cheta ndị ekperima wakporo ụlọọrụ ndị Inec abụọ dị n’okpuruọchịchị obodo ndị a ma kpọọ ha ọkụ n’ụbọchị Wenesde.
BBC Nkeji nke ụtụtụ
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.
Nigeria Labour Congress akwụsịla abụbụọrụ ha gbara na Kaduna Steetị

Ebe foto si, NLC
Otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress akwụsịla abụbụọrụ ha na-agba na Kaduna Steetị maka ọchụchụ ndị ọrụ dịka minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige tinyere ọnụ n'okwu ahụ.
Onyeisi otu a bụ Ayuba Wabba sị na mkpebi a bụ iji zaa oku gọọmentị etiti kpọrọ ha maka ikpe udo n'etiti ndị ọrụ na gọọmentị Kaduna Steetị.
N'otu aka ahụ onye otu a kpọrọ Ayuba Magaji gwara BBC na ha kagburu abụbụọrụ ahụ n'ehihie Wenesde mana n'ụbọchị Tọsde na ha ga-aga n'Abuja ịmalite mkparịtaụka ha na ministri na-ahụ maka ndị ọrụ.
"N'ezie anyị akagbuola abụbụọrụ ahụ mana na Tọsde anyị ga-aga Abuja ebe anyị na ministri na-ahụ maka ọrụ ga-amalite mkparịtaụka."
Ozi a ga-abụ ihe ọṅụ nye ndị bi na Kaduna dịka ha enwebeghi ọkụ na mmanụ ụgbọala kamgbe ụbọchị Sọnde.
Kamgbe ụbọchị atọ gara aga ka ndị ọrụ malite ime ngagharịiwe na Kaduna maka ọchụchụ n'ọrụ gọọmentị steetị ahụ chụrụ ndị ọrụ puku asaa.
Igbo ndị ọma unu abọọla chi?
Obi ụtọ ka anyị ji anabata unu n'ụbọchị taa n'ọgbakọ BBC Igbo.
Ka ọ dị n'ụtụtụ
Daalụ maka ịnọnyere anyị taa.
Ka anyị zute echi
Malawi akpọọla ọgwụ mgbochi covid-19 karịrị 19,000 ọkụ

Ebe foto si, Getty Images
Mba Malawi akpọọla ọgwụ mgbochi covid-19 karịrị puku iri na itoolu mebiri ebi ọkụ.
Mịnịstrị ahụike ha kwuru na ha mere nke a n'ihi na enweghi ihe nkọwa na-ekwu ma ọgwụ ndị a ọ ga-arụ ọrụ ọfụma ma oge e kwesịrị ịgba ya gafee.
Akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa
Lampard na Bergkamp abaala 'Hall of Fame'
E debala aha Frank Lampard nke Chelsea na Dennis Bergkamp nke Arsenal na nzere ọkaibe 'Hall of Fame' nke Premia Ligi.
Ha esonyela Alan Shearer, Thierry Henry, Eric Cantona na Roy Keane na ndị nwere nzere a.
Skip X post, 1Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Skip X post, 2Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
A nwụchiela mmadụ atọ si mkpọrọ Owere gbalaga
Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ si ụlọmkpọrọ dị n'Owere Imo steeti gbawarala n'abalị ise nke ọnwa Eprelu afọ 2021.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweweojii na steeti ahụ bụ Elkanah Bala kwuru na a nwụchiri Cosmas Mbamara, onye Ohakpu dị na Mgbidi, N'Okpuru Ọchịchị Oru West, bụ onye a na-ekpe ikpe maka igbu mmadụ; Okafor George Chisom onye Ezeachi, n'Okpuru Ọchịchị Orlu bụ onye aka ya dị n'ogbugbu ndị mmadụ nakwa Nwankwo Levi nke mpaghara Okigwe bụ onye a nwụchiri maka ntọ na iji egbe aga ohi.

Ebe foto si, Imo Police Command

Ebe foto si, Imo Police Command
Onye m mejọrọ gbaghara m - Ordinary President

Ahmed Isah, onye e ji 'Ordinary President' mara arịọla mgbaghara maka iti nwaanyị ihe n'emume redio ya bụ 'Brekete Family'.
Ahmed rịọrọ mgbaghara a n'emume Brekete Family n'ụtụtụ Wenezde.
Nke a na-abịa dịka BBC wepụtara akụkọ nnyocha etu Ordinary President siri maa nwa agbọghọ ahụ ụra, n'ihi ihe ọjọọ o mere nwatakịrị site n'ịmụnye ya ọkụ n'isi.
O kwuru sị: "Ana m arịọ onye ọbụla m mejọrọ n'ụzọ ọbụla ka ọ gbaghara m."
"Bikonu, mmadụ ka m bụ. Enwere m ike imehie mgbe ụfọdụ."
"Oge ọbụla m mehiere maọbụ mee ihe na-adabaghị adaba, ana m arịọ mgbaghara ma m chọpụta na ihe m mere adịghị mma."
"Maka ndị niile m mejọrọ, biko gbagharanụ m."
Mana Ahmed gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị iro ya na-agba ya mgba n'ihi ọrụ ọma ọ na-arụ, mana o kwuru na ya ga na-aga n'ihu n'ọrụ ya.
Oge iji ọkwa gọọmentị afọju akpa agala - Uzodinma

Ebe foto si, Imo State Government
Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma ehiwela ndị isi ga na-elekọta ngalaba anọ nke gọọmentị na steeti ahụ.
Ndị isi ngalaba ndị a gụnyere: Julie Onyeukwu (Civil Service Commission), Rosemary Izuogu (Local Government Service Commission), Dkta Dr. Ada Okwuonu, (Imo State Universal Basic Education Board) na Emeka Udegbulem,(Imo State Internal Revenue Service).
Uzodinma, onye duru ha iyi ọrụ n'ime Obi Gọọmenti n'Owere dọrọ ha aka na ntị sị, "oge ndị gọọmentị họrọ ọrụ ji agaala. Oku a bụ maka iji ịkwụkwa aka ọtọ gbaara ndị Imo steeti odibo".

Ebe foto si, Imo State Government
Lee foto ụlọọrụ ndị Inec a gbara ọkụ n'Ebonyi steeti
Onye ntaakụkọ BBC setere foto gosiri mmebi ụlọorụ ndị Independent National Electoral Commission (Inec) dịka a mụnyechara ya ọkụ taa n'okpuruọchịchị Ezza Nọt n'Ebonyi steeti.




BBC Nkeji nke ehihie
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.
