Gọvanọ Imo Steetị bụ Hope Uzodimma etinyela aka n’akụkwọ
iwu abụọ metụtara nchekwa nakwa ịhazi okeala na steetị ya.
E ji iwu ndị a hiwe ngalaba Imo State Security
Organisationnakwa Imo State Land
Administration and Geographic Information.
Gọvanọ kwuru nke a dịka o tinyechara aka n'akwụkwọ iwu ahụ mgbe ya na ndịisi ọchịchị ya nwechara nzuko.
Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook
Ọ sị na iwu abụọ ndị a ga-ebuagha megide mpụ, ohi na ihe ndị ọzọ gbasara nchekwa na steetị Imo ebe nke ọzọ ga-ahụ na okeala agaghị abụ nsogbu n'Imo steetị.
Gọvanọ Uzodimma kelere ndị omeiwu Imo Steetị maka ịdọnyere ya ukwu iji hụụ na iwu ndị a dị ire.
Ọ dọrọ ndị na-eji ahụghọ akpara ala gọọmentị nakwa nke ndị mmadụ aka na ntị ka ha wepụ aka enwe n'ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ.
BBC Nkeji nke ụtụtụ
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.
El-Rufai achụọla ndị nọọsụ niile sonyere na ngagharịiwe ndị NLC
Ebe foto si, El-Rufai/Twitter
Gọvanọ Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai achụọla ndị nọọsụ niile na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ nke steeti nwe, malite na ndị erubeghị ogoogo nke iri na anọ gbadawa.
O kwuru na ndị nọọsụ a sonyere n'ịgba abụbụ ọrụ nke otu 'Nigeria Labour Congress haziri na steeti ahụ na mmalite izuụka a.
El-Rufai kwuru na abụbụ ọrụ ahụ ezighi ezi n'iwu, ya mere ndị niile sonyere na ya abụrụla ndị enweghịzi ọrụ.
Ndị NLC na-ewe iwe maka ọchụchụ gọọmentị Kaduna steeti chụrụ ndị ọrụ karịrị puku asaa.
Ha na-ekwu na gọọmentị akwụghị ndịọrụ ahụ ụgwọ tupu a chụọ ha n'ọrụ, ma kwukwaa na ha ga eme ngagharịiwe otu izuụka iji kwupụta uche ha.
Mana gọọmentị Kaduna kwuru na onweghị ihe ga-eme ka ha laghachi azụ na mkpebi ha ịchụ ndị ọrụ ahụ.
El-Rufai kọwara na ego adịghị a ga-eji na-akwụ ndị ọrụ ahụ ụgwọ ọnwa.
Ụtụtụ ọma
Igbo ndị ọma ụnụ asaala chi.
Kedụ ka eke si anya anwụ?
Nkeji coronavirus nke taa
Lee akụkọ banyere coronavirus n'Afrịka dị mkpa taa:
Naomi Campbell eritela nwa ọhụrụ
Ebe foto si, PA Media
Onye ihe ngosi na ihe ejije a ma ama n'Ụwa bụ Naomi Campebl amụọla nwa ọhụrụ, nwa mbụ onogoli nwaanyị ahụ dịka ọ gbarala afọ 50.
Campbell bụ onye kwupụtara nke n'akara Twitter ya sịrị na " Ọ marịcha ngọzị họrọ m ka bụrụ nne ya."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Buhari edegarala Sineti akụkwọkwọ maka mbite ego dị ijeri dọla isii
Ebe foto si, Presidency
Onyeisiala Muhammadu Buhari edegarala ụlọomeiwu sineti akwụkwọ ka ha kwado ya ibite ego karịrị ijeri dọla isii ($6.183 billion)
Onyeisi ndị Sineti bụ Ahmad Lawan gụpụtara akwụkwọ a Buhari ziteere ha n'ọgbakọ ndị omeiwu n'Abuja n'ụbọchị Tuzde.
Buhari kwuru na mbite ego ahụ so n'atụmatụ bọjeetị afọ 2021 bụ nke gọọmentị binyerela aka.
O kwukwara na ebe ha chọrọ isi gbazite ya bụ ego bụ n'ụlọahịa mba ụwa a kpọrọ 'International Capital Market'.
Ọ kọwara na ọmụrụnwa Naịjirịa ga-akwụ n'isi ego ahụ pere mpe na 'International Capital Market' karịa ebe ndị ọzọ.
Gọvanọ Ogun steeti achụọla onye ọrụ ya a nwụchiri n'Amerịka maka 'Yahoo'
Ebe foto si, Dapo Abiodun/Instagram
Nkọwa foto, Dapo Abiodun bụ gọvanọ Ogun steeti
Gọvanọ Dapo Abiodun nke Ogun Steeti achụọla Abidemi Rufai n'ọrụ dịka onye ndụmọdụ ya.
Abidemi Rufai bụ nwa amadị ahụ a nwụchiri na mba Amerịka n'ihi ebubo na ọ bụ onye ohi na ịntaneetị.
N'ozi si n'aka Kunle Somorin, onye bụ onyeisi mgbasaozi Dapo Abiodun, o kwuru ka nwa amadị ahụ ga chịrị akwa ya ebe ọ sara ahụ.
Somorin kwuru sị: "Ihe anyị na-ekwu bụ ka e mezuo ihe iwu kwuru."
"Ọzọ bụ na Gọvanọ ewepụla ya n'ọkwa ka ọ ga zara ọnụ ya n'ebubo e boro ya."
Etu e si nwuchie onye enyemaka Gọvanọ Ogun steeti n'Amerịka
Ebe foto si, Screenshot
Mba Amerịka anwụchiela nwa amadị Naịjirịa aha ya bụ Abidemi Rufai n'ihi ebubo izu ohi ịntaneetị nke bekee kpọrọ 'Internet Scam'.
Akụkọ na-ekwu na Abidemi Rufai bụkwa onye na-arụrụ Gọvanọ Ogun Steeti bụ Dapo Abiodun ọrụ enyemaka, a kpọrọ 'Senior Special Assistant' na Bekee.
Otu FBI nke mba Amerịka kwuru na Abidemi Rufai zuru ihe karịrị dọla 350,000 n'ime ọnwa isii n'afọ 2020.
Ego a bụ ego gọọmentị Amerịka wepụtara a ga-enye ndị mmadụ iji kwadoo ha maka ihe isi ike sitere n'ọnọdụ mkpọchị obodo maka Covid-19.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ndị FBI nwụchiri Abidemi Rufai n'ụbọchị Fraịde, abalị iri na anọ nke ọnwa Mee 2021, n'ọdọụgbọelu JFK nke dị na New York, oge ọ chọrọ ịlọghachi Naịjirịa.
Ha kpụpụrụ ya n'ụlọikpe nke mbụ n'ụbọchị Satọde, mana a ga-akpụgakwa ya ụlọikpe echi bụ Wenezde iji malite ya bụ ikpe n'uju.
Na nkọwa ndị FBI, Rufai Abidemi ji aha ndị mmadụ were nakọrọ ego kwesịrị irute ha site n'aka gọọmentị Amerịka maka coronavirus.
INEC ga-ezute ndị isi ọrụ nchekwa n'ihi mmebi ụlọọrụ ha
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Mahmood Yakubu, onyeisioche INEC
Ngalaba Independent National Electoral Commission (Inec) ekwuola na ha na ndị isi ọrụ nchekwa na Naịjirịa ga-enwe ọgbakọ gbasara ụlọọrụ ha a na-awakpo ma na-emebi n'akụkụ Naịjirịa niile.
Onye kwuru nke a bụ Rotimi Oyekanmi, onye bụ onyeisi mgbasaozi nye Mahmood Yakubu, onyeisioche INEC, oge ya na ndị ntaakụkọ Punch na-enwe mkparịtaụka.
Nke a na-abịa dịka ndị ekperima wakporo ụlọorụ INEC n'Enugu ụbọchị Mọnde, kurie ụfọdụ akụkụ ụlọ ahụ ma gbaa ụgbọala niile dị n'ime ya ọkụ.
Chetakwa na ụlọorụ INEC dị n'Obollo-Afor gbakwara ọkụ abalị olemole gara aga.
Oyekanmi kwuru na ụlọọrụ Inec emebirila maọbụ gbaa ọkụ n'ime afọ abụọ gara aga eruola iri abụọ na otu.
O kwuru sị: "Mwakpo ndị a agaghị eme ka INEC ghara ịrụ ọrụ ha nke ọma n'akụkụ Naịjirịa niile dịka iwu si nye ya ikike."
"Mana anyị agaghị agbachi nkịtị ka ihe dị otu a mere na-aga n'ihu."
"Ọ bụrụ na ha mere otu a na-aga, o nwere ike imetụta etu anyị si akwado maka ime ntuliaka, nke bụ ihe iwu nyere anyị ikike ka anyị na-eme."
"Ndị isi INEC na steeti niile dị na Naịjirịa ga-enwe ọgbakọ n'ụbọchị Wenezde iji tụọ alo ihe a ga-eme."
"Ọgbakọ nke a gachaa, anyị na ndị isi ọrụ nchekwa ga-enwekwa ọgbakọ ọzọ maka na e mee ngwangwa e meghara ọdachi."
Igbo bụ Igbo, ụnụ asaala chi
Ọ na-abụ emepee ụzọ, e mepee ọnụ.
Onye bichiri ụzọ ji ụgwọ ekele mgbe niile.
Ya ka anyị ji agọ ọfọ ka ụbọchị taa wetara anyị niile ihe ọma o.
Anwuchiela otu onye eboro ebubo ntọ si ụlọmkpọrọ Owerri waa
Ebe foto si, Olando Ikokwu
Ndị uweojii Imo steeti anwuchiela otu nwoke gbara afọ iri atọ na ise (35) aha ya bụ Eze Obinna bụ onye si n'ụlọmkpọrọ gbapụọsọ mgbe ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ wakporo isi ụlọọrụ ndị nga dị n'Owere n'ụbọchị ise nke ọnwa Apreelu.
Nwaamadị a so na ndị ana achọ achọ maka ebubo ntọ ya na ndị otu ya tọọrọ mmadụ n'ọnwa Disemba 2020.
Mgbe ahụ, Obinna na ndị otu ya tọọrọ otu onye ha napụrụ nde narị Naịra ise (500,000) n'ọba ego ya ma napụkwa dị be ha nde narị Naịra anọ (400,000) iji gbara isi onwe ya.
A na-ekwu na Obinna gbapụrụ ọsọ na nga, ndị uweojii na-ekwu na ọ malitekwara ịkpa nkata ịmalite ọrọaka ya, ebe aka nọ kpara ya ọzọ n'Obinze dị n'Imo steeti.
Kọmishọna ndị uweojii n'Imo enyela iwu ka ejide ndị ekperima niile nakwa ndị buru awo n'ụlọmkpọrọ n'Imo steeti.
Atụhapụla Baba Ijesa - ọkaiwu
Ebe foto si, Baba Ijesa
Akụkọ na-eru BBC ntị bụ na onye na-eme ihe nkiri Nollywood eji Baba Ijesa mara enwerela ohere ịla be ya dịka ọkaikpe tụghapụla ya.
Ogbo anyị na ntaakụkọ bụ BBC Pidgin kwuru na Ọkaiwu Adeshina Ogunlana kwuru na ọ bụ eziokwu na nwa amadị enwetela ikike ịla be ya n'ọnọdụị Bekee na-akpo "bail".
Ọkaiwu Ogunlana sị na ọ bụ n'ehihe Mọnde ka ọkaikpe nyere Baba Ijesa ohere a.
Amabeghị etu okwu a ga-esi aga n'ihu n'oge a.
Ndị uweojii ji maka ebubo mwakpo nwata nwaanyị n'etozughi nwụchie nwoke n'ime izuụka ole maole gara aga.
Nwunye Gọvanọ Enugwu steeti arịọla ndị nne ka ha gbaa mbọ na-agba ọgwụ mgbochi ha kwa mgbe
Ebe foto si, Enugu PS
N'ikpuhe ịzụụka e ji elebara ndị nne na ụmụazị anya, nwunywe Gọvanọ Enugwu steeti bụ Monica Ugwuanyi agwala ndị nne ka ha gbaa mbọ ịgbazu ụmụaka ha ọgwụ mgbochi dịka o kwesiri maka ọdịmma ha.
O kwuru nke a mgbe ọ gara emume ịmalite nke ha kpọrọ Maternal, New Born and Child Health Week (MNCHW) na Modified Integrated Medical Outreach Programme (MIMOP) nke 2021 na Bekee ụbọchị Mọnde na Health Centre Uwani dị n'Okpuruọchịchị Enugu South.
Ebe foto si, Enugu PS
Oriakụ Ugwuanyi gwara ndị nne na ọ dị mkpa ị dị na-edetu ụbọchị eji agba ya bụ ọgwụ mgbochi maka na ụfọdụ na-echefukarị ya.
Ebe foto si, Enugu PS
Ebe foto si, Enugu PS
Ọ gwara ha, "Otu ihe m chọrọ ịgwa unu bụ ka unu gbaa mbọ nwee otu akpa unu ga na-etinye akwụkwọ nille gbasara ụmụ gị. Nke a ga-enyeaka, ọkachasị, ọbụrụ na ị nọghị nso, onye nọ ya ga-akpọgali nwata n'ụlọọgwụ, ga-ewete ihe ọbụla gbasara nwa ahụ n'ime akpa ahụ".
Nwunye Gọvanọ rịọkwara ndị Enugwu ka ha gbaa mbọ ikpuchi onwe ha maka nje coronavirus.
Ndị gọvanọ PDP adụnyela atụmatụ mmachị ịchịgharị ehi ukwu
Ebe foto si, Seyi MAKINDE
Dịka ha si na nzukọ ha mere taa bilie, gọvanọ ndị nọ na Patị People Democratic Party (PDP) ekwuola na ha kwadoro atumatu ịmachị ịchịgharị ehi na-agagharị na Naịjiria.
Ha kwukwara ka Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari wegara ndị omeiwu akwụkwọ ka ha kwado atumatụ Bekee kpọrọ "State Police".
N'otu aka ahụ, ha na-akpọkwa oku ka ahaziaghari Naịjirịa n'ọnọdụ Bekee kpọrọ "Restructuring".
Gọvanọ ndị gara Ọgbakọ ahụ bụ Seyi Makinde nke Oyo steeti, Nyesom Wike nke Rivers steeti, Samuel Ortom nke Benue, Okezie Ikpeazu nke Abia, Aminu Waziri Tambuwal nke Sokoto steeti.
Ndị ọzọ bụ:
Ahmadu Fintiri (Adamawa), Udom Emmanuel (Akwa Ibom), Bala Mohammed (Bauchi), Duoye Diri (Bayelsa), Ben Ayade (Cross Rivers), Ifeanyi Okowa (Delta), Ifeanyi Ugwuanyi (Enugu), Godwin Obaseki (Edo).
Osote gọvanọ Zamfara bụ Aliyu Gusau nọchitere anya gọvanọ Bello Matawalle na ya bụ ọgbakọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Nkeji Coronavirus
Anyị Egbuola ndị Boko Haram 40 ebe ha nọ na-eme nzukọ - Ndi agha Naịjirịa
Ebe foto si, Ndịagha Naịjirịa
Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ha egbuola mmadụ 40 n'ime ndị Boko Haram nọ na-eme ọgbakọ n'obodo Dawuri dị n'okpuru ọchịchị Konduga nke Borno Steeti.
Otu onye agha ma maka ihe a mere sị na mwakpo a ha wakporo Boko Haram bịara dị ka ha mechara nchọpụta na ndị a na-achọ ịwakpo obodo Maiduguri.
Nsogbu sotere nchekwa ezuoke na Naịjirịa na-etinye onyeisiala Muhammadụ Buhari na gbagharịa nke ukwuu.
Ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa na-achọ ịkwụsị mkpa mkpa ndị ji maka ofufe akpa ike, ndị ntọrị, ndị chọrọ nkewa nakwa ọtụtụ ndị omekome dị iche iche na mba ahụ.
Gọọmentị Anambra etinyela mmachị mkpagharị n'Omor na Anaku
Ebe foto si, Willie Obiano/Facebook
Nkọwa foto, Willie Obiano
Gọọmentị Anambra steeti etinyela mmachi mkpagharị, bekee kpọrọ 'curfew', n'obodo Omor na Anaku ebe enwere ọgbaaghara abalị olemole gara aga.
Ode akwụkwọ gọọmentị Anambra bụ Solo Chukwuelobe kwuru nke a n'ụbọchị Sọnde.
Ya bụ mmachi mkpagharị ga-amalite n'elekere asaa nke abalị ruo elekere isii nke ụtụtụ kwa ụbọchị ruo oge gọọmentị ga-ekwu ka ọ kwụsị.
"Gọọmentị enyela ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha hụ na onye ọbụla rubere isi na mmachị mkpagharị a iji mee ka udo chịa."
Chukwuelobe kwukwara na gọọmentị ewepụla mmachị mkpagharị nke ha tinyere n'okpuru ọchịchị Ayamelum n'ihi ọgbaaghara dapụtara na mpaghara ahụ n'oge gara aga.
Obodo mmachi mkpagharị ahụ metụtaburu gụnyere Igbariam, Aguleri, Umueri, Nteje, Awkuzu na Umunya.
Gọvanọ El-Rufia azachiela ndị ọrụ dịka ha kpochiri ebe niile na steeti ahụ
Ọ sị na ọnọdụ mere ha jiri chụọ ndị ọrụ na steeti ahụ agbanwebeghị maka abụbụ ọrụ ndị ọrụ na-agba gbasara mgbaokpuru ha sị na-agba akụnaụba Naịjria.
Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ steeti ahụ militere abụbụ ọrụ abali ise taa bụ Mọnde.
Onyeisi ndị Nigeria Labour Congress na steeti ahụ bụ Ayuba Magaji Sulaiman sị na ya bụ abụbụ ọrụ bụ iji dọọ gọọmentị steeti ahụ aka na ntị ka ha were kpochite ndị ọrụ ahụ ha chụrụ.
N'ụbọchị mbụ nke ya bụ abụbụ ọrụ, ndị otu a mere ngagharịiwe na gburugburu ebe ahụ ọkachasị n'ụlọ omeiwu steeti ahụ.
Ka ọ dị ugbua, ọkụ adịghị na ya bụ steeti nke mmanụ ụgbọala na-adị maka ya bụ abụbụ ọrụ ndị otu ha so agba.
Mgbe ikpeazụ ndị bi na ya bụ steeti hụrụ ọkụ na petrolu anya bụ na Satọde.
Onye ntaakụkọ BBC sị na-ebe niile anaghị ekwoekwo ka o sị adibu.
Ụlọakwụkwọ niile kpochiri akpochị maka na ndị otu National Union of Teachers so na ya bụ abụbụ ọrụ.
Atụrụ anya na ụlọọrụ ndị ọzọ dịka ụlọakụ na ụlọọgwụ ga-agbachi agbachi maka ya bụ abụbụ ọrụ.
Onyeisi ndị NLC bụ Sulaiman sị na ịlaazụ adịghị na ya bụ abụbụ ọrụ abalị ise ebe o metubeghị gọọmentị n'obi ịkpọ ha oku maka nkata.
O na aba mba sị na "gọomentị steeti ahu kporo onye ọbụla n'ọkpa site na-ịchụ ndị ọrụ ruru puku asaa (7000) na-eleghị anya n'azụ echeghị maka ịkwụ ha ụkwọ ntasiobi. Ndị a ha churu bụkwa mmadụ nwere ndị ha na-azụ. Ya bụ agwa ha kpara jọgburu onwe ya. Ọ bụ ya butere abụbụ ọrụ a anyị na-agba. Ka ọ dị ugbua, gọomentị akpọbeghị anyị oku, mana anyị dị njikere mgbe ọbụla ha kpọrọ anyị.
Ebe foto si, Channels TV/Kaduna Govt
Nkọwa foto, Ayuba Wabba, onyeisi NLC na Nasir El-Rufai
Anyị adịla njikere ịgbachi Kaduna niile taa - NLC
Otu 'Nigeria Labour Congress' ekwuola na ha ga-akpọchi Kaduna steeti niile taa iji gosi iwe ha maka ihe gọvanọ steeti ahụ Nasir El-Rufai na-eme ndị ọrụ.
Ayuba Suleima, bụ onyeisi NLC na Kaduna, gwara ndị ntaakụkọ Channels nke a n'abalị Sọnde.
Iwe ndị NLC bụ maka ọchụchụ El-Rufai chụrụ ndị ọrụ karịrị puku asaa n'okpuru ọchịchị dị icheiche na steeti ahụ.
Suleiman kwukwara na ha nụrụ na gọọmentị Kaduna na-akpa nkata ịchụ ndị ọrụ ọzọ ruru 11,000.
"Anyị adịla njikere maka ịgba abụbụ ọrụ nakwa ime ngagharịiwe n'ụbọchị Mọnde," Suleiman kwuru.
"Onye ga-edu anyị na ngagharịiwe a bụ onyeisi NLC bụ Comrade Ayuba Wabba."
"Mmadụ puku asaa na narị asaa ka a chụrụ n'ọrụ n'okpuru ọchịchị dị icheiche, mana gọọmentị ekwukwaala na ha ka ga-achụ mmadụ puku iri na otu ọzọ."
"Ọ bụ nke a mere na ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ anatabeghị ụgwọ ọnwa ha maka ọnwa Eprel."
Mana gọọmentị Kaduna akpọọla ekwe nkụ ma kwuo na onweghị ihe ga-eme ka ha laghachi azụ na mkpebi ha nwere ịchụ ndị ọrụ.
Kọmishọna okwu okpuru ọchịchị dị n'aka bụ Jafaru Sani, kwuru na ọ sọkwa ndị ọrụ ha gbaa abụbụ ọrụ otu afọ, ọ gaghị eme ka gọọmentị gbanwee mkpebi ha.