Man United vs Arsenal: Arsenal ekweghi Man United ṅụrụ mmiri tọgbọ iko

Manchester United vs Arsenal

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

O nweghi onye tụrụ azụ ibe ya n'ala n'etiti Manchester United na Arsenal dịka ha zutere n'asọmpi Premier League.

Asọmpi a dị n'etiti otu egwuregwu abụọ ndị a bụ ọgụ dimkpa abụọ maara onwe ha nke ọma.

Nke a mere o ji raa ha ahụ inye ibe ha goolu rue na ngwụcha ọkara nke mbụ.

Na nkeji 45, Man United bu ụzọ tụọ Arsenal azụ n'ala site na goolu Scott McTominay nyere.

Dịka ọkara nke abụọ malitere na nkeji 58, Arsenal siri ọnwụ ma megwara Man United mgbe Pierre-Emerick Aubameyang nyere goolu.

Dike abụọ ndị a sisara onwe ha ọnwụ niile ha nwereike mana o nweghi onye nyere ibe ya goolu ọzọ.

Mpụtara asọmpi mere ka Man United nọrọ na ndị iri ebe Arsenal bụ ndị anọ n'ogogo tebụlụ Premier league.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: