You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Ihe mere m ji si APGA banye Labour Party' - Victor Umeh
Sịnatọ Victor Umeh bụbu onyeisi otu Pati All Progressives Grand Alliance, APGA, n'aha ịchafụ ekwuola ihe mere o jiri siri n'APGA mafee Labour Party, LP.
N'ajụjụ ọnụ BBC Igbo gbara ya ụnyaahụ n'ekwentị, Umeh sị na ọ bụ okwukwe ya na Onye Igbo ga-abụrịrị Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 kwanyere ya na LP.
Ọ sị, "unu ma na ọteela m tiwere mkpu ka Onye Igbo bụrụ onyeisiala Naịjirịa, ọ bụ Labour Party mejuputaara m ya bụ ebumnobi".
Mgbe onye ntaakụkọ BBC chetere ya otu o si akatọ Peter Obi mgbe mbụ, Umeh zara na "Peter Obi bụ nwaanne m. Ọnweghị ihe na-esere mụ na ya anyị agaghị ekpezili. Iwe nwanne anaghị erụ n'ọkpụkpụ".
Umeh sị na ya chọrọ ịkwado Obi na ndọrọndọrọ nke onyeisiala ọ na-azọ na Labour Party iji mara ka ebumnobi ndị Igbo ọ ga mmezu.
Cheta na, abalị olemaole gara aga, Dozie Nwankwo na-anọchite anyi ndị Anoacha/Dunukofia/Njikoka Federal Constituency n'ụlọomeiwu nta napụrụ Victor Umeh ohere ịzọ ọche Anambra Central senatorial zonụ n'APGA.
Nwantịị ka Nwankwo ji merie Umeh na ya bụ ntuliaka imeụlọ ndị APGA bụ ebe Umeh chigoro dị ka onyeisioche afọ asatọ.
Ha abụọ chịpụrụ ya maka oche nke Anambra Central senatorial zonụ nke Sineti bụ nke Dozie Nwankwo ji vooti dị 162 merie Umeh bụ onye nwere 151.
Ndị tụrụ vootu ndị ahụ bụ ndị otu APGA sị okpuruọchịchị niile dị na ọgbọnta vootu nnọchiteanya sineti ahụ.