Kenneth Okonkwo: 'Ọbụrụ na Labour Party gbanwee, agaghị m ahapụ ha naanị, aga m ebuso ha agha'

Aha onyonyo, Kenneth Okonkwo: Atukwasiri m obi na Peter Obi ga-emezu nkwa o kwere ndị Naịjirịa
Kenneth Okonkwo: 'Ọbụrụ na Labour Party gbanwee, agaghị m ahapụ ha naanị, aga m ebuso ha agha'
Mgbe e biputara ya

Otu n'ime ndị nkwuchiteọnụ n'achụmnta vootu ndị Labour Pati bụ Kenneth Okonkwo ekwuola ihe kpatara o ji hapụ pati All Progressives Congress banye na Labour pati.

Na mkparịtụaka Maazi Okonkwo na BBC Igbo mere, ọ kwuru na ebe obi ya niile dị bụ na Naịjirịa. Ọ dọọrọ aka na ntị na pati ọbụla ghọrịrị ya we ghara imezu nkwa o kwere Naịjirịa, na ya ga-ahapụ ha ma katọọ omume ọbụla.

O kwuru na ntukwasị obi ya nwere n'ebe Peter Obi nọ bụ maka na nkwa niile o na-ekwe bụ ihe ndị o mebụrụla n'oge ọ na-achị Anambra Steeti nke mere ya ji kwesie ike na ọ ga-emezukwa nkwa niile ọ na-ekwe ndị Naịjiria.

Kenneth Okonkwo n'ụlọ ya
Nkọwa foto, Kenneth Okonkwo bụ onye nkwuchiteọnụ achụmnta vootu pati Labour

Kenneth Okonkwo na Ndọrọndọrọ Ọchịchị

Cheta na Kenneth Okonkwo bụ onye a ma ama na-eme ihe onyonyo siri na ime onyonyo wee pụọ, gaa gụọ akwụkwọ maka ịbụ onye ọkaiwu tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọ malitere na pati People's Democratic Party mana o siri ebe ahụ pụta banye pati APC n'afọ 2017. N'afọ 2022, ọ hapụkwara pati APC banyezie Labour ebe e mere ya otu onye nkwuchiteọnụ maka achụmnta vootu ndọrọndọrọ ọchịchị nke Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati Labour.