Ihe chụrụ Kenneth Okonkwo ọsọ n'ọkwa gọvanọ Enugu steeti

Aha nkeananụānụ, Ebubeagu Okafor
Mgbe e biputara ya

Kenneth Okonkwo bụ onye a ma ama na ihe nkiri Nollywood chọburu ịba na ndọrọndọrọ ọchịchị mana ụkwụ akpọla ya.

Okonkwo chọbụrụ ịzọ ọkwa ọchịchị na ntuliaka 2019 n'okpuru pati APC n'Enugwu mana akụkọ pụtara na-ekwu na ọ gbaghị akwụkwọ e ji agba ya bụ ọsọ.

Otu onyeisi na pati APC n'Enugwu bụ Ebubeagụ Okafor gwara BBC Igbo n'ezie Okonkwo esoghị na mmadụ isii ga-azọ ya bụ ọkwa ụbọchị Septemba 30.