Ndị ọchịchị Yahya Jammeh megburu ka na-achọ ikpe ziri ezi ka afọ iri atọ na otu gachara
N'oge na-adịbeghị anya, mba Gambia duru onye ọkachamara iwu nke mba Briten bụ Martin Hackett n'iyi ọrụ, dịka onye ọkaiwu pụrụ iche mbụ nke mba ahụ iji nyochaa mpụ ndị e mere n'oge ọchịchị afọ iri abụọ na abụọ nke Yahya Jammeh onye bụbu onyeisiala.
Oge ọchịchị ya juputara n'ebubo mmekpa ahụ, igbu ọchụ, ndina n'ike, na ndị mmadụ furu efu.
Ka ọ dị ugbua, ndị ihe ike mmegbu ikike mmadụ metụtara na-eti mkpu mmegbu megide igbu oge n'ịhazi ụlọikpe pụrụ iche iji kpee ndị mere ihe ọjọọ ndị ahụ ikpe ziri ezi.
N'agbanyeghị na ECOWAS kwadoro ikpe ahụ ihe karịrị otu afọ gara aga, ụlọikpe eguzobeghị nke mere ka ndị ihe metụtara na-achọ ihe karịrị naanị nkwụghachi ụgwọ.
Fatou Sowe, Nwaanyị e gburu di ya bụ soja gwara BBC na ndị otu Jammeh gburu ya n'afọ 1994, mgbe a na-ekwu na ha gbalịrị ịkwatu ọchịchị mmegwara megide ya.
O kwuru na ọ na-esiri ezinụlọ ahụ ike ịgbaghara onye soja ahụ kwetara na o gburu di ya.
"Ọ dịghị mgbe ọ nwere nchegharị maka ime ya. Ọ bụrụ na o chegharịrị maka ime ya na mbụ wee pụta sị na ọ bụ ya mere ya, anyị ga-aghọta ya. Ee, ọ rịọrọ anyị mgbaghara, mana anyị anabataghị mgbaghara ahụ," ka o kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo: "Ha ebunyeghị m maọbụ ezinụlọ ya ozu, ruo ugbu a. Anyị amaghị ebe ọ nọ. Anyị amaghị ihe ọ bụla gbasara ya. Ya mere, afọ iri atọ na otu a bụ nke siri ike nye anyị."
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Akụkọ Fatou so n'ime ọtụtụ ndị ụlọọrụ na-ahụ maka eziokwu, mmezi na mweghachi bụ TRRC nụrụ, bụ ndị kwadoro ikpe maka mpụ ndị kacha njọ mgbe ha nụrụ ihe akaebe na-agbawa obi sitere n'aka ndị ihe metụtara, ndị bụbu ndị ọrụ nchekwa na ndị akaebe.
E kwuru na Fatou mechara nweta ụgwọ iti aka n'obi n'okpuru atụmatụ nke gọọmenti Gambia wepụtara. Mana ọ ka na-enwe nkụda mmụọ maka igbu oge n'imezu ndụmọdụ ọzọ dị mkpa: ntọala mak iguzobe 'ECOWAS hybrid court', ụlọikpe pụrụ iche nke ụlọọrụ ahụ tụrụ aro ya.
"Igbu oge n'iguzobe ụlọikpe pụrụ iche na-egosi na gọọmenti anaghị echebara ndị ahụ ihe metụtara echiche. Ụfọdụ ndị ihe metụtara anwụọla, ụfọdụ na-arịa ọrịa nke ukwuu ma ike ihe a agwụla ha nke mere na ọ bụrụgodị na akpọọ ha oku, ha anaghị enwe obi ụtọ ịga.'' ka ọ gbakwunyere.
Pa Ousman Njie bụ onye ọzọ nke ọchịchị Yahya Jammeh mejọrọ. E jidere ya n'oge ngagharịiwe ma ndị ọrụ nchekwa tara ya ahụhụ.
"Agaghị m akwado ka a kpee Jammeh ikpe na ịma ya ikpe na mba ofesi n'ihi na ụlọmkpọrọ ebe ahụ dị mma nke ukwuu, mana n'ụlọmkpọrọ Mile Two ebe a, dị njọ," ka o kwuru.
BBC jụrụ gọọmenti Gambia ajụjụ maka igbu oge ahụ mana ha azaghị ajụjụ anyị.
Ugbua, gọọmenti na-akwado ndị ihe metụtara site na ịkwụghachi ha ụgwọ , malite na ndị ihe metụtara site n'afọ 1994 ruo 1996 n'ihi nsogbu ego.
Ọchịchị afọ iri abụọ na abụọ nke Jammeh jupụtara na mmegbu, idina mmadụ n'ike, ndị mmadụ na-efu efu ma igbu ndị mmadụ n'ikpeghị ha ikpe. E gosiri n'aka ya dị kpọmkwem n'ụfọdụ mpụ ndị a, mana ọ na-agọnarị ebubo ndị ahụ.



