Etu mpụtara ntuliaka ọkwa Gọvanọ Ondo steetị si kwụrụ

Ntuliaka ọkwa gọvanọ Ondo Steeti abịawala na mpịachị dịka a na-akpọpụtazi mpụtara ya.
Ntuliaka ahụ mere n’ụbọchị Satọde 16 Nọvemba, 2024 n’ọgbọ atụm vootu (polling unit) dị 3,933 nke dị n’okpuruọchịchị iri na asatọ nke steeti ahụ.
Ndị mmadụ debanyere aha iso tụọ vootu n’Ondo steetị 2,053,061 mana naanị mmadụ 64,273 weere akwụkwọ e ji atụ vootu bụ ‘voters card’ n’ime kaadị ruru 89,777 e bugara na steetị ahụ.
Na-agbanyeghi na ọ bụ mmadụ iri na asatọ si n’otu ndọrọ ndọrọ dị iche iche zọrọ ọkwa ahụ, mana mpụtara ya na-egosi na ọgụ ahụ dị n’etiti pati All Progressive Congress (APC) na Peoples Democratic Party (PDP).
Gọvanọ na-achị ugbua bụ Lucky Aiyedatiwa ji aha APC azọ ọkwa a ebe Agboola Ajayi ji aha PDP azọ.
Onye na-akpọpụta mpụtara ntuliaka a bụ Ọkammụta Olayemi Akinwunmi, bụ onyeisi mahadum Federal University nke Lokoja, ọ malitere ịkpọpụta ya n’abalị Satọde.





























