You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onye bụ Evan Enwerem?
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
- Mgbe e biputara ya
A kpọpụtawa aha ndị Igbo nwere agba n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjiria ma akpọbeghi Evan Enwerem, mara na a kpọwabeghi.
Enwerem bụ otu n'ime ndị Igbo garuru n'isi mmiri n'ọchịchị Naịjiria dịka ọ chịrị Ụlọomeiwu Ukwu Naịjiria.
Nke a mere BBC ji chọọ icheta nwoke a n'ụbọchị ncheta ọmụmụ ya, ka afọ 15 ọ nwụrụ gachara.
Ọ bụrụ na ọ dị ndụ ugbua, Evan Enwerem bụbu onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naịjiria gaara adị afọ 87 ugbua.
N'ihi onye ọ bụ nye ndị Imo steeti, Gọvanọ Hope Uzodimma rụgharịrị ụzọ Gọvanọ Rochas Okorocha rụrụ n'Owerri, nke a kpọburu 'Akachi Road', ma gụọ ya 'Evan Enwerem Way'.
Ihe ị kwesịrị ịma maka Evan Enwerem
- A mụrụ ya n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọktoba afọ 1935
- Ọ bụ onye Ikeduru nke Imo steeti
- Ọ chịrị dịka gọvanọ Imo steeti site n'afọ 1992 ruo 1993, tupu ọ gaa Ụlọomeiwu ukwu Naịjiria
- Ọ chịrị dịka onyeisi Ụlọomeiwu ukwu n'okpuru People's Democratic Party (PDP) bido n'ụbọchị atọ nke ọnwa Juun afọ 1999 (mgbe ọchịchị onyekwuouche ya bịara Naịjiria), ruo mgbe e wepụrụ ya n'ụbọchị 18 nke ọnwa Nọvemba 1999
- N'agbanyeghi mwepụ e wepụrụ ya n'oche ọchịchị, ọ gara n'ihu nọgide n'oche ya dịka onye nnọchiteanya 'Imo-East Senatorial Zone' ruo afọ 2003
- E wepụrụ ya n'oche n'ihi ebubo na ọ gbanwere aha ya, nke bụ na amaghị ma ezigbo aha ya ọ bụ Evan ka ọ bụ Evans
- Ọ gụrụ mahadum na Mahadum nke Southampton dị na mba Briten
- Ọ rụrụ dịka onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ọdọụgbọelu na Naịjiria nke a kpọrọ Nigerian Airports Authority (NAA), site n'afọ 1980 ruo 1983
- Ọ mụrụ ụmụ asaa
- Ọ nwụrụ n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọgọst afọ 2007, ka ọ rịachara ahụ