Funke Akindele: Ụlọikpe amaala Funke Akindele na di ya ikpe

Ebe foto si, @funkeakindele
Onye na-eme ihe onyonyo ama ama bụ Funke Akindele na di ya Abdul Rasheed Bello esiela 'rọdụ' n'imi dịka ikpe mara ha n'ụlọ ikpe nta maka ihe mmemme ha mere n'ụbọchị satụde na-agbanyeghi
mmachi nnọkọ na ngagharị emere maka Coronavirus.
A mara ha ikpe ịkwụ ụgwọ mgbapụta otu narị puku naira.
Etinye kwara ha irụrụ obodo ọrụ na-efu Izuụka abụọ, ị kụziri ndị mmadụ ọghọm dị na inupu iwu gọọmenti isi.
Ụlọikpe gwara ha na ha ga-enye gọọmenti aha na akara ekwentị ndị niile bịara mmemme ahụ na kwa iwepu onwe ha iche maka nyocha coronavirus.
Funke Akindele na di ya Abdul Rasheed Bello bụ kwa onye oti egwu kwetara si "Eee, anyị dara iwu mmachi Legọs steeti mere maka coronavirus."
Nke a na-eme dịka gọọmenti Legos state gbara ha akwụkwọ n'ụlọ ikpe nke dị na Ọgba, Legọs steeti maka ikpọku ndị mmadụ ka ha bịa oriri na ọṅụṅụ maka ncheta ọmụmụ dị ya n'ụlọ ha n'ụbọchị satụde.
Ha mere nke a na-agbanyeghi iwu mmachi na nnọkọ gọọmenti etiti na nke Legọs steeti mere maka coronavirus.

Ebe foto si, @funkeakindele
Dịka ọ dị ugbua, a na-eche ka okaikpe kpebie ya bụ ikpe.
Akụkọ ka na-abịa.
N'ozi Bala Elkana bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs steeti zipuru, o kwuru na ndị otu ya anwụchiela Akindele-Bello maka ọgbakọ oriri na ọṅụṅụ ha mere n'ụlọ ha ụnyaahụ.
Elkana kwuru na ha ka na-ama imi n'ala ma na-achọkwa ịnwụchi di Funke bụ Abdul Rasheed Bello bụ otiegwu e ji JJC Skillz mara, nakwa otiegwu Azeez Fashola nke e ji Naira Marley mara, so na ndị nọ
n'ọgbakọ ahụ.
Ha gara n'ihu kwuo ka mmadụ abụọ a gbaa mbọ hụ na ha ji aka ha bịa gosi onwe ha n'ụlọọrụ ndị uweojii dị na Yaba, echi bụ Mọnde, ụbọchị isii nke ọnwa Epreelụ 2020.
Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ tiwere mkpu n'elu soshal midia maka etu Funke na igwe mmadụ si na-agba oringo ebe gọọmentị nyere iwu sị ndị mmadụ na-anọsapụ anọsapụ nakwa ghara ịpụ n'iro.
Cheta na Funke rịọrọ mgbaghara ma kọwaa etu ọgbakọ ahụ si mee.
Ekwentị ndị agha maka mkpesa ndị otu ha dị ire

Ebe foto si, Getty Images
Na mkpụrụ ụbọchị abụọ nke ọnwe Epreelu ka ndị agha Naịjrịa wepụtara akara ekwentị gbata gbata maka mkpesa ndị otu ha na-akpaso ndị mmadụ ajọ agwa n'izụ a gọọmntị tiri iwu onwe apụla ezi.
Cheta na mkpụru ụbọchị abụọ nke ọnwa Epreelu ka onye agha Naịjirịa gburu mmadụ na Warri Delta steeti.
BBC wepụtere ohere ịkpọ akara ekwentị ndị ahụ ịmata ka ha adịkwa ire.
Ekwentị ndị ahụ rụrụ ọrụ dịka ndị otu ha zara ya anọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Onyeisiala ndị Malawi ekeela ụkwọ ọnwa ya maka coronavirus

Ebe foto si, Reuters
N'Afrịka, onyeisiala Malawi bụ Peter Mutharika ekwuola na ya na ndị minista ya ga-ewepụ pesentị iri n'ụgwọ ọnwa ha rụọ ọnwa atọ maka iji tinye aka n'agha ana ebuso Coronavirus n'ala ha.
Mutharika kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị obodo ha okwu maka mgbaduume ha ga-eji anọ n'oge coronavirus a.
Kyle Walker ga-ezute Iwu obodo

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, a na-enyocha Kyle Walker, onye egwu Manchester City maka ịkpọ ụmụagbọghọ abụọ oriko, ịmebi iwu etiri maka ịnọsapụ anọsapụ maka coronavirus.
Walker arịọlarị biko ma rịọkwa ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ.
Gee akụkọ ndị n'otu nkeji

Ebe foto si, Getty Images
Nwanne ị hụkwala etu ekuwrekwu si laa ndụ mmadụ ise n'iyi?
Otu nwoke ji iwe gbagbuo mmadụ ise n'ihi na ha nọ n'ihu ụlọ ya ma jiri olu ike na-akpa nkata.
Mmadụ ise ahụ bụ ụmụnwoke atọ na otu nwaanyị nwụrụ ozugbo ihe ahụ mere ebe elekere iri nke abalị Satọde, ụbọchị anọ nke ọnwa Epreelụ, site n'ahụ ha merụrụ.
Ndị uweojii sị na ya bụ mkpamkpa kpara n'obodo Yelatma dị na mpaghara Ryazan dị na mba Rọshịa.
Ndị na-eme nyocha kwuru sị na nwoke ahụ a na-akpọpụtaghị aha ya bu ụzọ sị ndị ahụ mere mkpọtụ si n'ihu ụlọ ya pụọ, mana ha malitere isi agụgọ. Nke mere ka o were iwe jiri egbe o ji achụ nta gbagbuo ha niile.
Ka ọ dị ugbua, aka ndị uweojii akparala ya dịka ha legharịrị anya n'ụlọ ya ma jichie egbe o ji kpaa mkpa mkpa a.
Marakwa na obodo ahụ nọkwa na mmachibido ndị mmadụ ịpụta ezi n'ihi ọrịa coronavirus.

Anyị esụọla ogige ndị Boko Haram ka ji akpụ - Ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha Naịjiria, Niije na nke Chad sụjara ndị otu oyi egwu Boko Haram na ISWAP na mpaghara Tumbu Fulani dị na Bornu steeti n'ụbọchị Fraịde.
Ọ bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbasa ozi ndị agha bụ Bernard Onyeuko kwuru nke a n'akwụkwọ ha depụtara n'ụbọchị Satụde .
Onyeuko kwuru na ọbụ nchịkọta ogbunigwe ugboele tụrụ na nke ndị agha ala tụrụ ka ha jiri wakpo ndị otu a.
Ọ kwuru si "nke a bụ iji kpochapụ ndị otu ISWAP na mpaghara mmiri Chadi niile dịka ha nyochapụtara na ha si ebe ahụ ebuso ndị mmadụ agha".

Ọ bụ onye oyi egwu gburu mmadụ abụọ na mba Fransị

Ebe foto si, AFP
Ndị mba Fransị ekwuola na onye ahụ ji mma gbuo mmadụ abụọ ma merụọ mmadụ ise ahụ n'obodo Roman-Sur-Isére n'ụtụtụ Satụde bụ onye otu na-eyi egwu.
Onye omekome a gbara ihe dịka afọ iri atọ si ala nna ya bụ Sudan gbaa ọsọ ndụ gbata Fransị.
Nwoke a wakporo ndị mmadụ pụtara ịzụta ihe oriri n'ụtụtụ dịka Fransị nọ na mmachi ngagharị maka ọrịa coronavirus.
Dịka ọ dị ugbu a, aka ndị uwe ọjị akparala ya bụ nwoke ma jide kwa onye ya na ya bi n'ụlọ.
Ndi uweoji Fransị na-ekwu na ha na eme nyocha ha ị nyochapụta otu oyiegwu ọbụla nọ na mba Fransị.
Ndi uweojii sikwa na anya ha anọghị na ebe ya bụ nwoke nọ dịka onye otu oyi egwu.
Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron akatọọla ya bụ ihe mere ma tie ndị niile ọ metụtara aka n'obi.
































