Ihe anyị ga-eme maka ndị eduru n'iyi ọrụ n'Ebonyi - PDP

Ndị ahọpụtara ọhụrụ n'okpuruọchịchị Ebonyi steeti

Ebe foto si, Hart Ekeledo

Mgbe e biputara ya

Onye ọkaiwu na-anọchite anya otu PDP n'Ebonyi steeti ekwuola na ha ga-akpụpụ gọọmentị Ebonyi steeti ụlọikpe maka ndị isi okpuruọchịchị ha duru n'iyi ọrụ ụnyyahụ.

Nwoke ahụ aha ya bụ Mudi Erhenedi gwara BBC Igbo n'ekwentị na ihe ahụ emere n'Ebonyi steeti bụ ịmegide iwu ụlọikpe nyere nke pụtara 'Contempt of Court' na Bekee.

Ọ kọwakwara na ha ga-aga ihu hụ na ụlọikpe kagburu ikike enyere ndị ahụ eduru n'iyi ọrụ.

"Ụloikpe ekwubuola na ihe ha ntuliaaka iji họpụta ndị ahụ dara iwu nke pụtara na idu ndị ahọpụtara n'iyi ọrụ bụ ikparị ụlọikpe" ka Irenede kọwara.

Dave Umahi duru ndị ahọpụtara n'iyi ọrụ

Ebe foto si, Hart Ekeledo

Mana Uche Orji bụ Kọmịshọna mgbasaozi n'Ebonyi steeti kwuru na o nweghi eziokwu dị na ihe otu PDP na-ekwu.

Ọ sị na mkpebi ụlọikpe mere bịara dịka emecharala ntuliaka ahụ nke mere na ọ bụ 'Academic Exercise'.

O kwukwara na ọ bụkwa afọ abụọ ka ndị ahụ eduru n'iyi ọrụ ga-anọ n'ọkwa n'abụghị afọ atọ dịka ndị kpụpụrụ ha ụlọikpe si kwu.

"O nwere iwu Ebonyi steeti mere n'afọ 2020 kwuru ka ndị isi okpuruọchịchị nọrọ n'ọkwa naanị afọ abụọ" ka ọ gwara BBC n'ekwentị.

Kedụ ebe okwu a bidoro?

Okwu dị na ntuliaka okpuruọchịchị malitere mgbe e mere ya ntuliaka ahụ n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Julai.

Mpụtara ntuliaka ahụ gosiri na otu APC meriri n'okpuruọchịchị niile dị na steeti ahụ dị iri na atọ.

Otu PDP gara n'ụlọikpe gbaa gọọmentị steeti ahụ akwụkwọ ma na-ekwu na enyeghi ha iwu eji me ya bụ ntuliaka.

Ụlọikpe kpebiri na ntuliaka ahụ dara iwu dị n'ime Electoral Act 2022.

Ha kwukwara na o megidere iwu kwadoro ọchịchị onyekwuouche ya nke pụtara na o nweghi ebe ọ kwụ akwụ.

Mana dịka o si kwuru ugbua, eduola ndị ahụ meriri ntuliaka n'iyi ọrụ na steeti ahụ.