Ikpe Trump: Ngosipụta ihe o kwuru na nzuzo na ihe ndị a ma ama mere

Aka chiburu mba Amerịka bụ Donald Trump

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Akụkọ, ịkwụ ụgwọ nkwuchi, ndekọ nzuzo na ebubo imebi iwu eboro Donald Trump pụtara ìhè ụbọchị iri ya n'ụlọ ikpe.

Ụlọikpe ahụ nụrụ akaebe sitere n'aka Keith Davidson, onye ọkaiwu kwadoro nkwekọrịta ego nke Stormy Daniels.

Ịgba Mazi Davidson ajụjụ nwere ọtụtụ oge dịka ndị ọkaịwụ ahụ nwara ị gosi ya dị ka onye na-erite uru na-adịghị mma na Hollywood.

O kwuru na ndị ọkaịwu ahụ ejirila okwu ndị dị ka "ịpụnara mmadụ ihe" iji kọwaa mmezi iwu kwadoro.

Onye bụbu ọkaịwu Donald Trump bụ Emil Bove mgbe a na-ajụ ajụjụ kwuru na 'anyị niile bụ ndị ọkaiwu. Abịaghị m ebe a ị gwụ egwu'.

Mazi Bove bụ onye mere ka a mata mpụ aka Mazi Davidson nyere aka zochie iji metọọ aha onye akaebe ahụ.

Ọkaịwu Donald Trump jụrụ Mazi Davidson anapụtara ego n'aka Charlie Sheen tinyere ị rụrụ onye ahụ na-eme ihe ndị gba ọtọ n'aha Tila Tequila.

Enwere akụkụ banyere onye na-eme ihe ejije bụ Lindsay Lohan na ọ gara ebe nleta na kwa bee onye mgba Hulk Hogan.

Keith Davidson

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kieth Davidson
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mazị Davidson kwusiri ike ugboro ugboro na ebe obibi ndị o tinyere aka na ya ziri ezi.

Ka ọ dị ugbu a, ndị omebe iwu kpọrọ Mazị Davidson ka ọ jikọọ Mazị Trump, onye bụbu ọkaiwu ya bụ Michael Cohen, na ụgwọ nkwụchi di $130,000 ọ kwụrụ Nwaada Daniels tupu ntuli aka onyeisiala afọ 2016.

Onye bụbu Onyeisiala Trump, anabataghị ebubo 34 ahụ nke gụnyere ịgha ụgha ndekọ ego iji zoo ụgwọ ahụ.

Ọ gọnarịrị inwe mmekọahụ ọ bụla ya na Nwaada Daniels.

Mazị Davidson kọwapụtara etu esi ahazi ụgwọ a na-akwụ Nwaada Daniels. Aka ya dị na nkwekọrịta mbụ ya na ụlọ mgbasa ozi n'akụkọ bụ National Enquirer iji zoo ihe Karen McDougal na-ekwu na ya na Mazị Trump nwere mmekọrịta ịhụnanya.

Onye ọkaiwu ahịa bi na Beverly Hills, dị na California, kwusiri ike na ya chere na Mazị Trump bụ onye mechiri Nwaada Daniels ọnụ n'ọnwa Ọktoba 2016.

Ozi emels na ozi ederede gosiri na ya na ndị ọzọ kwenyere na nkwubi ego ahụ onye ya na-arụ ọrụ na mbụ nyeere Mazị Trump aka iji merie nweta mmeri na ntụliaka onyeisiala ka otu ọnwa gachara.

"Gịnị ka anyị mere?" Mazị Davidson zigara onye nchịkọta akụkọ National Enquirer Dylan Howard ozi ka nsonaazụ ntuliaka na-apụta n'abalị.

Mgbe ajụrụ ya ka ọ kọwaa ozi ahụ, Mazị Davidson gwara ụlọ ikpe na: "Enwere nghọta na ihe anyị mere na mbụ nwere ike inwe n'ụzọ ụfọdụ nyere aka na-achụmntaa vootu Donald Trump na ntụliaka onyeisiala.

Katoon nke Kith Davidson n'ụlọikpe

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Katoon nke Kith Davidson n'ụlọikpe

N'ime ajụjụ nke abụọ, onye ọkaiwu Joshua Steinglass kpọrọ ihe ndekọ ọdịyo nke Mazị Davidson na Cohen na ekwentị, nke ọ bụ Cohen dekọtara nke ọma.

N'otu ndekọ ọdịyo ahụ, Cohen kwuru na Mazị Trump gwara ya ọtụtụ oge na ọ na-ewute ya na ha mere ihe ndị ahụ." Mazị Davidson gbara akaebe na ya na-atụ aka na nkwekọrịta nkwubi ego nke Stormy Daniels.

Mazị Cohen na-agbakwụnye na ndekọ ahụ na "Ihe m gwara ya bụ, 'mana onye ọbụla anyị jụrụ gwara gị na ọ bụ ihe ziri ezi'."

Ndị ọkaiwu kpọrọ Douglas Daus, onye na-arụ ọrụ na ngalaba nyocha teknụzụ dị elu na ụlọ ọrụ onyeisi ọkaiwu dị na mpaghara New York ụbọchị ahụ.

Ma ị Daus gwara ụlọikpe na ya nnyochara ekwentị abụọ nke Ma ị Cohen wee wepụta akara ekwentị ndị mmadụ rụrụ 39,745 nke ihe iru akwụkwọ iri n'ime ya bụ nke Trump.

A na-atụ anya na MazịCohen ga-agba akaebe n'oge adịghị anya mana enweghị onye maa mgbe ọ ga a bụ.

A na-atụkwa anya mkpebi ikpe nke Ọkaikpe Juan Merchan mgbe ndị ọkaiwu na ndị na-agbachitere kpakọritachara ụka ụbọchị Tọzdee ka Mazị Trump o mebiri iwu ọzọ. A mara ya nha dị ọnụ ego $9,000 maka mmebi iwu n'oge gara aga.

Trump - Stormy Daniels Trial: Ka o si a ga n'ikpe a

Ikpe aka chịburu mba Amerịka bụ Donald Trump amalitela ugbua na mba Amerịka nke nwere 'Jury' e duru n'iyi ọrụ kemgbe ụbọchị Tọzde izu ụka gara aga.

Trump dị afọ 74 ga-azara ọnụ ya n'ebubo mpụ ruru iri atọ na anọ nke metụtara ego mkpuchi a kwụrụ onye na-agba ọtọ Stormy Danirls tupu e mee ntuliaka afọ 2016.

Ọ zarala ọnụ ya ma kwuo na 'ikpe amaghị ya' dịka ọ na-ekwukwa na o nweghi ihe jikọrọ ya na Daniels.

Daniels na-ekwu na ya na Trump nwere mmekọ nwoke na nwaanyị n'afọ 2006 ma kwuo na a kwụrụ ya ụgwọ iji mechie ọnụ ya maka mmekọ ahụ.

Ndị na-ekpe Trump ikpe kọwara na nke a bụ ụzọ iji kwagha ntuliaka 2016 n'ụzọ megidere iwu.

Ihe butere ikpe a bụ ego Trump nyeghachiri otu nwoke bụbu ọkaiwu Trump bụ Michael Cohen.

Cohen sị na a gwara ya kwụọ Daniels ego ruru $130,000 iji mee ka o zoo na ya na Trump nwere mmekọ.

Dịka iwu mba ahụ si kwuo, ịkwụ mmadụ ụgwọ ime ka ha mechie ọnụ adaghị iwu ọbụla mana ụlọorụ onye kpụpụrụ Trump ụlọikpe kwuru na Trump dara iwu site n'idetu ego ahụ ọ kwụrụ Daniels dịka 'ụgwọ ọkaiwu'.