'Esi m n'ịgụ egwu n'ime ahịa banye ịgụ egwu n'onyonyo Afamefuna na-ewu na Netflix, nkwarụ bụ n'echiche' - Determination

Aha onyonyo, Nkwarụ abụghi ihe anụ ahụ kama ọ bụ ihe echiche - Determination
    • Onye dere ya, Chimezie UcheAgbo na Okechukwu Omeire
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist na Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya
Determination

Nwamadị na-akụ egwu nwere nwakwarụ bụ Ndubueze Monday Aguoma onye e ji Determination mara agwala BBC Igbo na ya anaghị eche ka mmadụ meere ya ebere.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC igbo nwere gbasara egwu ya.

O gwara BBC Igbo na nkwarụ ya sitere n'ahụ ọkụ rịara ya oge ọ dị obere mere e jiri gbaa ya ọgwụ mana a maghị ka ọ bụ ọgwụ ahụ kụjiri ya ụkwụ.

Determination na mkparịtaụka ahụ kwuru na ọ gbajuo dọrọ, egwu ka ya ji agụpụta onwe ya.

Ọ kọwara na naanị mkpebi ya ka ya nwere oge ọ gbajuru dọrọ ma ya enweghi onye ga-enyere ya aka kpatara ya ji na-aza aha 'Determination' nke pụtara mkpebi.

N'okwu ya; "mgbe ụfọdụ ị chọọ ime ihe ọ bụrụ na ihe i ga-eji mee ya adịghị, naanị ihe m ji elotara onwe m na m chọrọ ime ihe ahụ mana n'ihi na ihe a ga-eji mee ya adịghị, naanị ihe nwere abụrụ mkpebi. Etu ahụ ka aha ahụ siri bịa."

Determination malitere ịgụ egwu n'ime ahịa mana na nso nso a, o so n'olu gụrụ egwu n'onyonyo na-ewu ewu e tinyere na Netflix a kpọrọ Afamefuna.

"Obi dị m ezigbo aṅụrị, ị makwa ihe ọ pụtara."

Kirie onyonyo ahụ.