Trump Under Arrest: Ikpe onye bụbu onyeisiala Amerịka nwerike ịgafe otu afọ

Ebe foto si, Getty Images
Otu onye ọkaiwu na-ekpeburu gọọmentị mba Amerịka ikpe ekwuola na ikpe Donald Trump nwereike ịgafe otu afọ.
Renato Mariotti kwuru na ikpe ahụ nwereike ịnọgide rue afọ 2025 maọbụ gafee ya.
Mariotti kwuru sị "mgbe ikpe a ga-eji gwụcha, o nwereike ịbụ na a ga-arụ ya (Trump) aka n'ikpe ndị ọzọ".
O kwuru nke a dịka a na-enyocha onye bụbu onyeisiala mba Amerịka maka ebubo ndị ọzọ emetụtaghị nke a e ji kpụpụ ya ụlọikpe.
Cheta na ndị ọkaiwu boro Trump ebubo 34 gbadoro ụkwụ n'ịzochi nrụrụaka n'ọrụ ya mana ọ zara na "ikpe amaghị ya" n'ebubo ahụ niile.
Trump mechara kwuo na ikpe a a na-ekpe ya bụ mmebọ n'ebe mba Amerịka dị ma kwuo na ala ahụ "na-aga ọkụ ala mmụọ".
Ebubo na nyocha ndị ọzọ nọ n'isi Trump ugbua
Ewezuga ikpe nke a Donald Trump chịbụrụ mba Amerịka nọ n'etiti ya, e nwere nyocha ndị ọzọ a na-elebanye anya na ya nwereike ịghọrọ ikpe nke ya n'ọdịnihu.
Lee atọ kachasị nwe agba n'ime ha ebe a:
Okwu classified documents - Ngalaba ikpenkwụmọtọ nke mba Amerịka na-enyocha etu e si wepụ ụfọdụ akwụkwọ nzuzo n'obi gọọmentị mba ahụ bụ White House bụkwa akwụkwọ ndị a chọtara n'ụlọ Trump dị na Florida dịka ọ rituchara n'ọkwa. Nyocha a nwereike ịghọrọ ikpe nke ya.
Ọgbaghara Capitol - Ngalaba ahụ na-enyochakwa ọgbaghara mere n'ụbọchị 6 nke Jenụwarị afọ 2021 so na mbọ a gbara ịtụgharị mpụtara ntụliaka mba Amerịka nke afọ 2020. Dịka ọ kwụ ugbua, amaala ọtụtụ mmadụ so na ya bụ ọgbaghara ikpe. Trump nwereike i so na ha.
Ntuliaka 2020 na obodo Georgia - Ndị na-ekpere gọọmentị mba Ameịka ikpe nyochara ntuliaka afọ 2020 ihe ruru ọnwa asatọ iji chọpụta ma a gbara mbọ ịgbanwe mpụtara ntuliaka ahụ. A na-enyocha ụfọdụ ndị nọ Trump nso maka ebubo mana o dobeghi anya ma a ga-enyocha Trump n'onwe ya.
Trump ahapụla ụlọikpe dịka o kwuru na ikpe amaghị ya

Ebe foto si, Reuters
Donald Trump bụ aka chịbụru mba Amerịka, onye pụtara ụlọikpe n’abalị Tuzde, ụbọchị anọ nke ọnwa Eprel esila n’ụlọikpe ahụ pụọ.
Dịka o si ụlọikpe ahụ pụọ, o nọ jọọ ma ghara ikwu okwu ọbụla dịka ndị akụkọ wụjuru ebe ahụ jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ.
A na-eche na ọ nọrọ ihe ruru nkeji 57 n'ime ụlọikpe ahụ.
Dịka ọ pụrụla ebe ahụ ugbua, a na-atụ anya na ọ ga-alaghachite be ya dị na Florida nke mba Amerịka bụ ebe a na-eche ọ ga-ekwu okwu mbụ ya ka ọ pụtara ụlọikpe a.
Onyeisiala Joe Biden onye nọ n'ọgbakọ kemgbe ekwubeghi okwu ọbụla banyere oku Trump bịara zaa n'ụlọịkpe ahụ.
Biden na ndị ọrụ sayensi na ndị ọrụ teknụzụ nọ ọgbakọ ahụ mana ọ kweghi zaa ajụjụ ọbụla banyere ikpe Trump.

Ebe foto si, Reuters
Etu Donald Trump siri pụta ụlọikpe
Cheta na Donald Trump bụ aka chịbụburu mba Amerịka a bụrụla onye chịrị mba ahụ nke mbụ a na-anwụchi.
Donald Trump ekwuola na aka ya dị ọcha n’okwu a kpọkuru ya nke metụtara ebu 34 n’okwu iji ụzọ aghụghọ gbanwee akwụkwọ e ji zụọ ahịa.
Okwu e ji kpọpụta Trump ụlọikpe Manhattan Criminal Courthouse egbochabeghi anya n'uju mana ihe a ma ugbua bụ n'okwu a metụtara maka ikwu ego ga-agbọchị ma kupchie otu nwaada na-eme ejije ihe onyonyo aramama bụ Stormy Daniels ọnụ n’afọ 2016.
Ọ bụ pụtara be ya bụ Trump Towers n’elekere mbụ nke ehihe ma fere ndị ntaakụkọ aka tupu ọ wụba n’ime ụlọala ya gba ụlọikpe ebe a kpọrọ ya oku.

Ebe foto si, Getty Images
Naanị ndị na-ese foto ise ka e nyere ohere ibata n’ime ụlọikpe a ma sete ihe na-eme ebe ahụ.
E nyeghi ndị na-ese ihe onyonyo ọbụla ohere maọbụ ikike ịsete ikpe a dịka ọ na-aga n’ihu.
O were Trump nkiji olemole tupu ụgbọala ya ezi bi ya ruo ụlọikpe Manhattan Criminal Courthouse.
Ndị ọkaiwu nakwa otu ikpe Trump gụnyere: Todd Blanche, Susan Necheles, Susan Necheles, na Boris Epshteyn.
Mgbe ọ nọ n’ime ụgbọala ya, e zipụtara ozi na soshal midia sị: “Ihe nke abụghị nrọ, ewo, a na-anwụchi m”.
Ihu ya daturu adatụ dịka ọchị anọghị ya n’ihu mgbe ọ pụtara ihu ụlọikpe ahụ, ọ kwụsịrị feere ọha ndị mmadụ wụjuru ebe ahụ aka.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, JOHN MOORE
Foto gosiri ka Trump nọ n’ime ụlọikpe maka okwu a nke mbụ ya gbara n’ọha n’ụbọchị Tuzde.

Onye omeiwu mba Amerịka bụ Marjorie Taylor Green pụtaburu gwaa ọha ndị mmadụ nwụjuru n’ihu ụlọikpe a okwu.
Otu onye rụbụrụ ya ọrụ dịka onye achụmnta vootu ya nakwa ụfọdụ ndị nso nso Trump amalitela imepụta ikesa uwe e dere gosiri ihu ya dịka e dere ‘ikpe amaghi ya’ n’ihu uwe a.
N’ozi e kesaara ndị nso nso ya, a na-ana ego ruru ego dọla 47 iji nweta uwe a ‘n’efu’.
Otu onye achụmta vootu ya maka atụmatụ ya ịbụ onyeisiala ọzọ na 2024 kwuru na ha enwetala ego ruru nde dọla asaa kemgbe a kpọrọ ya oku n’ụlọikpe.




























