Bosun Tijjani: Naijiria nwere ndị nka teknụzụ zuru i na-ezipụ mba ofesi

Mgbe e biputara ya

Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na nrụpụta ihe ọhụrụ bụ Bosun Tijani agbaala ama maka mkpa ọ dị inye ndị ntorobịa na Naịjirịa nakwa Afrịka ezi ọzụzụ na teknụzụ, i ji kwadoo ha maka ọdịnihu.

“Ihe kara anyị obi i ji rụọ ọrụ anyị n'arụ bụ maka na Naịjirịa nwere ọtụtụ ihe onwunwe nke gụnyere ọnụọgụgụ ndị na-eto eto bụrụkwa ndị maara ihe ekwe na-akụ n’ihe gbasara teknụzụ”.

“Enweghị obodo ọbụla n'ụwa nwere ike ị ga n'ihu ma ọ bụrụ na ha amaghị maka uru teknụzụ bara”.

"Ka ọnụọgụgụ mba ụfọdụ mepere emepe na-agbada bụ ohere Naịjirịa na mba ndị ọzọ dị na Afịrịka nwere iji zụọ ndị ntorobịa ha ka ha bụrụ ndị mba ndị ahụ niile ga na elekwasị anya maka ndị ọrụ teknụzụ."

"Ka ọ dị ugbu a, obodo dị ka UK, Amerịka na ndị ọzọ na-abịa Naịjiria ị kpọrọ ndị mara maka teknụzụ."

"Ihe ọzọ anyị na-eme bụ ịhụ na intaneti dị ebe niile i nye ndị a na-eto eto oghere isonye ma gosiputakwa aka ọrụ ha nye mba ụwa niile na-enweghị nsogbu ọbụla."

"Site na ngalaba ndị a anyị nwepụtara nke bụ ya bụ ‘Knowledge Foundation’ ka anyị gbadoro ụkwụ ịzụ ndị ntorobịa ka ha nwee ntọala n’ihe gbasara teknụzụ."

Na Naịjirịa gba gburugburu, anyị enwere ndị na-enye aka ịhọpụta ndị nwere mmasị isonye na ọzụzụ a ị ji hụ na onye ọ bụla nwere ohere, ma nwoke maa nwaanyị.

Gee ihe o kwuru n'uju: