Niger Bridge: Etu ọrụ ịrụzi akwammiri a kwụ ugbua

Gọọmentíị Etiti agbatịela oge ha nyere a ga-eji arụcha ọrụ idozi akwammiri 'Niger' dị n’Ọnịcha Anambra steeti.
Cheta na gọọmentị kwuburu na a ga-agbape akwammiri ahụ n’abalị iri abụọ na nke ọnwa Septemba, afọ 2026 mana nke a emezughị dịka ha siri kwubuo.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Onye nchịkọta nke Ministrị Etiti na-ahụ maka ọrụ n’Anambra steeti bụ Timothy Emenike gwara ndị ntaakụkọ na ihe mere na gọọmenti emezụghị nkwa ịrụcha ọrụ ahụ n’oge ha kwuburu bụ mmiri ozuzo nke o kwuru weghachiri aka elekere azụ.
Ọ gara n’ihu kwee nkwa na ha ga arụcha n’oru ahụ izụka na-abịa.
Ka ọ dị, ndị njem, ndị bi n'Ọnịcha na ndị na-azụ ahịa n'Ọnịcha na gburugburu ya gwara BBC na obi dị ha ụtọ n’ọrụ ahụ ma rụtụkwa aka na mmechi akwammiri ahụ wetara ha nnukwu ahụhụ.
Ha gara n'ihu kpọọ oku ka arụ ya nkwa nkwa.



