Asaba Onitsha Head Bridge: Ndị na-anya 'tanker' emechiela okporoụzọ akwammiri 'Niger Bridge'

Ndị na-anya nnukwu ụgbọala a kpọrọ 'tanker' anyachiela okporoụzọ akwa mmiri 'Nigeri Bridge' n'ihi iwe ihe ndị uweojii na-eme ha.
Nke a pụtara na ndị chọrọ isi ọnịcha banye Asaba, maọbụ isi Asaba banye Ọnịcha, agaghị enwe ike ime nke a n'ụtụtụ taa bụ Tọzde abalị itoolu nke ọnwa Nọvemba afọ 2021.
Ọ bụ na mpaghara a na-akpọ 'Coker Junction' ka ya bụ ihe na-eme.
Ihe kpatara nke bụ maka na ndị na-anya ụgbọala 'tanker' na-egosi iwe ha maka etu ndị uweojii si emekpa ha ahụ.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'ebe ahụ ugbua nụrụ akụkọ na ndị uweojii kwụsịrị otu onye ọkwọ ụgbọala ma gwa ya ka o nye ha ego.

Oge onye ahụ jụrụ inye ha ego, ha ji egbe gbapuo taya moto ya abụọ.
Nke a kpatara onye ọkwọ ụgbọala ahụ ji were iwe nyachie ụzọ.

Ndị ọkwọ ụgbọala ibe ya bịakwara kwụnyere ya ma werekwa ụgbọala nke ha nyachie ụzọ.
Nke a meziri ụzọ ahụ ji mechie kpamkpam, jebe ejebe adịghị mma, lawa alawa adịghị mma.

Ndị uweojii Asaba ekwubeghị ihe ọbụla gbasara nke a.
Ka ọ dị ugbua, okporoụzọ ahụ ka mechiri emechi.
Ndị ọkwọụgbọala 'tanker', bụ ndị na-eme ngosipụta iwe kwuru na ha agaghị ebupụ ụgbọala ha n'ụzọ ahụ ruo mgbe Gọvanọ Delta Steeti bụ Ifeanyi Okowa bịara gwa ha okwu.
Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta Steetị bụ Birght Edafe, ọ sị na akụkọ ndị Tanker a kọrọ abụghị ka o si dị n'ezie kama na e meela udo n'ogbe ahụ.
Ọ sị na kọmishọna uweojii gara ebe ahụ ngwa ngwa nke a mere ma weta udo nke mere ndị a jiri pụọ n'ụzọ.
Edafe sị na ọtụtụ ndị ntaakụkọ kpọrọ ya ma ọ gwa ha otu ihe nke bụ na udo na-achịzi ebe ahụ.
Ebee bụ Akwa Mmiri Naịjia

Ebe a bụ naanị otu ebe ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa si abanye na mpaghara Ndịda Naịjirịa.
Ọ bụ akwa mmiri a jikọrọ Anambara na Delta Steeti.
Okporoụzọ akwammiri a bụ ebe ụgbọala na-agafe n'ike n'ike oge ọbụla maka na ọ bụ ebe e si apụ maọbụ abanye mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
Kpachikpachi ụzọ na-adịkwa n'okporoụzọ a oge niile n'ihi ọnụọgụgụ ụgbọala na-agbafe na ya.

Ebe foto si, 2nd Niger Bridge
A rụrụ akwa mmiri a n'afọ 1965, ebe Praịm Mịnịsta Naịjirịa n'oge ahụ bụ Abubakara Tafawa Balewa mepere ya n'ọnwa Jenụwarị 1966.
N'oge agha Biafra, ndị agha Naịjirịa gbariri ya bụ akwa mmiri, mana a rụgharịrị ya dịka agha kwụsịrị.
Mana gọọmentị Naịjirịa ugbua na-arụ akwa mmiri ọzọ ga-agafe Osimiri Naịja, iji mee ka e nwee ụzọ abụọ a ga-esi na-abanye n'ala Igbo site na mpaghara Ndịda Naịjirịa.




























