Gịnị ka mkpebi ụlọikpe maka ADC na pati ndị ọzọ pụtara
Ọ bụghịzi akụkọ na Ụlọikpe enyela iwu ka ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC wezuga aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị African Democratic Congress, Accord, Action Alliance (AA), Action Peoples Party (APP) na Zenith Labour Party (ZLP) n'ihi na ha emezughị ihe iwu chọrọ iji bụrụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.
Dịka nke a na-ewu, ADC amalitela iyi egwu ma na-ekwu na ndị ahụ gọọmenti ji kwara ngwaọrụ iji kụsasịa pati ha ji ọkụ na-egwuri egwu.
N'ozi odeakwụkwọ mgbasaozi pati ADC bụ Mallam Bolaji Abdullahi wepụtara, ọ sịrị na ha ga-eji ikike niile nke iwu Naịjirịa nyere ha, maa aka megide nchabi ikpe ahụ Ọkaikpe Peter Lifu nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abụja nyere. O kwukwara sị n'agbanyeghị ihe ọbụla ọ ga-ewe ha, na aha ADC ga-agbarịrị n'akwụkwọ vootu afọ 2027.
N'otu aka ahụ, aka na-achị Ọshụn Steeti ma bụrụkwa onye otu Accord Party bụ Gọvanọ Ademola Adeleke kwuru na mkpebi Ụlọikpe Ukwu ịkachapụ aha otu ha bụ mkpaarị nye Ụlọikpe Mkpegharị ma bụrụkwa ihe iyi egwu nye ụkpụrụ ntuliaka.
Oge anyị kpọrọ Ọkaiwu Maxwell Opara ka ọ kọwaara anyị mpụtara nchabi ikpe ahụ, o kwuru na o nweghị ihe ọzọ mkpebi ụlọikpe ahụ pụtara, karịakwa na aha pati ndị ahụ ụlọikpe nyere iwu ka a kachapụ agaghị apụta n'akwụkwọ vootu n'afọ 2027, e wezuga ma ha gbara akwụkwọ mkpegharị ikpe ma nweta mmeri.
Cheta na Atiku Abubakar bụbu osote onyeisiala Naịjirịa bụ onye ADC bunyere ọkọlọtọ ha iji zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2027 dịka ọ pụchara na pati PDP, ebe Ademola Adeleke hapụrụ pati PDP nyere ya mmeri n'afọ 2022 ma wụfee n'Accord.
Ugbua, dịka INEC mechirila ohere ha nyere maka ndị chọrọ ịgafe na pati ọzọ, gịnị ka i chere ga-abụ ọnọdụ Atiku na Adeleke ma ọ bụrụ na ha kụọ afọ n'ala inweta mmeri n'Ụlọikpe Mkpegharị?



