A malitela oku ịkagbu mmemme otiegwu Tyla chọrọ ime na Legọs maka xenophobia

Aha onyonyo, A malitela oku ịkagbu mmemme otiegwu Tyla chọrọ ime na Legọs maka xenophobia
A malitela oku ịkagbu mmemme otiegwu Tyla chọrọ ime na Legọs maka xenophobia
Mgbe e biputara ya

Gịnị mere ụfọdụ ụmụafọ Naịjirịa ji akpọ oku ka a kagbuo ọgbakọ egwu otiegwu Tyla, nwaafọ Saụt Afrịka na-akwado ime na Naịjịrịa?

Otiegwu Tyla mba Saụt Afrịka hiwere ọgbakọ egwu ya a kpọrọ 'concert' na maka ndị egwu ya na-amasị na Legọs n'ụbọchị Tuzde, 22 Disemba 2026 mana ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa gụnyere ndị a na-anụ aha ha na-akpọ oku ka a kagbuo mmemme egwu ahụ.

Oku a na-abịa n'ihi mwakpo, mmekpa ahụ nakwa mmegide ụmụafọ Saụt Afrịka megidere ọtụtụ ndị si mba Afrịka dị iche iche maka ịbata mba ha n'ụzọ megidere iwu.

Puku kwuru puku ụmụ Naịjiria ebinyela aka n'akwụkwọ mkpesa Bekee kpọrọ 'online petition' iji gbochie Tyla onye ritere onyinye Grammy Award ugboro abụọ n'afọ 2024 na 2026, ime mmemme egwu a n'ihi iwe megide mwakpo xenophobia ahụ.

N'aka nke ọzọ, Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa kwuru na oku a na-akpọ bụ oku nwere isi ma kpọ oku ka ndị mmadụ ghara iji maka ya mee ihe iwu akwadoghị.

Mana ọ bụghịkwa naanị Tyla bụ onye a ma ama oku a a na-akpọ metụtara.

Na nsonso a, Mịnịsta na-ahụ maka ikpe nke Saụt Afrịka bụ Mmamoloko Kubayi tụrụ arịrị na a kagburu ohere ọtụtụ ndị otiegwu ha na ndị ọrụ ịkpa obi ụtọ ime ọgbakọ obi ụtọ na mba ọzọ.

Ọbụladị n'izuụka gara aga, ọtụtụ mmadụ katọrọ ọkpaọchị Saụt Afrịka a ma ama bụ Trevor Noah maka ozi o wepụtara nke na-akpọku ndị mmadụ ka ha mee njem nlegharịanya na Saụt Afrịka, ma kwuo na ọ bụghị n'oge dị etu a ka Noah kwesịrị iwepụta ụdịri ozi a.

Oku a na-akpọ megide mwakpo xenophobia a, mere ka Oprah Winfrey mechie ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyị o rụụ na mba Saụt Afrịka.

Mana a ga-ata ndị na-eme ihe obi aṅụrị ụta maka esemokwu dị n'etiti mba na mba?

Onye ntaakụkọ ihe gbasara omenala bụ Dami Ajayi, kwuru na nke a abụghị oge mbụ a na-akpọ oku megide ndị na-eme ihe aṅụrị a kpọrọ 'entertainers' n'olu Bekee ma kwuo na oku megide ndị na-eme ihe aṅụrị anaghị eweta mkpezi n'esemokwu dị n'etiti mba na mba.

N'okwu nke ya, nwaafọ Naịjjịrịa na-agba mbọ maka ikike dịrị onye bụ Omoyele Sowore katọrọ oku a na-akpọ megide mmemme Tyla chọrọ ime, ma kwuo na ọ bụ ọrụ gọọmenti mba Saụt Afrịka igbochie xenophobia.

Na-agbanyeghị esomokwu dapụtara ọhụrụ a, Naịjirịa na mba Saụt Afrịka bụ isi a hụrụ kwaba okpu n'ihe gbasara iti egwu n'Afrịka.

Ọtụtụ ndị otiegwu Naịjirịa na ogbo ha ndị Saụt Afrịka etikọọla egwu n'oge gara dịka Tyla na Wizkid, Davido na Musa Keys, Ice Prince na Cassper Nyovest nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.