Ụmụafọ Naịjirịa 268 gbara ọsọ xenophobịa awụchiela Legọs

Aha onyonyo, Ụmụafọ Naịjirịa 268 gbara ọsọ xenophobịa awụchiela Legọs
Ụmụafọ Naịjirịa 268 gbara ọsọ xenophobịa awụchiela Legọs
Mgbe e biputara ya

Ụmụafọ Naịjirịa dị narị abụọ, iri isii na asatọ anwụchiela ọdọ ụgbọelu dị na Legọs dịka gọọmenti Naịjirịa kpọlatara ha site na mba Saụt Afrịka.

Nke a na-abịa dịka gọọmenti Naịjirịa kwuru na ọ ga-amalite ịkpọlata ụmụafọ ya nọ na Saut Afrịka maka mwakpo xenophia ndị mba Saụt Afrịka na-awakpo ndị mba Afrịka dị iche iche nọ na mba ha.

Ụgbọelu Airpeace hapụrụ ọdọ ụgbọelu Liver Tambo dị na Johannesburg n'ụtụtụ Tọzde 11 Juun, 2026, bulatara ụmụafọ Naịjirịa gụnyere ụmụnwoke, ụmụnwaanyị nakwa ụmụaka.

Cheta na Mịnịsta Naịjirịa na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Bianca Ojukwu wepụtara ozi ma kwuo na mmadụ narị abụọ na iri isii na abụọ ahụ bụ ndị mbụ ha ga-akpọlata n'agba ise gọọmenti Naịjirịa na-akwado ịkpọlata.

Mịnịsta nta na Naịjirịa na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Sola Enikanolaiye nabatara ụmụafọ Naịjirịa ahụ n'ọdọ ụgbọelu Murtala Mohammed International Airport Legọs.

Bianca Ojukwu kwuru na ụmụafọ Naịjirịa ruru otu puku debanyere aha ha na ndị chọrọ ịlaghachite Naịjirịa ma kwuo na gọọmenti Naịjirịa dị njikere ịkpọlata ụmụafọ ya niile nwere ebumnobi ịhapụ mba Saụt Afrịka.

Ojukwu katọrọ mkpagbu ụmụafọ Saụt Afrịka na-akpagbu ụmụafọ Naịjirịa nakwa ụmụafọ Afrịka ndị ọzọ ma kwuo na omume dị etu a bụ ihe jọgburu onwe ya.