Gịnị ka gọọmentị Anambra Steeti na-eme iji kwụsị oke ihe mberede okporoụzọ na mpaghara Agu-Awka?

Ebe foto si, HumAngle
Ndị mmadụ n'Anambra Steeti na-eti mkpu gbasara mpaghara Agu Awka nke okporo ụzọ awarawara si Enugwu gawa Ọnịcha bụ ebe enwerela ọtụtụ ihe mberede okporoụzọ n'ọdị nso a.
Ihe mberede okporoụzọ mere na mpaghara ahụ n'abalị ụbọchị Satọde, bụ ụbọchị 13 nke ọnwa Mee 2023, metụtara Mazị Uche Okafor, onye ji ọkwa 'Speaker' n'ụlọ omeiwu Anambra Steet.
Akụkọ kwuru na ihe mberede ahụ bụ nke abụọ mere n'otu mpaghara okporoụzọ ahụ n'ụbọchị Satọde ahụ.
Ihe mberede nke mbụ metụtara Jude Emecheta, bụbu onyeisi ụlọọrụ Anambra Signage, onye merụrụ nnukwu ahụ ma nọdụkwa n'ọnọdụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma tupu e buru ya gaa ụlọọgwụ dịka ụgbọala ya kụkasịrị.

Ebe foto si, Anambra State Assembly
Dịka Uche Okafor si gwa ndị ntaakụkọ: "Enwetara oku ekwentị na Jude (Emecheta) enyim nwoke nwere ihe mberede okporoụzọ.
"Oge m bịarutere, anyị chọpụtara na Jude amaghịzi ebe ọ nọ, m wee buru ya n'ụgbọala m buga ya ụlọọgwụ.
"Mana dịka m pụtara ebe ụgbọala ya nọ ka m were ụfọdụ ihe dị mkpa dị n'ime ya, anọzi m na-eweta ihe ndị mgbe ndị mmadụ bidoro iti mkpu na-asị m pụta n'ime ụgbọala ahụ.
"Ngwangwa m pụtara, o rughi otu ntabi anya, otu ụgbọala trailer baiara kụrụ ụgbọala Emecheta mebiri, kụrụkwa ụgbọala m nọ n'akụkụ.
"Ọ gaara abụ nnukwu ihe ọdachi ma ọ bụrụ na mmadụ merụrụ ahụ, mana ekele dịrị Chukwu," Uche Okafor kwuru.
"Mana Jude na-enweta onwe ya n'ụlọọgwụ ugbua," ka Uche Okafor kwuru.
Gini kpatara ihe mberede ji emekarị na mpaghara Agu-Awka?

Ebe foto si, HumAngle
BBC gbara ụfọdụ ndị ọkwọ ụgbọala ajụjụọnụ, ha wee kọwaa na ọtụtụ nnukwu ụgbọala si Enugwu aga Ọnịcha na-esi na mpaghara 'Agụ-Awka Junction' agafe.
Mazị Ogbodo Charles, onye ọkwọ ụgbọala kwuru na ọ dị mkpa ka a rụnye 'roundabout' n'ebe ahụ ma dozikwaa okporoụzọ ebe ahụ mebiri emebi.
Otu onye ntaakụkọ ma mpaghara okporoụzọ a nke ọma kwuru na "Ọ bụ n'ebe ahụ ka okporoụzọ abụọ zutere onwe ha, ọ bịakwa bụrụ na mpaaghara ụzọ ebe ahụ adịghị mma."
"Ọ bụkwa na mpaghara ahụ ka okporoụzọ a jọrọ njọ nke ukwuu, mee ka ndị mmadụ na-achọ itinye isi n'otu 'lane'."
"Ngalaba ndị ọzọ n'okporoụzọ ahụ adịchaghịkwa mma," ke o kwuru.
Onye ntaakụkọ kwuru na gọọmentị Anambra steeti gbara mbọ idozi mpaghara okporoụzọ ahụ ihe dịka afọ abụọ gara aga, mana o mebikwaala ọzọ ugbua.
Gịnị ka gọọmentị Anambra Steeti na-eme gbasara ya
Kọmishọna ọrụ n'Anambra Steeti bụ Ifeanyi Okeoma azaghị ekwentị ya oge BBC Igbo kpọrọ ya.
Mana n'ozi ekwentị ọ zaghchiri anyị, o kwuru sị "N'ezie anyị ma maka mpaghara okporoụzọ a, anyị na-agbakwa mbọ imezi ya."




























