Nigeria Independence Day: 'Aga m ahụ na vootu ndị mmadụ kwuru onye ga-emeri na 2023 - Buhari

Ebe foto si, Nigeria Presidency
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwela ụmụ Naijiria nkwa na ntuliaka 2023 agaghị enwe wuru wuru ọbụla na ya.
Buhari kwuru nke a n'ozi ọ gbasara n'ikuku n'ụtụtụ Satode dịka Naijiria na-eme ncheta afọ 62 kemgbe ha ji nwere onwe ha n'aka mba Briten.
Naijiria nwere onwe ya n'aka mba Briten n'abalị mbụ nke ọnwa Oktoba n'afọ 1960.
N'ozi ya, Buhari kwuru na ahụ ụfụ na obi mgbawa ihe ọ gabigara mgbe gara aga dịka ọ zọọ ọkwa onyeisiala mere ya ji nwee mkpebi ịhụ na e nwere usoro ntuliaka ebe ụmụamala ga-enwe ohere ịhọpụta onye bụ ọchịchọ obi na enweghị magomago ọbụla.
Ọ sịrị, "Na enweghị mmanye ọbụla, ekpebiela m ịhafenye ọchịchị onyekwuoucheya tọrọ atọ nke ga-akwudogide."
"Ibinye aka na ntulika nke afọ 2021 na-enye agbamume n' usoro ntuliaka iji hụ na a gaghị enweghị wuru wuru ọbụla."
Buhari kwuru na etu ntuliaka sirila gaa n'afọ abụọ gara aga n’Anambra, Ekiti na Osun steeti gosiri na ndị mmadụ nwee ohere iji vootu kwuo onye ga-achị ha n’ezie ma kwe nkwa ime ka ya bu usoro kawanye mma dịka ntuliaka 2023 na-akpụdebe nso.

Ebe foto si, Nigeria Presidency
Lee ọkpụrụkpụ ihe ise ndị ọzọ o kwuru:
1. Eji m ohere ncheta nnwereonwe Naijiria arịọ ndị otu njikọrọ ndị nkuzi mahadum bụ ASUU na-agba abụbọ ọrụ ka ha laghachi na klaasị ma kwe ha nkwa na a ga-ekpezi okwu na-ese. Ọchịchị a agbaliala ka o nwere ike ibelata nsogbu dịarala ihe karịrị afọ 11.”
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
2. "O nweghị wọọdụ,obodo maọbụ okpuru ọchịchi ọbụla na Naijiria taa eritebeghị erere site n'otu a atụmatụ enyemaka gọọmentị dịka N-Power,TraderMoni,Marketmoni,ego mgbazinye, ego nkwalite azụmahịa na ego enyemaka nye ndị ogbeye a kpọrọ 'conditional cash transfer.'
3. "O nweghị wọọdụ,obodo maọbụ okpuru ọchịchi ọbụla na Naijiria taa eritebeghị erere site n'otu a atụmatụ enyemaka gọọmentị dịka N-Power, TraderMoni, Marketmoni, ego mbazinye, ego nkwado azumahịa na nke enyemaka nye ndị ogbenye a kpọrọ 'conditional cash transfer'."
4. "Oge a họpụtara m, ekwere m ụnụ nkwa ikwalite akụnaụba, buo agha megide nrụrụaka na nsogbu nchekwa, na ịzọpụta ụmụ Naijiria dị nde 100 n'aka ụbịam n'afọ iri. Site n'amara Chineke, anyị agbaliala n'ebe ọdị ukwuu na nke a , mana anyị erubeghị enbe anyị na-aga."
5. "Anyị gbara mbọ ka atụmatụ ibu agha megide nrụrụaka kwudosiwanye ike. Site na ịrịọta nkwa mba ndị ọzọ na-iweghachi ego ndị ezupụrụ ezupu. Enyela ọtụtụ ndị a kpụburu ụlọikpe nakwa ndị ụlọikpe mara ikpe dịka ọtụtụ kwụghachielrela oego ndị ha zupụrụ."




























