Ọ dị mwute na ndị mmadụ ahapụla mmeri anyị n'iko mba ụwa, na-ekwu okwu nsusuọnụ - Ochee Bọọlụ Spain

Ebe foto si, Getty Images
Ochee bọọlụ nke otu bọọlụ ụmụnwaanyị mba Spain, bụ Catalina Coll, agwala BBC na ọ bụ ihe mwute na ụwa niile ahapụla maka mmeri ha meriri n'asọmpi iko mba ụwa afọ 2023 na-ekwusi okwu maka etu Luis Rubiales si susuo Jenni Hermoso ọnụ.
Luis Rubiales bụ onyeisi otu na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na mba Spain. O suru Hermoso ọnụ n'ọnụ ya dịka ụmụnwaanyị Spen na-anata ọlaedo mmeri ha n'asọmpi ahụ.
"Ọ na-ewute m na anyị bụ ndị gbara asọmpi a abụghị okwu a kpụ n'ọnụ ugbua. Ihe kacha ewute m bụ na onye ọbụla hụrụ m n'okporoụzọ ga-ebido ikwu okwu gbasara nsusu ọn, kama ịsị "daalụnụ maka mmeri ụnụ meriri iko mba ụwa," Coll kwuru.
O kwukwara na ya na-akwado Hermoso, bụ onye kwurula na ya enyeghị nkwado tupu Rubiales esusuo ya ọnụ n'ọnụ ya.
Otu Fifa achụpụla Rubiales, dịka o kwuchara na ya agaghị arịtu n'ọkwa onyeisioche otu bọọlụ mba Spen, ma kwukwaa na nsusuọnụ ahụ bụ nkwekọrịta mmadụ abụọ.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọkaiwu mba Spain sị na ha amalitela nnyocha iji mara ma ihe a Rubiales mere ọ bụ ịda iwu.
Nsusuọnụ a ebutela ọtụtụ nrụrịtaụka n'akụkụ ụwa niile gbasara etu e si akpaso ụmụnwaanyị agwa nakwa etu ndị nọ n'okwa dị elu si eji ikike ha emekpa ndị mmadụ ahụ.
Mana ụmụnwaanyị bọọlụ Spain sị na ya bụ ihe emeela ka e chefuo mbọ ha gbara iji turu ugo n'iko mba ụwa.
"Enweela m aṅụrị n'ụlọ m na Mallorca ebe a. Ndị mmadụ nabatara m nke ọma. Obi dị m ụtọ maka ihe anyị mere, mana akụkụ one m ọzọ na-enwe mwute maka etu akụkọ a si efesasị. Achọrọ m ị na-akọ akụkọ maka etu m si buo iko mba ụwa, ọbụghị ụdị akụkọ a," Coll kọwara

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Coll, onye burula iko Uefa maka ndị U-17 na ike Europe nke ndị U-19, ma bụrụkwa ọkaibe na mba ụwa n'afọ naanị 22, kwuru na ya agaghị agbara Spain bọolụ ọzọ ma ọ bụrụ na Rubiales arịtughị n'ọkwa ya.
Ihe ruru mmadụ 81 ndị ọgba bọọlụ Spain ebinyela aka n'akwụkwọ ma kwuo na ha agaghị agbara otu bọọlụ ụmụnwaanyị Spain bọọlụ ọzọ ma ọ bụrụ na Rubiales ka bụ onyeisioche otu nchịkọta bọọlụ mba ahụ.
"Anyị niile bịakọtara ọnụ kpebie na ụdị ihe a merenụ agaghị aga n'ihu. Onye o metụtara bụ onye otu anyị dị anyị n'obi, ya mere anyị ji kpebie na anyị ga-akwụdo ya n'azụ n'agbanyeghi ihe ọbụla merenụ. Nke ahụ bụ mkpebi anyị, otu ahụ ka ọ ga-adị."
"Onye ọbụla chọrọ ịkwado anyị nwere ohere ịkwado anyị, onye achọghị ịkwado anyị nwekwara ohere. Ihe ọbụla merenụ, anyị ma nke bụ eziokwu.
Coll kwuru na ha nwere olileanya na ihe niile ga-abịa n'isi njedebe n'oge adịghị anya.
"Anyị chọrọ ịga n'ihu na-eturu ugo. Anyị bụ ndị ọgba bọọlụ nke bụ ihe anyị hụrụ n'anya, mana anyị chọkwara ka a kwanyere ikike dịịrị anyị ugwu, ka ụdị ihe a ghara ime ọzọ."




























