Asọmpi iko mbaụwa ụmụnwaanyị nke 2023 bụ echefu echefu... Lee ihe ndị kpatara ya

Otu bọọlụ ụmụnwaanyị mba Spen bụ ọkaibe n'asọmpi bọọlụ ụmụnwaanyị nke 2023

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Mba Spain ebuliela iko mbaụwa nke egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị nke afọ 2023.

Nke a mere dịka ha ji otu ọkpụ goolu asataghị ihe merie ụmụnwaanyị England n'ụbọchị Sọnde.

Olga Carmona, bụkwa kaptịn ndị Spen, bụ onye nyetere otu goolu ha ji merie na nkeji iri abụọ na itoolu nke asọmpi ahụ.

Spen nwetakwara penariti na nkeji 69, mana ochee bọlụ mba England bụ Mary Earps chere ya.

Ihe ndị gbapụtara ihe n'asọmpi iko mbaụwa ụmụnwaanyị nke afọ a

Mary Earps

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mary Earps, ochee bọọlụ mba England, nwetara nturugo ochee bọọlụ bụ ọkaibe n'asọmpi a
  • Asọmpi nke afọ a bụ nke ndị mmadụ kacha lee, n'ime ụbọchị isii asọmpi a malitere, Fifa kwuru na ha ereela ihe karịrị tiketi nde 1.5
  • A na-eche na ndị kiriri asọmpi a na TV ruru ihe dịka mmadụ ijeri abụọ (2 billion)
  • Ndị otu bọọlụ Spen ga-enweta ego dị $270,000 n'otu n'otu maka ibuli iko a, ebe ndị nke England ga-enweta $195,000 n'otu n'otu dịka ndị nke abụọ
  • Ndị Super Falcons nke Naịjirịa ga-enweta $60,000 n'otu n'otu maka iru agba mgbapụ (Round of 16) nke asọmpi a
  • Nke a bụ nke mbụ England na Spen na-eru n'agba nke ikpeazụ nke iko mbaụwa bọọlụ ụmụnwaanyị
  • Tupu asọmpi a, ụmụnwaanyị Spen emeribeghị asọmpi ọbụla n'agba mgbapụ nke iko mbaụwa ọbụla
  • Aitana Bonmati nke mba Spen nwetara nturugo ọgba bọọlụ bụ ọkaieb n'asọmpi a
  • Mary Earps, na-echere England bọọlụ, nwetara nturugo ọkaibe n'iche bọọlụ n'asọmpi a
  • Hinata Miyazawa nke mba Japan ritere nturuugo nke onye kacha nye goolu n'asọmpi a dịka o nyere goolu ise
 Sarina Wiegman

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Sarina Wiegman, onye nkuzi bọọlụ ndị England eruola agba nke ikpeazụ nke iko mbaụwa ụmụnwaanyị ugboro abụọ, 2019 na 2023, mana o merighi nke ọbụla n'ime ha
  • Salma Paralluelo nke Spen nwetara nturuugo ọkaibe ọgba bọọlụ afọ ya kacha nta
  • Tupu asọmpi a, ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ Spen chọrọ ka a chụọ onye nkuzi ha bụ Jorge Vild n'ọrụ, mana ka nghọtahie ahụ dajụrụ, Vilda chụpụrụ mmadụ 12 n'ime mmadụ 15 so kpaa nkata ahụ. ndị a ọ chụpụrụ bụ ndị a ma ama n'ịgba bọọlụ n'ụwa niile, nke a mere ka ọtụtụ chee na Spen agaghị eme ọfụma n'asọmpi a
  • Nke a bụ nke ugboro abụọ onye nkuzi bọọlụ ndị England bụ Sarina Wiegman na-eru agba ikpeazụ nke iko mbaụwa ụmụ nwaanyị, dịka ọ kpọrọ ụmụnwaanyị mba Netherlands ruo n'agba nke ikpeazụ asọmpi ahụ n'afọ 2019 ebe mba France meriri ha