Etu ndị ọrụ nchekwa si wakpoo ndị ojiegbe n'Umunze taa

Mgbe e biputara ya

Akụkọ si akụkụ Umunze, Anambra steeti apụta taa bụ ụbọchị abụọ nke ọnwa Nọvemba, 2022 na-ekwu na ndị ọrụ nchekwa wakporo ma gbuo ụfọdụ ndị ojiegbe amabeghị ndị ha bụ ebe ahụ.

N’ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, a hụrụ ebe ozu ihe ruru mmadụ abụọ tọgbọ n’ala, ụfọdụ n'ime ha kecha ihe dịka ọgwụ a gwọrọ agwọ iji echekwa onwe ha n’ukwu.

Ndị uweojii azabeghị ozi anyị zigaara ha n’okwu a mana otu onye bi ebe ahụ kọwara na o zere ndụ ya na mwakpo a dịka ọ nọ ebe ahụ mgbe ndị ọrụ nchekwa pụtara wakpoo ndị ekperima a.

O kwuru “Ana m eme njem mgbe anyị hụrụ ka ndị ọrụ nchekwa nọ na-achụ ụfọdụ ọsọ.”

“Ha kwakọrịtara mgbọ aghara aghara mana ndị ọrụ nchekwa meminara ụfọdụ n’ime ha.”

"Anyị hụrụ ozu mmadụ anọ n'ime ndị ojiegbe ahụ dịka mwakpo a mechara."

Umunze dị na mpaghara Orumba South n'Anambra steeti. Ọ bụkwa obodo ya na Arondizuogu nke dị n'Imo Steeti nwere oke ala.

Nke a abụghị nke mbụ a na-anụ akụkọ mwakpo maọbụ nsogbu ndị ojiegbe na mpaghara Umunze.

Etu ọ dị n'Umunze ka ọ dị n'Uli

Akụkọ na-ekwukwa ndị ntorobịa bucha egbe na ndị ọrụ nchekwa kwara mgbo n'Uli, nke dị n'okpuruọchịchị Ihiala, Anambra steeti n'ụbọchị Tuzde.

Ọtụtụ ndị bi na mpaghara ahụ setara ihe onyonyo ebe otu abụọ a na-akwakọrịta mgbọ ma na-ekwu na egwu ejidela ha niile bi na mpaghara ahụ.

Uli bụ ebe Anambra steeti nwere mahadum ha nke a na-akpọ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University.

Ọtụtụ ụmụakwụkwọ bi n'obodo ahụ, nke mere ụfọdụ ji ekwu na o nwereike ịbụ ụmụakwụkwọ nọ n'otu nzuzo ka ha na ndị ọrụ nchekwa na-akwakọrịta mgbọ.

Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii ekwubeghị ihe ọbụla gbasara nke a.