ASUU Strike: Etu abụbụọrụ ndị nkuzi mahadum si ememina anyị - Ụmụakwụkwọ AE-FUNAI

Aha onyonyo, ASUU Strike: Akwụkwọ anyị bịara imụ enweghizi isi - Ụmụakwụkwọ AE-FUNAI
ASUU Strike: Etu abụbụọrụ ndị nkuzi mahadum si ememina anyị - Ụmụakwụkwọ AE-FUNAI
Mgbe e biputara ya

Kemgbe ọnwa Febụwarị afọ 2022, ndị nkuzi Mahadum gbara abụbụọrụ iji gosi iwe ha maka nkwa gọọmentị kwere ha nke ha emezubeghi rute ugbua.

Rue ugbua bụ ọnwa Juun, ụmụakwụkwọ ka nọ n'ụlọ, nke ọtụtụ ha na-enweghi ihe ha na-eme dịka ASUU na-ekwusi ike ka a kwụọ ha ụgwọ e ji ha.

Ụfọdụ ụmụakwụkwọ onye ntaakụkọ BBC hụrụ na-amụzi otu ọrụ aka maọbụ nke ọzọ iji nyere onwe ha aka ma ghara ịnọ na nkịtị.

Onyeisi otu ụmụakwụkwọ nke Alex Ekwueme Federal University Ndufu Alike Ikwo bụ Jerry Okafor kpọrọ gọọmenti oku enyemaka.

Ọ sị ka ha gbaa mbọ kwụsị ya bụ abụbụọrụ iji mee ka ndị ndọrọndọrọ ghara iji ụmụakwụkwọ bute ọgbaghara na ntuliaka na-abịa abịa.

Kirie ihe o kwuru n'uju;

Mahadum Alex Ekwueme dị n'Ebonyi Steeti