You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onyeisiala Tinubu eduola Kudirat Kekere-Ekun n'iyi ọrụ dịka Ọkaikpe Kachasị na Naịjirịa
Onyeisiala Bola Tinubu nọrọ taa bụ Mọnde 30 Septemba duo Ọkaikpe Kudirat Kekere-Ekun n'iyi ọrụ dịka Ọkaikpe Kachasị na Naịjirịa dịka ụlọomeiwu nabatara nhọpụta ya.
Ọkaikpe Kekere-Ekun bụ nwaanyị nke abụọ na-abụ Ọkaikpe Kachasị na Naịjirịa.
Ndị bịara mmeme e mere n'ogige obi ọchịchị dị n'Abuja gụnyere ọkaịkpe anọ bụburu Ọkaikpe Kachasị na Naịjirịa nakwa nwaanyị mbụ bụ Ọkaikpe Kachasị na Naịjirịa bụ Mariam Aloma Mukhtar.
N'okwu ya, onyeisiala Bola Tinubu kọwara ụlọikpe dịka ngalaba dị oke mkpa n'ọchịchị obodo ma gwa ọkaikpe Kekere-Ekun ka ọ rụọ ọrụ iji kwalite ikpe ziri ezi nke ga ahụ na ọchịchị onyekwuouche ya kwụrụ chim na Naịjirịa.
Ụlọomeiwu anabatala nhọpụta Kudirat Kekere-Ekun dịka Ọkaikpe Kachasị
Ụlọomeiwu Naịjirịa anabatala Kudirat Kekere-Ekun dịka ọkaikpe kachasị na Naịjirịa
Nke a na-eme ka onyeisiala Naịjirịa, Bolla Tinubu dere akwụkwọ degara ụlọomeiwu sịneti kwuo ka a nabata Kudirat Kekere-Ekun dịka onye ọkaikpe kachasị na Naịjirịa.
Cheta n’ọnwa Ọgọst 2024 ka National Judicial Council (NJC) nyere ndụmọdụ ka a họpụta Kudirat Kekere-Ekun dịka onye ọkaipke kachasị.
Ka ndị Sịneti mechara Kudirat Kekere-Ekun nyocha, ma gbaa ya ajuju ọnụ, ha kwetara ka ọ bụrụ onyeisi ọkaikpe kachasị dịka onyeisiala Naịjirịa sị rịọ.
Oge a na-agba Kudirat Kekere-Ekun ajuju ọnụ ka o kwuru na ya ga-eji akụrụngwa nka na ụzụ nwere mee ka a na-ekpe ikpe ngwangwa na-egbughị oge.
Ọ ji ohere ahụ were rịọ ka ngalaba ikpe na ụlọikpe bụrụ nke ga-akwụrụ onwe ya ma kwuo na ndị na-eme mpụ agaghị enwe ebe ha ga-ezo.
Kudirat bụ nwaanyị nke abụọ ga-abanye n'ọkwa dịka ọkaikpe kachasị na Naịjirịa, ebe Aloma Mariam Mukhtar bụ nwaanyị nke mbụ nwetere ọkwa ahụ.
A mụrụ Kudirat Kekere-Ekun n’afọ 1958 na London, United Kingdom.
O bidoro dịka onye ọkaịwu n’afọ 1980 bụ oge ọ pụtara na mahadum mana a nabatara ya n’otu ndị ọkaiwu n’afọ 1981.
E duola Kudirat Kekere-Ekun n'iyi ọrụ dịka ọkaikpe kachasị Naịjirịa
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu eduola ọkaipe Kudirat Kekere-Ekun n'iyi ọrụ dịka ọkaipe ukwu Naịjirịa.
Onyeisiala Tinubu mere nke a n'ụbọchị 23 Ọgọst, 2024 dịka o si mba Fransị bata n'ụzụ ụtụtụ.
Ọkaipe Kekere-Ekun nọchiri ọkaipe Olukayode Ariwoola onye lara ezumike nka n'ụbọchị Tọzde 22 Ọgọst, 2024 ka ọ gbara afọ 70.
Onye bụ ọkaikpe kachasị ọhụrụ Naịjirịa?
A mụrụ Ọkaikpe Kudirat Motonmori Olatokunbo Kekere-Ekun n'abalị 7 onwa Mee, 1958.
Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum University of Lagos ebe ọ nwetara nzere ma bụrụ ọkaiwu n'afọ 1981
Ọkaikpe Kekere-Ekun gara n'ihu nweta nzere LL.M na mahadum London School of Economics and Political Science n'afo 1983.
Ọ bụ otú n'ime ndị ọkaikpe dị elu n'ụlọikpe kachasị na Naịjirịa.
Ọkaikpe Kekere-Ekun bụ ọkaikpe nwaanyị nke abụọ ga-abụ ọkaikpe kachasị na Naịjirịa.
O bidoro ọrụ dịka ọkaiwu na Legọs steeti tupu a họpụta ya dịka Senior Magistrate na Legọs steeti n'onwa Disemba 1989.
A họpụtara Kekere-Ekun dịka ọkaikpe ụlọikpe ukwu Legọs steeti n'onwa Julaị 1996.
Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi otu Robbery and Firearms Tribunal zone II site n'onwa Nọvemba 1996 ruo ọnwa Mee 1999.
Ọ rigoro dịka Ọkaikpe ụlọikpe mkpegharị Naịjirịa n'abalị 22 Septemba, 2004.
N'onwa June 2013, a họpụtara ọkaikpe Kekere-Ekun dịka otu n'ime ndị Ọkaikpe ụlọikpe kachasị na Naịjirịa.
Lee ndị bụ bụrụ ọkaikpe kachasị na Naịjirịa.
Ọkaikpe Stafford Foster Sutton - 1955-1958
Ọkaikpe Adetokunbo Ademola - 1958-1972
Ọkaikpe Taslim Olawale Elias - 1972–1975
Ọkaikpe Darnley Arthur Alexander- 1975–1979
Ọkaikpe Atanda Fatai-Williams - 1979- 1983
Ọkaikpe George Sodeinde Sowemimo - 1983–1985
Ọkaikpe Ayo Gabriel lrikefe - 1985–1987
Ọkaikpe Muhammed Bello - 1987–1995
Ọkaikpe Muhammadu Lawal Uwais- 1995–2006
Ọkaikpe Salisu Modibo Alfa Belgore - 2006–2007
Ọkaikpe Idris Legbo Kutigi - 2007–2009
Ọkaikpe Aloysius Iyorgyer Katsina-Alu - 2009–2011
Ọkaikpe Dahiru Musdapher - 2011–2012
Ọkaikpe Aloma Mariam Mukhtar - 2012–2014
Ọkaikpe Mahmud Mohammed - 2014–2016
Ọkaikpe W. S. Nkanu Onnoghen - 2016- 2019
Ebe o si: Ụlọọrụ National Judicial Council