Ime ejije omenala pụrụiche mere m ọpụrụiche n'ọrụ - James Kalu Omokwe

Aha onyonyo, Nwafọ Igbo o a, bụ James Kalu Omokwe, bụ onye na-eme ejiji a ma ama na Nollywood.
    • Onye dere ya, Chioma Nkemdilim Daramola & Amaka Bassey
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Onye nhazị ejije Nollywood, bụ James Omokwe, gwara BBC Igbo na mkparịtaụka ha nwere na nso nso etu o siri banye ọrụ imepụta ejije nke omenala pụrụiche bụ ihe na-akwara ya ụzọ na mbaụwa niile.

James Kalu Omokwe

Ọ kọwara na ọ gụrụ ọrụ ime ejije na mahadum Legọs (University of Lagos), ma kọwa na mgbe ọ gụchara, ọ malitere ịrụ ọrụ dịka onye nkuzi ejije na otu ụlọọrụ nọ na Legọs steeti.

Ọ kwuru na nne ya kwadoro ya nke ukwuu n’ọrụ a ebe nna ya enwechaghi ntụkwasị obi na ya n’ihe na ọ cheere na ya bụ ọrụ anaghị enye mmadụ ego.

Omokwe kwuru “Ọrụ ime ejije na-enye oke ego.”

Ọ gara n’ihu kọwaa etu o siri nweta ohere imepụta ejije nke omenala nke mbụ ya, ma tinye uchu na ya.

Iji kwalite ọrụ ya nke ọma n’ime ejije, ọ gara n’ihu gụọ akwụkwọ na ngalaba ime ejije na mba Amerịka.

Ọha agbaaka ama n’ụzọ dị iche iche na ọ na-emeta ya bụ ejije omenala nke mere e jizi na-akpọ ya oku ka ọ na-emepụta ejije ndị a aghara aghara nke gụnyere ejije ndị a kpọrọ Ajoche, Riona, Diiche nakwa ndị ọzọ.

Omokwe kwukwara na echiche ọhụrụ ndị ọ na-echepụta na mmepụta ụdịrị ejije omenala emeela ka ọ bụrụ onye ọpụrụiche n’etiti ndị ọzọ na-eme ejije na Nollywood.

Gere ihe ndị ọ gwara BBC Igbo n’uju n’ihe onyonyo nọ n’elu akụkọ a.