E nwere uwe ụkọchukwu e dere Katọlik n'ahụ ya? - Ugo Ugokwe

Aha onyonyo, Prince Ugo Ugokwe: 'E nwere uwe ụkọchukwu e dere Katọlik n'ahụ ya?'
Mgbe e biputara ya

Prince Ugo Ugokwe bụ otu n'ime ndị 'unknown bishops' bịara emume ngosiputa nke pati All Progressives Congress (APC) mere n'ụbọchị 20 nke Julaị 2022, agwala BBC Igbo ihe mere o ji jikere sonye ndị bịara emume ahụ.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Ugokwe kwuru maka uwe ya na mmadụ 29 ndị ọzọ a kpọrọ emume ahụ yi bịa.

Ugokwe kọwara na enweghi iwu ha dara site n'iyi uwe ahụ, ma kwuo na ọ bụ uwe nke ya dịka ụkọchukwu na ọ bụghị mmadụ chinyere ya.

Ndị ụkọchukwu APC kpọtara

Ebe foto si, Ugo Ugokwe

Ugokwe gara n'ihu jụọ sị "e nwere uwe e dere Katọlik n'ahụ ya? Ọ bụ uwe ndị amụma. M chọọ ịrụ ọrụ mmụọ ọ bụ akwa m ji arụ ọrụ mmụọ... ọ bụghị mmadụ chinyere m ya, ọ bụ m ji ego m goo ya.

"Ana m agakarị emume ọha ndị m na-ekwu okwu na ya dịka onye ụkọchukwu, ihe a bụ uwe ndị ụkọchukwu."

Ugokwe kwuru na o sokwa n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị dịka ọ nọbu na pati People's Democratic Party (PDP) ma rụtukwa ọrụ na pati All Progressives Grand Alliance (APGA) tupu ọ banye APC.

Ndị ụkọchukwu APC kpọtara

Ebe foto si, Ugo Ugokwe

O kwuru sị "Amaghị m ma ọ bụ ihe ọjọọ umu Chukwu ịba otu ndọrọndọrọ ọchịchị. Mụnwa bụ onye amụma nọ n'akụkụ na-ekwu okwu banyere Naịjiria."

Gee ihe ndị o kwuru n'uju:

Etu uwe ndị 'unknown Bishop' gara mmemme APC si rapụta ha - Bishop Ogu

Bishop Bright Ogu na ndị Bishop gara mmemme APC

Otu ihe ka na-ewu na soshal midia kamgbe foto ndị ụkọchukwu gara emume ngosi All Progressives Party (APC) mere na July 20, 2022 bụ uwe ndị ụkọchukwu ahụ yi.

Bishop Bright Ogu nke Diayosis Anglican dị na Mbaise ekwuola na etu pati All Progressives Congress (APC) si kwete ka ndị Bishop a na-amaghị ndị ha bụ biara ha mmeme ngosi bụ ezigbote ihe ihere.

O kwuru na nke a gosiri na APC ji aghụghọ achọ ịrafu ụmụ Naịjirịa.

Bishop Ogu gara n'ihu kwuo na uwe ndị ahụ kpọrọ onwe ha Bishop yi gaa mmemme APC gosiri na egobiri ha egobi.

Ihe uwe ndị "Unknown Bishop" yi gaa emume APC pụtara

Bishop Ogu kwuru na etu uwe ndị Bishop ahụ gara mmemme APC n'ụbọchị Julai 20, 2022 si acha gosiri na ha abụghi Bishop ndị ezigbo makana ọ bụrụ na ha bụ nke ezigbo ya , ha ga-ama agwa akwa ndị ụkọchukwu na-eyi na ihe nke pụtara.

O kwuru na ihe dịka uwe 'purple'ndị Bishop adigboroja ahụ yi bụ nke ndị ezigbo Bishop ji aga akwamozu karịa ma iyi ya ga n'ọha.

O kwuru na uwe uhie uhie ha yi bụ nke ndị Bishop na-eyi oge Lent(oge i bu ọnụ n'okpukperechi Kraist). E jikwa ya eme emume oriri nsọ. "Ọ bụghị nke e ji aga mmemme." bụ ihe Bishop Ogu kwuru.

O kwuru na uwe oji (black) ha yi bụ nke ha na-eyi oge a na-eri uju.

Bishop Ogu kwuru na uwe ndụ ndụ (green)ha yi bụ nke a na-eyi n'oge Trinity, oge ndụ ọhụrụ apụtala.

O kwuru na nke ọcha ha yi bụ nke a na-eyi aga mmemme pụrụiche karịa emume ndọrọndọrọ ọchịchị.

Na nke nke, Bishop Ogu kwuru uwe niile ndị ezigbo Bishop na-eyi abụghị nke onye ọbụla nwerike iyi etu sọrọ ya.

Ndị ụkochukwu biara emume APC abụghị adigboroja - Tinubu Campaign Organisation

Tinubu ebe ọ nọ n'ọgbakọ ndị otu ya bụ APC na ntuliaka nke afọ 2015

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Tinubu ebe ọ nọ na ọgbakọ ndị otu ya bụ APC na ntuliaka nke afọ 2015
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Bola Ahmed Tinubu ji ọkọlọtọ All Progressives Congress akatọla ndị mmadụ na-ekwu na otu achụm nta vootu ya gaa kpọta ndị ekperima ka ha jikere ka ndị ụkọchukwu bia mgosipụta osote ya bụ Kashim Shettima n’ụbọchị July 20, 2022.

Pati APC gosipụtara Sinatọ Shettima bụbụ gọvanọ Borno steeti dịka osote onye otu ha na-azọ ọkwa onyeisiala na ntụliaka Naịjirịa na-abịanụ.

Ka emechara ya bụ emume na Shehu Yar’adua centre dị n’ Abuja, ihe ndị mmadụ na-ebo APC bụ na ha gobiri ndị agbero ka ha yiri uwe ndị ụkọchukwu bia ya bụ mmemme.

Mana Tinubu site n’ọnụ onye nnọchiteanya ya n’ihe gbasara achụm nta vootu bụ Bayo Onanuga ekwuola na foto na onyonyo ndị ahu na-efegharịnụ bụ ihe ndị iro ya ji emegharị anya ndị mmadụ.

“Anyị chọrọ ikwu na ndị ụkọchukwu ahụ abụghị adigboroja, ndị na-arụ ụgbọala maọbụ ndị na-ere ji dịka ndị na-ebugharị okwu akpọmasị si eme ka ndị Naịjirịa kwenye. Ha abụghị ndị ọnụ na-eru n’okwu n’okpukperechi Kraist mana na-agbagote n’ozi ha, dịka akwụkwọ ozi o depụtara si kwu.

Ihe APC sara maka ndị ụkọchukwu pụtara kwado Tinubu

Ndị ọchịchị APC na ndị Ụka Kraịsti

Ebe foto si, APC/Facebook

Nkọwa foto, APC kwuru na 'Muslim-Muslim Ticket' emegịdeghị iwu Naịjirịa kama ndị ma ọrụ bụ ihe ka mkpa.

Otu pati All Progressives Congress (APC) asaala ebubo dapụtara n’okwu ndị ụkọchukwu ụka Kraịsti pụtara kwado Bola Ahmed Tinubu na onye osote ya bụ Kashim Shettima n’emume pati a mere n’Abuja n’ụbọchị Wenezde.

Ọnụ na-ekwuru pati a bụ Philip Muoka gwara BBC Igbo n’ụbọchị Tọọzde na n’ezie ha amaghị maka ndị ụkọchukwu ahụ. Nke a bụ asịsa okwu ma ndị ụkọchukwu ahụ a bụ ndị ezie ka ha abụ ndị adịgboroja.

O kwuru: ‘Emume anyị mere bụ emume ọha, ọ bụghị nke okpukperechị, anyị amaghị ndị ụkọchukwu ahụ bụ, anyị akpọghị ndị ọbụla oku’.

Muoka kọwara na ndị otu nkwado ọbụla nwere ikike bịa ya bụ emume n’ihi na ọ bụ nke emepeere ndị ọha niile.

Ọ gara n’ihu kwuo: “Ndị okpukperechi niile nwere ikike dịịrị ha ikwado onye ọbụla ha chọrọ, ndị ụkọchukwu a pụtara gosiri ikike dịịrị ha”.

Maka okwu nhọpụta ndị Alakụba abụọ ga-azọrọ APC ọkwa onyeisiala na osote ya na-akpalite ọtụtụ okwu, Muoka kwuru na okpukperechi abụghị ihe kacha dị mkpa n’ọchịchị.

O kwuru: ‘Gini mere ndị mmadụ anaghị akatọọ PDP bụ ndị megidere iwu pati ha nke kwuru ka a na-enye ndị si mpghara dị ịche ịche ohere ọchịchị’.

O kọwara na PDP họpụtara onye si mpaghara ugwu ebe iwu ha rụrụ aka na ọ kwesịrị idanyere ndị ndịda.

Muoka kwukwara na ndị na-anaghị akatọọ PDP ma na-akatọ APC maka ‘Muslim Muslim Ticket’ bụ ndị iru abụọ.

Otu n’ime ndị ụkọchukwu a na-ewu ugbua ebe niile gwara BBC Igbo okwu maka ihe mere o jiri sonye n’ememe ahụ.

‘Ihe mere m ji sonye ndị Bịshọp kwadoro Tinubu’ – Onye amụma Ugo Ugokwe

Ugokwe Ugo

Ebe foto si, Ugokwe Ugo/Facebook

Ugo Ugokwe Prince bụ otu n’ime ndị ụlọchukwu ụka Kraịsti so pụta kwado otu Pati All Progressives Congress (APC) n'emume eji kọsipụta Kashim Shetimma dịka osote Bola Tinubu akọrọla BBC Igbo ihe mere o ji sonye n’emume.

Kemgbe APC kwupụtara na onye ga-azọrọ ha  okwa onyeisiala nakwa osote ga-abụ ndị ụka alakụba, ụzụ akụkọ nakwa nkatọ na-agba n’okwu a n’ihi ụfọdụ ndị ụka Kraịsti kwuru na mkpebi a APC mere ezighi ezi.

Ndị yi uwe ndị ụkọchukwu

Ebe foto si, APC United Kingdom

Na mkparịtaụka Ugokwe na BBC Igbo nwere n’ụbọchị Tọọzde, Ugo sara asịsa ndị na-ekwu na ọ bụghị ndị ahụ pụtara ya bụ emume abụghị ndị ụkọchukwu n'ezie.

O kwuru kpọm kwem na ya na onwe ya bụ onye ụkọchukwu nke malitere ọrụ mgbasaozi ụka Kraịsti kemgbe afọ ole m ole.

Ọ kọwara na ihe kacha bụrụ ụkpụrụ ozi ya bụ udo na ịdịnaotu.

Ọ kwuru: “E kwenyere m n’udo na ịdịnaotu Naịjirịa, ahụghị m ihe ọjọọ dị na ịpụta kwado onye ga-achị Naịjirịa, ihe bụ ikike dịrị m dịka mmadụ”

Ọ gara n’ihu kwuo na otelarị o ji arụ ọrụ ịjịkọ nakwa ikpe udo n’etiti ndị ụka Kraịsti nakwa ndị ụka Alakụba.

Ugokwe kwuru “E nwere m ụlọọrụ na-ahụ maka njịkọ ndị okpukperechi abụọ a maka na aghọtara m na ọtụtụ ngọteghe na-adapụta n’etiti ndị okpukperechi abụọ nke mere m ji na-agba mbọ ihazi ma kpezie nghọteghe a”.

Ugoekwe kwukwara na ọ bụ onye otu pati APC nke zọrọla ọkwa dịka osote onyeisi ndị ntorobịa APC n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjriịa.

Ugokwe Ugo

Ebe foto si, Ugo Ugokwe/Facebook

Ọ kọwara na n’ezie na ha nyere ndị isi ndụmọdụ ka ha ghara iso ụzọ nhọpụta ndị ụka Alakụba abụọ dịka onyeisiala nakwa osote ya mana ebe ha merela ya na nkwado ya dịka onye obi udo ga-agara APC.

N’okwu ya ọ sị “Chineke nwereike iji onye ụka Alakụba maọbụ onye ụka Kraịsti gbapụta Naịjirịa, okpukperechi mmadụ abụghị ihe na-ekwu ma onye ahụ ama ọrụ maọbụ ọ maghị ọrụ”.

Ugo Ugokwe na nwunye ya Nneka

Ebe foto si, Ugo Ugokwe/Facebook

Nkọwa foto, Ugo Ugokwe na nwunye ya Nneka

Onye ka Ugo Ugokwe Prince bụ?

  • Ugo Ugokwe Prince bụ onyeisi ụka Yoke Breakers Church dị n’Abuja
  • Ọ bụkwa onye amụmụ ụka Karịsti na-agbasa ozi ya bụ okpukperechi
  • Ọ bụ onye Nnewi, Anambra steeti
  • Ọ lụọla nwunye nke aha ya bụ Nneka Nnadi Ugokwe
  • Ya na nwunye ya amụọla ụmụ ruru abụọ
  • Ọ bi n’Abuja
  • Ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị n'okpuru pati APC
  • Ọ nwere mmasị na-ọrụ nkwado ndị ntorobịa
  • Ọ bụ onyeisi ụlọọrụ na-alụ ọgụ njịkọ nakwa ikpe udo n’etiti ndụ ụka Kraịsti na Alakụba akpọrọ “Much Love foundation”.

Gini ka otu jịkọrọ ndị ụka Kraịsti na-ekwu?

Ndị yi uwe ndị ụkọchukwu

Ebe foto si, APC United Kingdom

Ọnụ na-ekwuchitere onyeisi otu Christian Association of Nigeria bụ CAN n'ịchafụ bụ Bayo Oladeji kwuru na ndị a na-ewu na soshal Midia sị na ha bụ ndị 'College of Bishops' abụghị ndị otu CAN.

Nke a bụ dịka enwere ihe onyonyo na-efegharị na Soshal Midịa nke gosiri ndị yi uwe ndị okpukperechi Kraịst na-ekwu na ha na-akwado Bola Tinubu bụ onye ji okọlọtọ pati APC azọ ọkwa onyeisiala Naijirịa.

Ọ bụ n'emume eji kọsipụta Kashim Shettima dịka onye osote Bola Tinubu na ịzọ ọkwa onyeisiala Naijirịa.

Oladeji kwuru sị," Anyị amaghị ndị ha bụ, otu CAN ekwuola naha akwadoghị onye alkụba ịnwe onye alakụba ọzọ dịka osote ya n'ọzụzọ onyeisiala Naijirịa".

Ọ gara n'ihu sị," Ọ kwa ha sị na enweghị ihe gbasara ọkpukperechi na ndọrọndọrọ ọchịchị, gịnị mere ha jiri kpọta ndị a?".

Ndị yi uwe ndị ụkọchukwu

Ebe foto si, APC United Kingdom

Okwu bidoro dịka APC họpụtara ndị alakụba abụọ ịnọchite ha na ndọrọndọrọ ọchịchị onyeisiala Naijirịa.

Okwu bidoro dịka ndị otu APC họpụtara ndị alakụba dịka ndị ga-anọchịte anya ha na ndọrọndọrọ ọchịchị.

Cheta na otu APC họpụtara  onye alakụba bụ Bola Tinubu dịka onye ji ọkolọtọ pati ha azọ ọkwa onyeisiala Najirịa ma họpụtakwa onye alakụba bụ Kashim Shetimma dịka osote ya.

Nke a mere ka ndị CAN  pụta kwuo na ha akwadoghi onye alakụba na onye alakụịba osote ịzọ ọkwa onyeisiala Naijirịa.

N’aka nke ọzọ, onyeisi otu pati APC bụ Abdullahi Adamu kwuru na nhọpụtandị alakụba abụọ ịnọchite otu pati ha na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ aka ọrụ ma bụrụkwa uche Chukwu.