APC dara iwu ala maka 'moslem/moslem ticket' - Kenneth Okonkwo

Ebe foto si, Kenneth Okonkwo/facebook
Onye eji ihe ejije mara, bụrụkwa ọkaiwu na Naịjrịa bụ Kenneth Okonkwu ekwuola na ndị Otu Pati All People's congress dara iwu Naịjirịa site na ịwepụta ndị Alakụba abụọ ka ndị ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala na Osote ya.
Onye ha wepụtara ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala bụ Ahmed Bola Tinubu ebe Osote ya bụ Kashim Shemitta, bụkwa onye ụka Alakụba.
Chete na Okonkwo gbara esokwaghịm maka ya bụ ihe ọ hụrụ ka amaghị eme ndị APC mere.
Na mkparịtaụka ya na ndị Arise News nwere ụnyaahụ, Okonkwo sị na APC dara iwu dị n'akwụkwọ iwu nke agba iri na ise amaokwu nke mbụ (Section 15, sub section 1) bụ nke kpatụ aka na okwu ntọọla Naịjirịa, bụ ịdị n'otu, udo na ọganihu.
Ọ sịkwa na agba nke abụọ (Section 2) sị na e kweisiri ịwepụ ihe akpamoke n'ụdị ọbụla.
O buru ya banye n'amaokwu nke atọ, mgbakwụnye D (sub section 3D), ọ sị na ọrụ obodo ga-abụ ihe ọbụla ga-akwado ịdị n'otu site na-ịwe otu ọbụla nyere ohere biri ka m biri n'agbụrụ niile dị na Naịjiria.
Ọ sị na ya bụ akwụkwọ iwu hụtara mmekọrịta Onyeisiala na osote ya ka otu e hiwere ehiwe dịka o kwuru n'agba otu narị, iri anọ na abụọ (section 142).
Ọ chịtara ka ya sị taara ndị APC ahụhụ ma ghara ịgba ha ụgwọ ya, mana ugbua na ya ahụla ihe ka obi ree ọba ya.
Ihe iwu APC kwuru banyere onye biri onye biri
Okonkwo cheteere ndị na-ege ya ntị na iwu APC kwukwara na ha ga-ahụ na ha mere ka ido chie na ndọrọndọrọ, nkwanye ugwu na nghọta, ịme ka ndị mmadụ bie n'udo, ma kwadokwa ọnọdụ onye biri ibe ya biri.
O kwuru hoohaa na ọ nwebeghị otu ndọrọdọrọ ọchịchọ ọbụla ya banyelara mana na ugbua na ya dịzị "obicentric", agbanyeghị na ya abanyebeghị pati ọbụla.
A juru ya maka ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara otu Labour Party si ewu n'ọba nzikọrịta ozi intaneti ugbua.
Kenneth bụ onye a na-eti Andy bụ aha ọ zara n'ihe onyonyo 'Living in Bondage' ọ mere mgbe gbo sị na ọ bụ na ọba nzikọrịta ozi ka APC malitere mgbasa ozi ha tupu ha e weghara ọchịhị n'afọ 2015.
Ihe mere ndị ọrụ ejije jị akwado Asiwaju Bola Tinubu
A jụrụ ya ihe mere na ndị otu ya na-eme ihe ijije ji akwado Asiwaju Ahmed Bola Tinubu.
Ọ zara na ọ bụ ego ka ndị ahụ na-achụ mana ya na-akwado Labour Party maka ọdịmma ụmụ ya na ụmụụmụ ya.
Ọ zakwara ajụjụ maka ihe mere ndị Igbo jiri kwusie ike na PDP mgbe ibe ha si ebe ahụ apụta.
Okonkwu sị, " otu PDP bụ ezigbo ohi na mgbam dịara ndị Igbo. A gwara ndị be anyị na ya bụ Pati ga-emechaa kpụọ anyị isi erueru, ha mechakwara mezuo ya bụ okwu m".
"Ndị igbo sochiri PDP ike kemgbe 2019 ma ha ewepụtara onye ụka Alakụba, maọbụ onye mpaghara ebe ọbụla na Naịjirịa, O ruzie mgbe ha ga-egosi nkwado ndị Igbo, ha agbakụta ha azụ, obuladị n'ọkwa osote onyeisiala".
O kwusiri ike na ndị igbo kwesiri ịjụ ajụjụ ihe ga-erute ha tupu ha enye otu ọbụla ngwado.




























