Ihe anyị ji nwụchie ọkpụisi a sị a hụrụ ngwa arụsị n'ụlọ ya n'Abia Steeti - Ndị uweojii

Ebe foto si, screengrab
Ndị uweojii Abia steeti agbaala ama n'ihe ha ji nwụchie otu ọkpụisi n'Umuahia isiobodo Abia steeti na nso nso a, bụ maka iyi onye agbataobi ya egwu.
Akụkọ na-ewu na soshal midia boro ebubo na ndị uweojii nwụchiri otu ọkpụisi a ma dịka "Elijah" dịka a hụrụ ntutuisi ndị ọ kpụrụ isi n'ite ọgwụ n'ọdọahịa ya.
Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia steeti bụ Maureen Chinaka gwara BBC Igbo n'ekwentị n'ụbochị Fraide 31 Julaị, 2026, na ha nwụchiri Elijah maka ebubo "iyija onye agbataobi ya", na ọ bụghị maka iji ntutuisi ndị ọ kpụrụ isi agwọ ọgwụ.
N'okwu ya, "Anyị nwetara mkpesa megide ọkpụisi a bụ onye a na-enyo enyo maka mkpesa iyi mmadụ egwu imemila ya."
Gịni ka a hụrụ n'ụlọ ọkpụisi a e ji eji?
N'okwu ihe ndị uweojii hụrụ n'ụlọ ọkpoụisi ahụ, Chinaka kọwara sị, "Dịka a nwụchichara ya ma nweta ndetu ọnụ okwu ya, n'ịga n'ihu mee nnyocha, ndị uweojii gara n'ụlọ ya maka nnyocha, nwetara akụrụngwa omenala dị iche iche.."
"Oge a jụrụ ya, o kwuru na ihe ndị ahụ a hụrụ n'ụlọ ya bụ ihe ndị ọ na-ekpere ma kọwaa na ihe a kpụrụ akpụ dịka mmadụ dị n'ụlọ ya, bụ ndị nna ya ochie," ka Chinaka kwuru.
Ihe ndị uweojii hụrụ n'ụlọ ya bụ osisi a pịrị apị dịka mmadụ na ọgba (calabash) nke abụba ọkụkọ dị n'ime ya.
"O kwuru na ọgba (calabash) ahụ, bụ ihe o ji egbu anụ dịka ọkụkọ o ji enye ndị nna ya ochie nri."
Chinaka kwuru na ndị uweojii ahụghị maọbụ napụta ya ntutuisi ọbụla n'aka ya."
Ọ gara n'ihu kwuo na nwoke ahụ ka nọ n'aka ndị uweojii dịka nnyocha na-aga n'ihu.

























