You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ekweremadu nwereike ịnọ na mkpọrọ gbaa ekeresimesi afọ a n'ihi...
Ike Ekweremadu, bụbu osote Onyeisi ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa, nwereike ịnọ na mkpọrọ na mba Briten gbaa ekeresimesi nke afọ 2022.
Cheta na e ji Ekweremadu eji n'ụlọmkpọrọ maka ebubo iji mmadụ atụ mgbere nakwa atụmatụ iji akjụkụ ahụ mmadụ agba mgbere.
Ekweremadu, nwunye ya bụ Beatrice, nwa ha nwaanyị bụ Sonia na otu dọkịta aha ya bụ Obinna Obeta bụ ndị a nwụchiri n'ihi ebubo a, mana Ekweremadu na Obeta bụ ndị nọ na mkpọrọ ebe ụlọikpe tọhapụrụ nwunye ya na nwa ha ka ha si n'ụlọ na-abịa ikpe ha.
Etinyeburu ikpe ahụ ka ọ dị n'ọnwa Mee afọ 2022, mana ọkaikpe Mark Lucraft bughachitere ya azụ ka ọ dịzie n'ụbọchị 31 nke ọnwa Jenụwarị.
Mana ụlọikpe tinyere ụbọchị 16 nke ọnwa Disemba dịka mgbe a ga-ekpebi ma a ga-atọhapụ Ekweremadu.
Ọ bụrụ na ikpe nke ụbọchị ahụ gaziere Ekweremadu, ọ ga-ahapụ ụlọmkpọrọ ma sizie n'ụlọ na-abịa ikpe, ma ọbụghị ya, mara na ọ ga-anọgide na mkpọrọ ruo Jenụwarị 2023.
Etu e si nwuchie Ekweremadu
Ndị uweojii mba Briten jidere Ekweremadu na nwunye ya n'ọdọụgbọelu Heathrow, oge ha si mba Tọkị lọbata n'ọwa June afọ a.
Ebubo e boro ha bụ na ha ji ụzọ aghụghọ kpọbata otu nwata nwoke dị afọ 21 na mba UK iji were akịrị ya.
Ọ bụ oge a kpọgara nwata nwoke ahụ n'ụlọọgwu ebe a ga-anọ waa ya ahụ wepụta akịrị ya ka ọ nọrọ kwuo na ya agaghị eme ihe a gwara ya mee.
Nwa amadị ahụ mechara gaa n'ụlọọrụ ndị uweojii ga mee mkpesa, nke mere ndị uweojii ji nwuchie Ekweremadu na nwunye ya.
Iji chekwaa nwata nwoke ahụ a sị na Ekweremadu chọrọ iwere akịrị ya, ụlọikpe nyere iwu ka a ghara ịkpọpụta aha ya.
Cheta na Ike Ekweremadu pụtaburu ịzọ ọkwa Gọvanọ n'Enugwu steeti n'afọ 2023, n'otu 'Peoples Democratic Party' (PDP) tupu o mechaa laghachi azụ.
Ekweremadu anọọla n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa kamgbe afọ 2003.